Mkpu ndị Nnewi na-eti maka ajọ ọnọdụ ụzọ ha

Uzo Nnewi
Nkọwa foto, Ụzọ Nnewi

Ndị ahịa, ndị ọkwọ ụgbọala nakwa ndị ọzọ bi na Nnewi Anambra steeti etipula mkpu maka ọnọdụ ụzọ ha na steeti ahụ.

Ha na-ekwu na ego, oge nakwa uru ndị ọzọ funarịrị ha maka ọnọdụ ọjọọ ụzọ ahụ.

Ha na-akpọ gọọmentị oku ka ha bịa hụ na o nwere ihe ha mere ngwa ngwa iji kwụsị ahụhụ ha na-ata maka ụzọ ndị a ma hụkwa na amalitere ọrụ n'ụzọ nke ndị enyerela ndị ọrụ ngo rụọ.

Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ụzọ dị icheiche nọ n'ọnọdụ nreka dị icheiche.

Anyị hụkwara na ebidobeghi ọrụ n'ọtụtụ ụzọ dị n'ebe ahụ n'agbanyeghi na enyefela ọrụ ụzo ahụ n'aka ndị ọrụ ngo.

Cheta na n'ozi nke Kọmịshọna mgbasaozi bụ Paul Nwosu wepụtara n'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba, o kwuru na amapụtala nde naira narị abụọ na iri ise na isii iji ruzi akụkụ a kpọrọ Bank road ma kwuo na ọ ga-ebi n'ime ọnwa anọ. \

BBC hụrụ na enwebeghi onye a hụrụ ebe ahụ maọbụ ngwa ọrụ ọbụla dị n'akụkụ ebe ahụ.

Ọzọ, amapụtara ijeri naira abụọ nakwa otu nde narị naira maka ikpocha ma rụzie akụkụ ụzọ akpọrọ St Mary's road dị n'Uruagu nke ga-ewe ọnwa itoolu mana rue ugbua ọrụ ebidobeghi na ya.

Uzo Nnewi
Nkọwa foto, Ụzọ ime ahịa Nnewi

Ụfọdụ n'ime ndị na-azụ ahịa bụ Joseph Onyedeke nakwa Uzoamaka Anutanwa kọwara na ha na-emefu ego ka nke n'ibubata ngwa ahịa ha n'ahịa mana o nweghi isi n'ihi na ndị mmadụ na-agbahapụ ahịa Nnewi a ga ebe ọzọ maka ajọ uzọ.

Collins Onyia bụ ọkwọ ụgbọala kwuru na ajọ ụzọ achụọla ụfọdụ ndị otu ya ọsọ na Nnewi n'ihi ego ọ na-ewe ha ịrụzị ụgbọala ha ma o mebie n'ụzọ Nnewi.

Ọ kpọrọ oku ka Gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka ngwa ngwa.

Park Road
Nkọwa foto, Ebe a kpọrọ Park Road

Ihe ọzọ pụtakwara bụ na enyela ọrụ ụzọ Okpunoeze nakwa Isaho Umezeogu n'aka ndị ọrụ ngo kemgbe ọnwa Maachị afọ 2023.

O dobeghi anya ihe mere na ọrụ ebidobeghi n'ụzọ ndị a.

BBC Igbo kpọrọ Kọmịshọna Paul Nwosu n'ekwentị mana ọ zaghị ya. Anyị ka na-agba mbọ ịnweta ya.