Africa Eye: Etu otu nwaanyị si jiri Whatsapp zọọ ndụ ndị a tọrọ atọ

Aha onyonyo, Etu otu nwaanyị jiri otu Whatsapp jiri zọọ ndụ ndị tọrọ atọ n'Oman
Africa Eye: Etu otu nwaanyị si jiri Whatsapp zọọ ndụ ndị a tọrọ atọ
Ọ bụ nzụkọ gbara anya mmiri mgbe ha niile n'ọdụelu na Lilongwe nke Blessings na ezinaụlọ ya n'Ọktoba
Nkọwa foto, Ọ bụ nzụkọ gbara anya mmiri mgbe ha niile n'ọdụelu na Lilongwe nke Blessings na ezinaụlọ ya n'Ọktoba

Ndị na-arụ ọrụ ụlọ si Malawi hụrụ na ha tọrọ ma na-abamiga mkpagbu na mmekpa ahụ na mba Oman, ụmụnwaanyị e jiri otu Whatsapp wee zọọ ndụ ha ma weghachi ha n'ụlọ. Nke a bụ akụkọ nsogbu metụtara mmadụ a na-ahụ n'ụwa.

Africa Eye ndị ọzọ anyị mere n'oge gara aga

Nwaanyị dị afọ 32 na-ebe akwa ka o cheter ihe mere ya n'Oman ebe akpagburu ya.

Ọ sị na ọ chọrọ ndụ dị mma gawa Oman mana ihe anya ha hụrụ rir ya ọnụ ebe ọ hụrụ na ọ na-arụ ọrụ dịka onye ọrụ enyemaka n'ụlọ n'Oman.

Georgina, si ka anyị akpọla aha nna ya, dịka ụmụnwaanyị ndị ọzọ ibe ya a turu mgbere gwara BBC na o cheburu na e nyere ya ọrụ ọkwọụgbọalal na Dubaị.

O nweburu azụmahịa na Lilongwe, isi obodo mba Malawi mgbe onye na-achọrọ ndị mmadụ ọrụ gakworo ya sị ya ka ọ chọtarala ya ọrụ na mpaghara ọwụwaanyanwụ etiti mba ụwa (Middle East).

Elekere abụọ sọọsọ ka ọ na-ehi ụra mana o teghị aka ka onyeisi ya bidoro chọwa mmekọ ahụ n'aka ya. Ọ gwara Georgina na ọ ga-agbagbu ya ma o kwuo ihe ọbụla.
Nkọwa foto, Elekere abụọ sọọsọ ka ọ na-ehi ụra mana o teghị aka ka onyeisi ya bidoro chọwa mmekọ ahụ n'aka ya. Ọ gwara Georgina na ọ ga-agbagbu ya ma o kwuo ihe ọbụla.