Onyeisi ndị uweojii na Kenya agbaala arụkwaghịm

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị uweojii na mba Kenya bụ Japhet Koome agbaala arụkwaghịm.
Ọtụtụ otu na-ebu agha na Kenya megide mgbekpaahụ ndị mmadụ, boro ndị uweojii ebubo na ha gburu, tọrọ ma wuchie ụfọdụ ụmụntorobịa mere ngagharịiwe na Kenya iji mee ka gọọmentị kwụsị atụmatụ ịna ụtụisi ụfọdụ ha hiwere na mbụ.
Arụkwaghịm a Japhet Koome gbara n’abia dịka onyeisiala William Ruto chụrụ ndịọrụ mịnịsta gọọmenti ya na ọkaikpe ukwu mba Kenya ụbọchị Tozde Julai 11.
William Ruto a chụọla ndị mịnịsta ya na ọkaikpe ukwu mba Kenya

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto a chụọla ndịọrụ mịnịsta ya niile na ọkaikpe ukwu obodo ahụ.
Ọchụchụ a na-esote ngagharịiwe ndị ụmụntoroọbịa ọgbaraọhụrụ mere na Kenya iji mee ka gọọmentị kwụsị atụmatụ ịna ụtụisi ụfọdụ ha hiwere na mbụ.
Onyeisiala Ruto kwuru na ya chụrụ ndị ahụ ka ya gere ndị Kenya nti maa mee ezi nyocha n’ọrụ mịnịsta ndị ahụ.
Ọ gara n’ihu kwupụta na ya ga-eme ezi nyocha maa kwe nkwa na ya ga-asa anya mmiri wee họpụta ndị mịnịsta ọhụrụ ga-arụrụ ndị obodo ọrụ.
Ọ chụchụ ahụ e metụtaghị osote onyeisiala mba ahụ bụ Geoffrey Rigathi Gachagua.
William Ruto a kagbuola 'Budget' ụlọọrụ 'First Lady' mba Kenya

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Kenya bụ William Ruto a kagbuola bọjet ụlọọrụ isi nwaanyị ‘First Lady’ nakwa ụlọọrụ 40 gọọmenti nwe iji belata mmefu ego obodo ahụ.
Ruto kwuru na a ga-enwe mbeleta ruru pasent 50% na ndị ndụmọọdụ gọọmenti.
Nke a na-abịa dịka ndị mba Kenya mere ngagharịiwe banyere atụmatụ gọọmentị ị buli ego ụtụisi.
Cheta na ọtụtụ mmadụ nwụrụ site na ngagharịịwe ahụ.
Ndị uweojii agbaala ndị malitekwara ngagharịiwe ọzọ na Kenya anwụrụ ose

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii gbara anwụrụ ose iji chụsaa ndị mmadụ wụpụtakwara taa bụ Tọzde ime ngagharịiwe ọzọ n'isiobodo Kenya bụ Nairobi.
Nke na-abịa na-agbanyeghị na onyeisiala mba ahụ bụ William Ruto hapụrụ ibinye aka na iwu ọhụrụ a chọrọ ime nke tinyere atụmatụ ịkwụ ụtụ isi nke ụmụama,la mba ahụ ọkachasị ndị ntorobia, achọghị.
Ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ wụjuru n'okporoụzọ ma nọrọkwa nso ewumewu dị mkpa na mpaghara dị iche iche na isiobodo ahụ.
Nke a na-abịa dịka ihe ruru mmadụ 22 nwụrụ na ngagharịiwe e mere megide ụtụ isis nke so na ihe mere ndị ngagharịiwe ji tụnye ọkụ n'ụlọọmeiwu mba ahụ.
Ndị ntọrọbịa na-eme ngagharịiwe sịrị na ha pụtara ịkwanyere ndị e gburu na ngagharịiwe ahụ ugwu ikpeazụ.
Onyeisiala mba Kenya ewepụla iwu ụtụisi ahụ dịka ọtụtụ mmadụ nwụchara n'ihi ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto ekwuola na o wepụla iwu akụnaụba ahụ nke gụnyere mbuli elu ụtụisi dịka e mechara ngagharịiwe butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ.
Na mgbasaozi o mere nye ndị mba ahụ, o kwuru na o doro anya na ụmụafọ Kenya achọghị ihe ọbụla ga-eme ka ha mefuo ego
“Ekwetele m,” ka o kwuru, ọ gbakwụnyere na ọ gaghị etinye aka n’akwụkwọ ka ọ bụrụ iwu.
Ihe karịrị mmadụ iri abụọ na abụọ (22) ka e gburu n’ụbọchị Tuzde, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịịrị onye na mba Kenya si kwuo.
Maazị Ruto kwuru na ugbua ya na ndị ntoroọbịa ga-abanye na mkparịtaụka, bụ ndị kachasị buru ngagharịiwe ahụ n’isi.
“Egeela m ndị Kenya ntị bụ ndị tiri mkpu n’oke olu na ha achọghị ihe ọbụla banyere mbuli elu ụtụisi, ekwetela m.
“N’ihi nke a, agaghị m etinye aka n’akwụkwọ iwu akụnaụba 2024, a ga-ewepụ akwụkwọ iwu a. Ndị mmadụ ekwuola uche ha,” ka o kwuru na mgbasaozi o mere na TV.
Ụtụisi ndị ụlọomeiwu Kenya chọrọ iwebata

Ebe foto si, EPA
- Ụtụisi achịcha
- Ọgwụgwọ kansa
- Ụtụisi mmanụ nri
- Akwa mwachi nwata (diaper)
- Ụtụisi dijitaalụ
- Ụtụisi Mpesa
- Ụtụisi ụgbọala
- Ụtụisi igwe latrik solar
- Akwa mwachi ụmụnwaanyị (pad)

Ebe foto si, EPA
Ndị ụlọomeiwu tinyere aka n’akwụkwọ iwu ahụ n’ụbọchị Tuzde na-agbanyeghi ngagharịiwe a na-eme megide ya.
Ndị ngagharịiwe a wakporo ụlọomeiwu mba Kenya, gbaa ụfọdụ ebe ọkụ ma zuo ọtụtụ ngwa ọrụ ndị omeiwu ji arụ ọrụ.
Ruto na mbụ jibu aka ike na-eso ndị ngagharịiwe a.
O nyere iwu ka e zipụ ndịagha ma kwuo na ọchịchị ya agaghị agba nkịtị ka e bute ọgbaghara n’obodo Mana o mechara kwugharịa n’ụbọchị Wenezde dịka ọtụtụ mmadụ katọrọ ogbugbu ọtụtụ mmadụ na ngagharịiwe ahụ
E gburu ihe ruru mmadụ 22 na ngagharịiwe ahụ
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye na mba Kenya ekwuola na ha agụtala na mmadụ ruru 22 anwụọla na ngagharịiwe ahụ kpụrụọkụ n'ụbọchị Tuzde.
Ụlọọrụ a kwuru na ha amalitela ime nyocha n'ihe a mere na Tuzde, kwuo na a kpọchiri mmadụ 300 na nga ebe ndị a nwụchirila ruru mmadụ 50.
Ọtụtụ ndị iwe na-ewe gafere ihe mgbochi ndị uweojii tinyere n’ụzọ ma wakpoo ụlọomeiwu ahụ ma mụnye ya ọkụ.
Na mgbasaozi Onyeisiala William Ruto mere na mgbede, o kwuru na ha ga-eme ihe niile ha nwereike “iji mgbochie ndị omekome na-achọ itinye ọgbaghara na mba ha.”
O zipụla ndịagha ka ha gaa mgbochie ndị a na-eme ngagharịiwe.
Ọtụtụ otu akatọọla ndị ọrụ nchekwa maka etu ha si were mgbọ egbe nwereike igbu mmadụ na-agba ndị na-eme ngagharịiwe.
Onyeisi ndị dọkịta ahụike bụ Simon Kigondu gwara ụlọọrụ ntaakụkọ AFP na mmadụ 13 ahụ nwụrụ abụghị ngwụcha n’ọnụọgụgụ.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa gburu ọtụtụ mmadụ n’otu abalị, nakwa akụkọ ndị ọzọ gburu na e gburu ndị mmadụ na mpaghara dị iche iche na mba ahụ.
Ngagharịiwe ahụ nke a na-eme megide iwu ọhụrụ e mere banyere akụnaụba, gụnyere mbuli elu na ntinye ụtụisi ọhụrụ malitere kamgbe ụbọchị anọ mana ọ kpụrụ ọkụ n’ụbọchị Tuzde.
Ngagharịiwe ndị 'Gen Z' atọpụla ọgọdọ na Kenya

Ihe onyonyoo vidio a ka na-enyo enyo egosila ebe ndị na-eme ngagharịiwe buuru njirimara ikikere ụlọomeiwu ‘mace’ bụ nke a na-atụ anya na ha weere n’ụlọomeiwu Kenya.
N’ihe onyonyoo ahụ, a hụrụ ebe ọtụtụ mmadụ na-eso nwoke buuru mace ahụ n’azụ dịka ụfọdụ n’ime ha na-efegharị ọkọlọtọ mba Kenya.
A kpọkwasara ihe onyonyoo ahụ “ikikere ụlọomeiwu bụzi nke dị n’aka ụmụ mmadụ”.
Ebugaala mmadụ iri anọ na ise (45) ndị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Kenyatta National Hospital dị na Naịrobi.
Dịka ụlọogwụ ahụ siri depụta n’akara ọbaozi X ya, mmadụ ndị ahụ na-anata ọgwụgwọ na ịwa ahụ.

Ozi ahụ sịrị na “mmadụ asaa n’ime ndị ahụ nwetara ụdị mmerụahụ dị iche iche bụcha ụmụnwaanyị mana enwebeghị onye nwụrụ site na ngaghịiwe ahụ ruo ugbua.”
Ihe onyonyoo a gbasara site na ngharịiwe ahụ gosiri na ọ kawanyela njọ dịka a hụrụ ebe ụfọdụ ụmụnwoke na-efopu ihe ejiri guzobe ọkọlọtọ Kenya n’ụlọomeiwu mba ahụ.
A hụkwara ebe nwoke ọzọ na-agba mbọ ịgbawa ụzọ ụlọomeiwu sịnet mba Kenya.
Ngagharị ndị ntorọbịa mba Kenya na-eme ka na-ebiri ọkụ. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na puku kwuru puku mmadụ jupụtara n'ọdọ ebe ha gbakọrọ igosi iwe ha maka oke ụtụisi na-eme na mba ahụ. Ọ sị na n'agbanyeghị na ndị uweojii gbara ha anwụrụ anya mmiri nakwa mgbọ rọba, ọ dị ka ndị ntọrọbịa akarịrị ha
Etu ngagharịiwe ndị 'Gen Z' siri malite na Kenya

Ụmụntoroọbịa ọgbaraọhụrụ na-anaghị atụ egwu ọbụla buuru ngagharịiwe wụchie n’okporoụzọ mba Kenya nke mere ka gọọmentị kwụsị atụmatụ ịna ụtụisi ụfọdụ ha hiwere na mbụ.
Ihe malitere dịka ngosi iwe n’ihe onyonyo TikTok banyere iwu ụtụisi mechara bụrụ ihe ịgba isi akwara – na-enweghi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọbụla kwanyere ya ọkụ.
Ọchịchị Onyeisiala William Ruto emeela ihe ọtụtụ ọgbọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emenwughi – n’ikpokọta ọtụtụ ụmụafọ Kenya ọnụ na-agbanyeghi agbụrụ ha dị iche iche.

N’ụbọchị Tuzde ka ọtụtụ ndị ntoroọbịa iwe na-ewe maka ọtụtụ ụtụisi ha na-akwụ ji ngagharịiwe gbochie njem n’okporoụzọ dị n’etiti isiobodo Nairobi na-atụghị egwu ndị uweojii bucha egbe na anwụrụ anya mmiri egwu.
Ndị a jicha ekwentị ha na-eme ihe onyonyo dịka ha ndị ọrụ nchekwa na-agbarịta egbe ọnụ.
Ngagharịiwe ahụ nke a kpọrọ “nọchie ụlọomeiwu”, bụ nke e ji soshal midia na-akwanye ya ọkụ a-abụghị nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ahazi.
“Anyị bụ ndị Gen Z, anyị kpokọtara onwe anyị ọnụ. Anyị ji TikTok na-agwa ndị ntoroọbịa pụta bịa mee ngagharịiwe na-agwa kwa ha ihe mere ha ga-eji soro na ngagharịiwe ahụ,” otu onye so na-eme ngegharịiwe bụ Zaha Indimuli gwara onye ntaakụkọ.
Ndị a kpọrọ Gen Z bụ ndị ntoroọbịa a mụrụ na-agbata ngwụcha ọgbọ afọ 1990 ruo 2000 – Ha pụtara n’igwe, ṅụọ iyi na ngosi iwe agaghị akwụsị naanị na soshal midia.

A nwụchiri ihe karịrị mmadụ 200 so na-eme ngagharịiwe a mana e mechara tọhapụ ha mgbe ndị ọkaiwu gara n’ụlọ ndị uweojii ebe a kpọchiri ha.
Dịka ngagharịiwe na-aga n ‘ihu ọtụtụ awa, ụlọọrụ onyeisiala mba Kenya wepụtara ozi ma kwuo na ọ ga-ewepụ ụfọdụ ụtụisi ndị ahụ nke gụnyere ụtụisi ‘value added tax (VAT)’ e tinyere pasentị 16.
Cheta na ụdịrị ihe a mere na Naịjirịa n’afọ 2020, mgbe ndị ntoroọbịa mere ngagharịiwe n’ihi etu ụfọdụ ndị uweojii si akpagbu ndị ntoroọbịa.
Ọ malitekwara na soshal midia Twitter bụzi X ugbua, mgbe e ji akara #EndSARS na-egosi iwe ha ma mechaa buru ya pụta n’okporoụzọ steeti dị iche iche na Naịjirịa.










