Etu e siri rụzie akwa mmiri Aguiduma, Enugu steeti mgbe BBC Igbo mechara akụkọ banyere ya
Ọṅụ na aṅụrị abatala n’obodo Aguiduma nke Enugu steeti ka gọọmentị steeti ahụ mechara mezuo nkwa e kwere ha banyere ịrụzi akwa mmiri nọ n’obodo ahụ nke na-eduba ma ebupụ ndị mmadụ si ebe ahụ bata nakwa pụọ.
N’afọ 2021 mgbe BBC Igbo mere njem gaa obodo a, anyị hụrụ ka e si jiri osisi rụọ akwa mmiri eji nwa mgbe nta nke metụtara ịdị mfe ndị mmadụ ịga nakwa ịpụ obodo ahụ.
N’oge ahụ, oge udu mmiri na-abụ ihe egwu nye ha n’ihi na ha kọwara na idemmiri na-eburu akwa mmiri ha kwa mgbe kwa mgbe, nke na-eme ka ndị obodo ahụ tọọ na be ha, dịka ha anaghị enwe ụzọ apụ.

Onyeisi oche okpuruọchịchị Nkanu East bụ Godwin Ubagu gwara BBC Igbo oge na “Ịrụ akwa mmiri a so n’ihe ndị anyị depụtara ime n’ọrụ anyị”.
Nnolim Nnaji onye nọrọla afọ abụọ n’ọkwa ịnọchịte anya Nkanu East/Nkanu West n’ụlọomeiwu oge ahụ kwukwara
“Ana m ekwe gị nkwa na anyị ga-amalite ọrụ ịrụzị akwa mmiri a malite n’akụkụ Eke ime banye Aguiduma”.
Ndị obodo ahụ kwuru na ha nọ na-eche ka gọọmentị malite ọrụ kọkwaara anyị oge ahụ etu ọnọdụ akwa mmiri obodo ha si mee ka ụfọdụ ụmụnwaanyị obodo ha ndị ime hara inwe ike gaa ụlọọgwụ dịka ya bụ ihe metụtara agụmakwụkwọ ụmụaka ha.
Akụkọ BBC Igbo mere wepụtara mkpu ndị obodo a nọ na-eti, ugbua gọọmentị arụziela ya bụ akwa mmiri.
Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị hụ ọnọdụ ya ugbua.











