Ndị ọgụ ndị omempụ metụtara na Cape Town

A gbagburu nwa Devon Africa dị afọ anọ bụ Davin n'ọnwa Febụwarị, oge e nwere ọgbaaghara n'etiti ndị omempụ.

Ebe foto si, Africa family

Nkọwa foto, A gbagburu nwa Devon Africa dị afọ anọ bụ Davin n'ọnwa Febụwarị, oge e nwere ọgbaaghara n'etiti ndị omempụ.
    • Onye dere ya, Nick Ericsson
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

A gbagburu nwa Devon Africa dị afọ anọ bụ Davin n'ọnwa Febụwarị, oge e nwere ọgbaaghara n'etiti ndị omempụ.

Ọ bụ onye ihe metụtara n'ọgbaaghara ndị omempụ a na-ahụta na Cape Flats, obodo ndị nọ gburugburu Cape Town - ihe nketa nke ịkpa oke agbụrụ, mgbe a manyere ndị na-abụghị ndị ọcha n'ike site n'etiti obodo ndị bara ọgaranya gaa na mpaghara enweghị akụ ọbụla.

"Nke a bụ oghere mgbọ ebe a," ka ọ na-ekwu. "Nke a bụ ebe ọ rahụrụ."

Ezinụlọ ahụ agabigala ụjọ na-enweghị atụ.

E gburu nke nwaanyị tọrọ Davinbụ Kelly Amber, afọ abụọ gara aga, a gbagburu ya ka ndị omempụ gbakọrịtara onwe ha egbe. Ọ dị afọ iri na abụọ.

Ugbua Devon na nwunye ya, bụ Undean, nwere naanị nwa ha nwaanyị nke ikpeazụ fọdụrụ.

"Ọ jụrụ m: 'Olee ebe nwanne m nwoke nọ?'" ka Undean kwuru. "Ya mere, agwara m ya na ya na Jizọs nọ n'ime obi nna ya na n'ime obi nke m."

Ọnụọgụ ndị ahụ na-akọ akụkọ dị egwu.
Nkọwa foto, Ọnụọgụ ndị ahụ na-akọ akụkọ dị egwu.

Ogbugbu ndị a mere na mpaghara a maara dịka Wesbank, mana ọtụtụ ezinaụlọ ndị ọzọ n'ofe mpaghara Cape Flats ahụtakwala ụdị ajọ ọnọdụ ahụ, n'agbanyeghị mmesi obi ike nke ndị uweojii.

Ọnụọgụ ndị ahụ na-akọ akụkọ dị egwu. Mpaghara Western Cape na-ahụkarị ọnụọgụgụ igbu ọchụ metụtara ndị omempụ n'ebe ọ dị ukwuu na mba Saụt Afrịka, dịka ndị uweojii siri kwuo.

Nke a bụ ihe gọọmentị kwesịrị ibu ụzọ lebara anya. Onyeisiala bụ Cyril Ramaphosa hibere ngalaba pụrụiche iji lụọ ọgụ megide ndị omempụ n'afọ 2018, ọ kpọgakwara ndịagha obere oge na mpaghara ahụ n'afọ na-esote, mana nsogbu ahụ ka na-aga n'ihu, ogbugbu a na-aga n'ihu.

"E nwere akụkọ gbasara ọgbọ ndị a mụrụ n'ime otu ndị omempụ a," ka Gareth Newham, onyeisi atụmatụ mgbochi ọgbaaghara n'otu Institute for Security Studies na Johannesburg na-ekwu.

"[Ha] na-eto eto na mpaghara ndị a na-eleghara anya maọbụ mpaghara na-emepeghị emepe na steeti. Ndị otu a nwere usoro na-elekọta ndị obodo na-adịghị enweta uru gọọmenti. Ha na-enye ndị mmadụ nri n'ụlọ ha. Ego maka ọkụ latrik. Ego maka njem maọbụ oliliozu. Ndị otu a na-akwụ ọbụnadị ụgwọ akwụkwọ. "

Ọrụ ya bụ ikpe udo n'ọgụ ndị omempụ iji kwụsị ime ihe ike a na igbu ọchụ, nke ahịa ọgwụ na-enye ego na-akpata.
Nkọwa foto, Ụkọchukwu Craven Engel

Mana e nwere ndị na-agbalị imezi okwu ahụ.

kilomita iri na ise (maịlị itoolu) site na Wesbank bụ Hanover Park ebe pastọ Craven Engel na-arapara na ekwentị ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị niile, kwa ụbọchị ebe ọ na-achọ udo.

Ọrụ ya bụ ikpe udo n'ọgụ ndị omempụ iji kwụsị ime ihe ike na igbu ọchụ, nke ahịa ọgwụ na-enye ego na-akpata. Ya na ndị otu ya na-agbalị ịgbaso usoro: nchọpụta, nkwụsịtụ na mgbanwe echiche.

"Hanover Park enweghị ezi akụnaụba nke onwe ya," ka Ụkọchukwu Engel na-ekwu. "Ọtụtụ akụnaụba na-esi n'ahịa ọgwụ. Nke ahụ bụ nnukwu akụnaụba."

Obodo a nke ihe dị ka mmadụ 50,000 na-edi ịgba egbe na ịsụ mma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị. Ọ bụkwa ndị na-eto eto na-egbu mmadụ ma bụrụkwa ndị a na-egbu.

Ihe omume ọ na-eme na-eweta ego gọọmentị, mana nke ahụ akwụsịla.
Nkọwa foto, Akwụkwọ akụkọ

Ihe omume ọ na-eme na-eweta ego gọọmentị, mana nke ahụ akwụsịla. Iji chekwaa ndị aka ha dị ọcha, ọ na-ezute ndị a tara ahụhụ na ndị na-eme mpụ n'ebe ọ bụla nakwa n'oge ọ bụla.

Ọ na-ezipụkwa ndị otu a chegharịrị echegharị ka ha na ndị otu na-alụ ọgụ kparịta ụka. Ndị biri ndụ n'ọnụ ọnwụ maara na ọ dị oke mkpa ịkwado maka udo.

Glenn Hans bụ otu onye. Ọ na-ezute ndị omempụ na-alụ ọgụ iji mee ka ha kwenye ịkwụsị ọgụ. "Anọkwa m n'egwuregwu a. Ọ bụrụ na ikpebiri na ịchọrọ ịbụ onye dị mma. Ọ gwụla," ka ọ gwara ndị omempụ.

Otu nyere nzaghachi na-awụ akpataoyi: "Ka anyị na-egbu mmadụ, ka anyị na-akpachi ala, etu ahụ ka anyị nwekwara ike iwu ụlọ. Ya mere, ka m kwuo banyere udo - enweghị m ike ime mkpebi ahụ n'ihi na ọ bụghị mkpebi m ịhụ na udo dị."

Nkwụsị agha nke e kwekọrịtara naanị ụbọchị ole na ole, ghasasịrị n'ihi ogbugbu e gburu mmadụ abụọ n'ụgbọala.

Ma ụfọdụ ndị nọ n'oke esemokwu ahụ achọghịzi.

Fernando - ma ọ bụ Nando - Johnston nọ n'otu òtù a na-akpọ Mongrel
Nkọwa foto, Nando Johnston

Fernando - ma ọ bụ Nando - Johnston nọ n'otu òtù a na-akpọ Mongrel, ọ chọrọ ịnwale ma chọta ụzọ enyemaka nke Ụkọchukwu Engel.

Ụkọchukwu na-akọwa Maazị Johnston dị ka nwata "a mụrụ n'ime otu ndị omempụ" ebe ọ bụ na o metụtara ezinaụlọ ya niile.

"N'egwuregwu a, enwere naanị ọchịchọ abụọ - ọ bụ na ị ga-aga mkpọrọ maọbụ nwuo," ka Maazị Johnston kwuru.

Ọ ga-esonyere ihe omume nzụgharị izu isii ruo izu iri na abụọ nke onye Ụkọchukwu na-akwado site n'onyinye obi ebere iji mee ka ndị mmadụ kwụsị ọgwụ ike na ịrụ ọrụ.

"Adị m njikere ịga, Ụkọchukwu," ka Maazị Johnston kwuru, dịka ọ dị njikere ịpụ n'obodo ya.

Ndị ya na ya kachasị emekọrịta ihe gbakọtara ka ha gọọrọ ya ọfọ ọma. Nne ya bụ Angeline April na-ejide anya mmiri, oge a, nwa ya nwoke ahọrọla ndụ. "Biko were ohere a mee ihe kachasị mma, Nando," ka o kwuru.