Abia state news today: Gọọmentị Abia steeti ga-amalite ọrụ n'ahịa Ariaria taa
Gọọmentị Abia amalitela ikutu aha Arịarịa ma ịrụzigharị ya nakwa ọwa mmiri dị n'ahịa ahụ.
Ebe ọrụ a ga-emetụta bụ na A Line, C Line nakwa Medical Line dị n'ahịa ahụ.
Ọ bụ John Okiyi Kalu bụ Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ depụtara ozi ahụ n'akara Facebook ya.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu kwukwara ka a kpọghachi ndị niile si n'ụlọahịa ha pụọ maka ọrụ nsonso a.
Cheta na BBC Igbo mere akụkọ gosiri ọnọdụ ọjọọ ahịa ahụ tupu ọrụ a amalite.

Ebe foto si, John Okiyi

Ebe foto si, John Okiyi

Ebe foto si, John Okiyi
"Etu ụzọ ahịa Ariaria dị na-agba anyị anya mmiri"

Akụkọ ọnọdụ ọjọọ ahịa Arịaria dị n'Aba bụ ihe na-agba ọtụtụ ndị na-azụ ahịa n'ahịa ahụ nakwa ndị na-abịa azụ ha ahịa anyammiri.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ahịa ahụ ụbọchị Tuzde were jiri anya ya hụ etu mmiri siri too n'ọtụ okporoụzọ dị n'ahịa ahụ.

Ọ kọwara n'ahịhịa na-arị ibe ya elu na ya bụ ahịa.

Ụfọdụ dị na-ere ahịa ebe ahụ gwara anyị na ọnọdụ azụmahịa n'adakpọ na ya bụ ahịa n'ihi ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ ahụ tụmadị n'udu mmiri.

Kirie ma gee ihe ndị ọzọ ha kwuru ebe a n'uju :