You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Eziokwu apụlata ihe banyere egbe a sị ndị agha Naịjirịa kpachiri
Akụkọ pụtara na soshal midia n’izu a nke kwuru na ndị agha Naịjirịa kpachiri ọtụtụ egbe AK-47 na mpaghara ugwu bụ akụkọ ụgha.
Nke a bụ nchọpụta ngalaba nnyocha akụkọ ụgha na BBC bụ BBC disinformation unit mere.
Nnyocha ngalaba a gosiri na eseghị foto a na Naịjirịa maọbụ Niger dịka ụlọ ntaakụkọ nke mbụ kesara ya bụ Zinariya siri kwuo.
BBC disinformation unit kọwara na akụrụ ngwa teknụzụ nke Google Lens gbara ama na ya bụ foto si n’akụkọ ụlọntaakụkọ Olympia zịpụtara n’ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị 2022.
Ugbua, akụkọ ụgha banyere foto a esila n'ọba ozi ebe ekesara ya na mbụ ma na-efesa n'ọtụtụ akara Whatsapp ndị mmadụ na Naịjirịa dịka ndị mmadụ na-eto ndị agha Naịjirịa maka ikpachi egbe ndị a.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Nchọpụta BBC gosiri na akụkọ ebe foto a si n’ezie bụ akụkọ gbasara etu ndị agha mba Russia siri jichie egbe AK74 na mpaghara Zaporizhzhia nke mba Ukraine.
Akụkọ ahụ kwuru na ndị agha mba Russia weghaara obodo Zaporizhzhia na nnukwu ụlọọrụ ogbunigwe nuklia nke Europe dị ebe ahụ n’ụbọchị Machị 2 2022, bụ ụbọchị itoolu mgbe Russia malitere mbuso agha ya n’Ukraine.
Nchọpụta BBC gosikwara na ụdị egbe nke Kalashnikov dị na foto ahụ bụ AK74 nke bụ na ọ bụghị AK47 dịka akụkọ na-efeghari siri kwuo.
Nke bụ eziokwu bụ na mpaghara ugwu Naịjirịa nọ n'ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị njọọ kemgbe afọ ole m ole. Otu ndị agha nnupụisi nke ụka alakụba bụ Iswap n'ịchafụ nakwa Boko Haram na-akpa ike ebe ahụ.
Ibu egbe na ngwa ọgụ a bụrụla nsogbu ebe ahụ dịka ugboro ugboro ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ejichi egbe ndị omekome na-ezube izubata Naịjirịa.
Na nso nso a, otu ndị ojiegbe nke ọtụtụ ji 'Bandits' mara malitere ịkpa ike ebe ahụ dịka ha na-atọ ndị mmadụ aghara aghara ma na-ana ezinụlọ ndị ha tọọrọ agbagba ego mgbapụta.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjịrịa ekwuola ugboro ugboro na ha na-ebuso ndị agha ma na-enweta mmeri.
Minista mgbasa ozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed ekwuola ma kwusieike na ndị agha Naịjirịa na-emeri na-agha a ha na-ebuso ndị a na-akpa ike na mpaghara ugwu Naịjirịa mana akụkọ ntọọrọ ndị mmadụ nakwa mwakpo ka na-esi na mpaghara ahụ adapụta ruo ugbua.
Agbanyeghi nke a, ozi na-esi n'aka ndị agha Naịjirịa banyere mwakpo ndị omekome na-apụta ihe ugboro ugboro gụnyere ndị agha otu Boko Haram ndị na-achili aka elu ma chịsa ngwa ọgụ ha site n'atụmatụ agha ndị agha Naịjirịa.