Ụmụnne abụọ ndị Naịjirịa e jidere maka iji foto ndị gbaọtọ anapụ ha ego n'ịntaneti

Ebe foto si, Nigeria Police
- Onye dere ya, Joe Tidy
- Ndị mere akụkọ a, Cyber correspondent, BBC World Service
Nwannyị nwa ya nwoke gburu onwe ya ka elekere isii gara ndị na-achọ foto ndị gbaọtọ, ebidola ịgba ama banyere ndị na-achọ foto ndị gbaọtọ.
Jordan DeMay nwụrụ n’afọ 2022 mgbe ụmụnne abụọ bụ Samuel na Samson Ogoshi nwere ọnọdụ nwaanyị mara mma nke ọgbọ ya iji mee ya ka o zitere ha foto ya ebe ọgbaọtọ.
Ugbu a, nne ya bụ Jenn Buta, na-eji akaụntụ TikTok Jordan hibere ya iji dọọ ndị na-eto eto aka na ntị banyere ndị omekome dị otú ahụ, ndị juru na Nigeria – ihe vidiyo o mere enwetela otutu "mmasị" ndị mmadụ.
Ndị uweojii Naịjirịa gwara BBC na ya bụ ihe bụ ihe dị mwute nke ha na-elebaye anya.
Ụmụnne abụọ ahụ dị afọ 20 na 22, soro nwaamadị ahụ dị afọ 17 kpa nkata na soshal midia ya na Instagram, wee zigara ya foto na-egosi ahụ iji mee ka o gosi ha foto ọtọ ya.
Mgbe nke a mere, ha jiri foto ya ahụ bido yibe ya egwu ma nara ya ego.
Ụmụnwanne ahụ kwuru na “Mgbe Jordan gwara anyị na ya enweghị ike ịkwụ ụgwọ ọzọ, o kwuru na ya ga-egbu onwe ya, anyị gwara ya ka o mee ya ngwa ngwa ma ọ bụ anyị egbu ya”

E zigala ụmụnne abụọ ahụ mab Amerika ebe ha na-eche ikpe.
Jenn gwara BBC na ụlọ ya na Michigan, nke dị na mgbago ugwu Amerịka, "Ọ bụ ihe na-erughị awa isii mgbe Jordan malitere ịkparịta ụka ruo oge o gburu onwe ya."
“Ọ dị m ka ihe nkiri n’ịntanetị.
"Ndị a na-aga n’ihu akpa agwa a ma na-etinye nrụgide ahụ.
"Ha na-emekwa ya ngwa ngwa ka ha nwe ike ịgakwuru onye ọzọ."

Ndị na-eme ihe ngosi ahụ bụ ụmụnwoke ka a na-achokari.
N’ọnwa Eprel, awuchiri ụmụnwoke abụọ si Naịjirịa ka otu nwa akwụkwọ n’Australia gburu onwe ya ka ha chụrụ ya.
E nwela ọtụtụ agwa dị otua na Japan na Naịjirịa.
Nyocha e mere n’Amerịka gosiri na e nwere ihe dịka puku 26,700 ebe ihe ruru ụmụwnoke 27 e gbuola onwe ha n’ime afọ abụọ gara aga.
N’izuka a, ndị ọrụ National Cyber Crime Centre Naịjirịa na ndịọrụ National Crime Agency (NCA) nke mba Briten nwere nzukọ iji buo agha megide ndị na-eme ihe ịgosi ahụ.
Ụlọọrụ NCA dọrọ aka na nti nye ụmụ akwụkwọ maka ndị n’akpa agwa ahụ.
Ha kwuru na ndị na-eme igosi ahụ na-esi mba ofesi abịa dịka West Afrịka nakwa Saụt Asia.

Ndị na enyocha mpụ ịntanetị kwuru na ọ bụ ndị na-eme wayo ịntaneti na Naịjirịa na-emekarị ihe ahụ.
Na mbido afọ a, nyocha ụlọọrụ cyber Amerịka bụ ‘Network Contagion Research Institute’ gosipụtara etu TikTok, YouTube na akaụntụ soshal midia ndị ọzọ si na-ekerịta ndụmọdụ maka otu esi emetọ ndị ntorobịa.
Onyeisi ụlọọrụ ‘Cyber Crime Centre’ Uche Ifeanyi Henry gwara BBC na ndịọrụ ya na-megide ndị omekome ahụ ya n’ọrụ ha.
O kwuru na "Ndị kwenyere na Naịjirịa anaghị eme nke ọma bụ ihe ọchị.”
Gọọmentị Naịjirịa etinyele ọtụtụ ego n’ụlọ ha na-arụ megide mpụ cyber ọkachasị sextortion.
'Mba agbataobi'
Henry kwuru na, "Anyị na-enye ndị omempụ ihe egwu.
"Ọtụtụ ndị a ka gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ebe ejidere ọtụtụ n’ime ha.
"Ọtụtụ n'ime ndị omempụ a na-akwaga mba ndị agbata obi ugbu a n'ihi ya."
Ihe a ka na-arị elu, ebe ọ bụ ndị ntorobịa Naịjirịa ka ha na-achọ.
Ndị omempụ a abụghị naanị nsogbu diri Naịjirịa. E kwesiri ịnwe nkwado site na mba ụwa niile.
'Arụmọrụ kachasị'
Ka o sina dị, Dọkịta Tombari Sibe, sitere n’ụlọọrụ Digital Footprints Naịjirịa, kwuru na aghụghọ n'ịntanetị dị ka sextortion abụrụla nnukwu ihe ebe ndị na-eto eto nwere nkà na ụzụ.
O kwuru, sị: "Ihe ndị na-akpata ya bụ mmekọrịta ọhanaeze na akụnaụba.
“E nwekwara nnukwu nsogbu nke enweghị ọrụ na ịda ogbenye.
"Ndị a niile na-eto eto bụ ndị na-enweghị ọtụtụ ihe - ọ bụrụla ihe ukwuu ebe ha nọ, ebe ụfọdụ anaghị eche banyere ihe ga-esi na ya pụta."
'Na-aga n'ihu'
Ka ọ dị ugbu a, Jenn na papa Jordan na-aga n'ihu na-eme mgbasaozi.
O kwuru na akpọtụrụla ya ma nyere ndị nne na nna ndị ọzọ aka, n'Amerịka, Australia na mba UK, bụ ndị ụmụ ha furu efu n'ihi mpụ ahụ.
Jenn kwuru, "Ana m enweta ozi mgbe niile, site na ndị nne na nna na-agba mbọ na-arịọ ihe ha ga-eme n'ihi na ọ mere nwa ha."
“Mgbe ụfọdụ, ha na-achọ ịgwa m ihe mere nwa ha.
"Mgbe ụfọdụ, ha na-ekele m maka na ha chetara akụkọ Jordan wee bịakwute m maka enyemaka."
Ndụmọdụ Jenn na ọtụtụ ụlọọrụ na-amanye iwu na-enye ndị mmadụ banyere ndị ji foto ebe ndị mmadụ gbara ọtọ wee na-anapụ ha ego na-achọkarị gụnyere:
- Cheta na ọ bụghị naanị gị so n'ije a ọ bụghịkwa gị kpatara ya.
- Kpesa akaụntụ ahụ, site na njirimara nchekwa nke ikpo oku.
- Gbochie ha ka ha ghara ịkpọtụrụ gị.
- Chekwaa ihe ngosi gi ma ọ bụ ozi - ha nwere ike inyere ndị ọrụ nchekwa aka ịchọpụta ma kwụsị onye na-eme mpụ a.
- Rịọ maka enyemaka n'aka okenye ị tụkwasịrị obi ma ọ bụ ndị ọrụ nchekwa tupu izipu ego ma ọ bụ ihe onyonyo.
- Iso onye na-eme mpụ a ma ọ bụ nyere ha aka anaghị mmekpa ahụ - mana ndị nchekwa nwere ike ya.








