Africa Eye: Etu otu nwaanyị si jiri Whatsapp zọọ ndụ ndị a tọrọ atọ

Aha onyonyo, Etu otu nwaanyị jiri otu Whatsapp jiri zọọ ndụ ndị tọrọ atọ n'Oman
Africa Eye: Etu otu nwaanyị si jiri Whatsapp zọọ ndụ ndị a tọrọ atọ
Ọ bụ nzụkọ gbara anya mmiri mgbe ha niile n'ọdụelu na Lilongwe nke Blessings na ezinaụlọ ya n'Ọktoba
Nkọwa foto, Ọ bụ nzụkọ gbara anya mmiri mgbe ha niile n'ọdụelu na Lilongwe nke Blessings na ezinaụlọ ya n'Ọktoba

Ndị na-arụ ọrụ ụlọ si Malawi hụrụ na ha tọrọ ma na-abamiga mkpagbu na mmekpa ahụ na mba Oman, ụmụnwaanyị e jiri otu Whatsapp wee zọọ ndụ ha ma weghachi ha n'ụlọ. Nke a bụ akụkọ nsogbu metụtara mmadụ a na-ahụ n'ụwa.

Skip Africa Eye ndị ọzọ anyị mere n'oge gara aga and continue readingAfrica Eye ndị ọzọ anyị mere n'oge gara aga

End of Africa Eye ndị ọzọ anyị mere n'oge gara aga

Nwaanyị dị afọ 32 na-ebe akwa ka o cheter ihe mere ya n'Oman ebe akpagburu ya.

Ọ sị na ọ chọrọ ndụ dị mma gawa Oman mana ihe anya ha hụrụ rir ya ọnụ ebe ọ hụrụ na ọ na-arụ ọrụ dịka onye ọrụ enyemaka n'ụlọ n'Oman.

Georgina, si ka anyị akpọla aha nna ya, dịka ụmụnwaanyị ndị ọzọ ibe ya a turu mgbere gwara BBC na o cheburu na e nyere ya ọrụ ọkwọụgbọalal na Dubaị.

O nweburu azụmahịa na Lilongwe, isi obodo mba Malawi mgbe onye na-achọrọ ndị mmadụ ọrụ gakworo ya sị ya ka ọ chọtarala ya ọrụ na mpaghara ọwụwaanyanwụ etiti mba ụwa (Middle East).

Elekere abụọ sọọsọ ka ọ na-ehi ụra mana o teghị aka ka onyeisi ya bidoro chọwa mmekọ ahụ n'aka ya. Ọ gwara Georgina na ọ ga-agbagbu ya ma o kwuo ihe ọbụla.
Nkọwa foto, Elekere abụọ sọọsọ ka ọ na-ehi ụra mana o teghị aka ka onyeisi ya bidoro chọwa mmekọ ahụ n'aka ya. Ọ gwara Georgina na ọ ga-agbagbu ya ma o kwuo ihe ọbụla.