Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii jidere onye na-ere anụ mmadụ ka suya?

Onyonyo na-efegharị na whatsapp, nke na-ekwu na ndị uweojii jidere otu nwoke ji anụ mmadụ eme suya ọ na-ere, abụghị eziokwu.

Ndị uweojii Delta steeti akatọọla etu ndị mmadụ si ebugharị akụkọ ụgha gbasara otu nwoke e jidere na steeti ahụ ma bo ya ebubo na ọ na-eji anụ mmadụ eme suya nke ndị mmadụ na-azụrụ.

Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta Steeti gwara BBC Igbo n'ekwentị na onyonyo ahụ na-efegharị abụghị etu ihe ahụ si mee kpọmkwem.

Edafe kwuru na ozu mmadụ ahụ a hụrụ na ya bụ onyonyo bụ onye nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ.

Ọ kọwara sị: "Ọ bụ eziokwu na ya bụ onyonyo gbasara ebe niile, mana akụkọ so ya abụghị eziokwu."

"Ya bụ ihe bụ onye nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ dị n'Oboloekiti, na mpaghara Ogwashiuku."

"Ọ bụ otu onye ọkwọụgbọala kụrụ nwaamadị ahụ ma kwọrie ozu ya gbalaga, ọ bụghị eziokwu na ọ bụ onye ji anụ mmadụ eme suya ọ na-ere."

Oge anyị jụrụ Edafe ihe kpatara nwoke ahụ e gosiri n'onyonyo ahụ ji buru ya bụ ozu na 'wheel barrow', o kwuru na ya akọwaala ihe nnyocha ha gosiri.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị uweojii zọpụtara nwoke ahụ, maka na ndị mmadụ gaara ịkụgbu ya n'ihi ebubo na-abụghị eziokwu.

"Ọ bụrụ na ha kụgburu nwoke ahụ, mara na ha gaara ịkugbu onye aka ya dị ọcha, maka na nnyocha anyị gosiri na ihe ahụ bụ ozu onye ụgbọala kụgburu n'okporoụzọ," Edafe kwuru.

"Agaghị m abịa kọwara ụnụ ihe ọzọ na-abụghị ihe nnyocha gosiri."

Gịnị dị n'ime onyonyo ahụ?

Ya bụ onyonyo gosiri ebe ndị ntorobịa gbakọrọ ma na-ekwu etu ha si hụ onye ahụ bu ozu mmadụ.

A hụrụ ihe dịka anụ ka ọ dị n'ime 'wheel barrow' nke a dọnyere n'azụ ụgbọala ndị uweojii; otu onye uweojii nọkwa ebe ahụ.

Ọ bụ onye uweojii ahụ ka a nụrụ olu ya n'onyonyo ahụ ebe ọ na-ekwu sị: "Suya niile a ụnụ na-ata, lekwa ya ebe a."

"Nke a ụnụ ga-azụta nke narị naịra abụọ ha etinyejuo ya."

Otu onye ọzọ nọ ebe ahụ tinyere ọnụ ma kwuo sị: "Suya na-amasị m nke ukwu. Ọ na-agba m gharịị etu ha si eresi m suya ọnụ ala ugbua, kama iresi m otu n'ọnụ otu narị naịra, ha asịm weta naịra 150 maka abụọ."

Onye ọzọ kwukwara na ọ ga-akpọ ndị niile ọ ma ma gwa ha ka ha kwụsị ịzụ suya.

Gịnị bụ Suya?

Suya bụ anụ a mịrị amị n'ọkụ, tinye ya ose nakwa ngwanri ndị ọzọ nke na-eme ya ka ọ bụrụ sọ ụtọ.

Ọ bụ ndị si mpaghara ugwu Naịjirịa na-akacha amị anụ suya, maka na ọ bụ na mpaghara ahụ ka ya bụ nri a si pụta.

Ọ bụ anụ ehi, anụ ewu maọbụ anụ ebila ka a na-ejikarị eme suya, nke mere e ji atụ ilu sị: "beta suya, beta suya, ọ bụkwa n'ahụ ehi".