'Emere m mmehie, ọ bụghị DJ Switch ka anyị nwụchiri ọ bụ DJ Commissioner', Benjamin Hundeyin arịọla DJ Switch na BBC mgbaghara

Ebe foto si, Hundeyin, DJ Commissioner, DJ Switch
Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin agwala BBC na ya mehiere wee kwuo na ndị uweojii nwụchiri DJ Switch.
Hundeyin kpọghachiri BBC igbo n'ekwentị ikwugharị ihe o kwuburu na mbụ.
Nke a na-eme kla DJ Switch kwuru n'akara ya na Twitter na ya nọ n'elu akwa ya anụ na ndị uweojii anwụchiela ya.
Hundeyin kpọghachiri BBC Igbo ma kwuo na onye ndị uweojii nwụchiri n'ezie bụ DJ Commissioner, ọ bụghị DJ Switch.
N'okwu ya; " ana m eme mgbasaozi ugbua ikwu na m enwetaghi ihe o kwuru."
O zipuru ozi ma rịọ BBC na ndị mgbasaozi ndị ọzọ arịrịọ maka mmehie ahụ.

Ebe foto si, Ben Hundeyin

Ebe foto si, DJ Switch na Ben Hundeyin
'E jiri oku ekwentị kpotee m n'ụra na ndị uweojii anwụchiela m' - DJ Switch

Ebe foto si, DJ Switch
Nwada Obianuju udeh e ji DJ Switch mara ekwuola na ya nọ n'ụra ebe ndị mmadụ ji ekwentị akpọkasị ya ekwu na a nwụchiela.
O kwuru nke a n'akara ya na X n'ụtụtụ a.
N'okwu ya; 'anọ m n'ụra na-nụ ka ekwentị m na-akụkasị, m na-eche ihe kpatara nke maka na ọ bụghị ụbọchị ncheta ọmụmụ m. M we chọpụta na e kwuru na ndị uweojii anwụchiela m.'
Nke a bụ agbanyeghi na onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii gwara BBC igbo na a nwụchiela ya.

Ebe foto si, DJ Switch Twitter
Ndị uweojii anwụchiela DJ Switch na Legọs - Benjamin Hundeyin

Ebe foto si, DJ Switch
Ndị uweojii na Legọs anwụchiela Obianuju Udeh onye a ma ama ka Dj Switch.
Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC na a nwụchiri ya na Legọs.
O kwuru na a nwụchiri ya maka na o gbochiri ndị uweojii ịrụ ọrụ ha.
N'okwu ya; 'achọrọ m ikwu n'ezie na a nwụchiri DJ Switch'.
"A nwụchiri ya n'ụlọọrụ ndị uweojii maka na o gbochiri ndị uweojii ịrụ ọrụ ha." ka Hundeyin kwuru.
DJ Switch bụ otu onye a ma ama welitere olu oge e mere ngagharịiwe EndSars, ọ nọkwa na #LekkiTollGate n'abalị ụbọchị Oktoba, 2020 oge ndịagha Naịjirịa wakporo ndị na-eme ngagharịiwe ebe ahụ.
Mana kamgbe abalị ahụ, o nweghi onye ma ebe ọ nọ ruo ugbua.
Gịnị mere e ji nwụchie ya?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Na mkparịtụka BBC Igbo na onye nkwuchietọnụ ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin nwere, ọ gwara BBC Igbo na a nwuchiri nwada DJ Switch n'ụlọọrụ ndị uweojii, ọ gwaghi BBC ụlọọrụ nke ọ bụ n'ezie.
Mana akụkọ na-efegahrị bụ na DJ Switch gara n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Elemoro n'Ajah ụbọchị Mọnde abalị 15 ọnwa Epureelu ime mkpesa gbasara nwoke ọ na-atụ aka gwuru ya 'chandum' nke BBC enweghi ike ikwu ka ọ bụ eziokwu
Akụkọ ahụ kwuru na ndị uweojii nwụchiri nwoke ahụ ma kpọchie ya ụbọchị ahụ ma ọ ka nọ n'aka ndị uweojii kamgbe a nwụchiri ya.
Mana akụkọ kwuru na ndị uweojii mechara kpọghachi DJ Switch ụbọchị Wenezde abalị 17 ọnwa Epureel ịjụ ya ihe ọ chọrọ ka e mee nwoke ahụ ọ na-ebo ebubo maọbụ ka a kpụpụ ya ụlọikpe ka ọbụ ka a tọghapụ ya na beelu dịka e kwesighi ijide ya karịa abalị abụo.
Mana akụkọ kwuru na DJ Switch kwuru na naanị ihe ya chọrọ bụ ka nwoke ahụ rịọ mgbaghara ọ ga-esere tinye na soshal midịa mana nwoke ahụ jụrụ ajụ nke mere ndị uweojii jiri kpebie ịkpụpụ nwoke ahụ n'ụlọikpe ebe ọ bụ na nkwekọrịta adịghị n'etiti ha abụọ.
Akụkọ ahụ kọwara na dịka ndị uweojii chọrọ iburu onye ahụ DJ Switch na-atụ aka pụọ n'ụgbọala ha, DJ Switch jiri ụgbọala nke ya gbochie ụzọ ebe ndị uweojii chọrọ isi gafee ma 'wakpoo onye uweojii nwaanyị'.
Nke ahụ mere e jiri nwụchie ya maka igbochi ndị uweojii ịrụ ọrụ ha na iwakpo onye uweojii.
A na-akpụpụ DJ Switch ụlọikpe n'Eti-Osa ebe ọ ga-asara ọnụ ya maka ebubo ndị a na-ebo ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post
Onye ka DJ switch(Obianuju Udeh) a bụ?
DJSwitch, onye ezi aha ya bụ Obianuju Udeh bụ onye na- gwọkọ egwu a ma ama nke Bekee kpọrọ "Deejay".
Nwa ada Udi n' Enugwu steeti, so na ndị aha ha chakere na ngaghariiwe EndSARS maka ịka obi n' ihu ọgụ.
E wepụ nwa afọ ahụ gụrụ akwụkwọ na mahadum ' University of Portharcourt', ụwa akaghị ịma nke bụ eziokwu na mwakpo ndị agha Naijiria wakporo ndị ntorobịa nọ na 'Lekki Toll Gate' eme ngagharịiwe ' abalị iri abụọ nke ọnwa Oktoba n' afọ 2020.(20/10/2020).
Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka END SARS na ebe ọ kwụ ugbua
EndSARS: 'Etu a ka ọ dị , ọ bụghị Buhari kpatara ya'- Fada Mbaka
Kwa ụbọchị tutu o rue ụbọchị mkpamkpa ahụ kpara, DJSwitch na-eji ekwenti ya na- egosi ụwa ihe na-eme n'ebe ha gbakọrọ site n'akara Instagram ya.
O sokwa na-akọwara ndị gbakọrọ ihe ndị ntorobịa chọrọ n' aka gọọmenti iji kwụsị mkpagbu ndị uweojii.
Ọ bụ na ya nụ ọrụ ọ kpọrọ one ya ka ọ nọ ụbọchị ihe mere mana nwa ada ahụ kwesiri ka ụra, na- atụghị egwu.
Ọbụladị oge ndị agha bidoro bịawa ha nso, ọ kpọkuru ndị ntorobịa nọ ebe ahụ ka ha dere jụụ, nọrọ ala ghara ịkpa aghara.
Onye bụ DJ switch a setere ụwa ka esi gbaa egbe na Lekki toll gate? Lee ihe anyị chọpụtara
'Autopsy' kwuru na ọ bụ ọrịa shuga gburu Chima - Ndị uweojii
Ntụmadị oge mgbọ na- awụ, nwata nwaanyị a nwere obi dimkpa akwụsighị ihe ngosi ya kama ọ na- eti mkpu enyemaka ma na- ekwupụtakwa ìhe na-eme dịka ọ na-eme.
Ọtụtụ ndị mmadụ mechara too ya maka inwe obi siri ike kwuru ma sete etu ndị agha si gbaa ndị na-eme ngaghariwe egbe, oge ndị ogbo ya riri mbọmbọ ọsọ.
Mana ụfọdụ na- akpọrị ya maka ịgba n' anwụ ihe a chọrọ izo ezo.









