Alassane Ouattara gbara afọ 83 emeriela n'agba nke anọ ya dịka Onyeisiala Iviri Kostu

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Iviri Kostu bụ Alassane Ouattara bụ onye gbara afọ 83 ejirila pasent 89.77% merie na nntuliaka ọkwa onyeisiala na mba ahụ dịka ngalba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent Electoral Commission' (CEI)si kwuo.
Ouattara , onye fere ọkọlọtọ otu Rallye of Houphouetists for Democracy and Peace (RHDP) netara vootu dị agbata pasent 70 na pasent 99 n'ọtụtụngalaba.
Ndị ọzọ ya na ya zọrọ ọkwa ahụ gụnyere – Jean-Louis Billon, Simone Gbagbo, Ahoua Don Mello, na Henriette Lagou – enweghị onye nwetara vootu ruru pasent 5 vootu a tụrụ.
Ivory Coast Election: Ụmụafọ mba a apụọla n'ọgbọ ntuliaka ịhọpụta Onyeisiala ọhụrụ

Emeela ọgbọ ebe a na-atụ vootu dị iche iche na mba Ivory Coast dịka ha na-eme ntuliaka iji họpụta Onyeisiala ọhụrụ n'ụbọchị Satọde 25 Ọktoba, 2025.
Ka ọ dị ugbua ndị mmadụ amalitelaarị ịtụ vootu n'ọgbọ ntuliaka (polling boot) ndị ahụ.
Onyeisiala Alassane Ouattara dị afọ iri asatọ na atọ na-azọ ọkwa ịbanye n'oche ọchịchị nke ugboro anọ dịka ọ nọrọla afọ iri na ise n'ọchịchị.

Mmadụ ato ndị ọzọ na-azọ ọkwa Onyeisiala gunyere Simone Gbagbo bụ nwunye onye bụbu Onyeisiala, onye bụbu mịnịsta Henriette Lagou Adjoua nakwa onye achụmntaego bụ Jean-Louis Billon.
E wepuru aha Laurent Gbagbo bụbu Onyeisiala mba ahụ maka ebubo mpụ nke ikpe maara ya, na onyendu pati kachasị nnukwu na-ama gọọmenti aka bụ Tidjane Thiam n'ihi nsogbu ịbụ nwafọ mba abụọ.
Nke a mere butere ngagharịiwe tupu ntuliaka a ebido mana ndị uweojii nwụchiri ọtụtụ ndị mere ngagharịwe ahụ ruru mmadụ narị asaa.

E zigara ndị nchekwa ruru puku iri anọ iji kwụsị ọgbaghara tupu a malite ntuliaka.
Ụmụafọ mba Ivory Coast ji ofu anya na-ekiri usoro ntuliaka ahụ dịka ha lụchara agha n'obodo ahụ n'afọ iri na ise gara aga.
Ọtụtụ ndị ntoroọbịa chọrọ ọrụ, mwulite ọnọdụ obibi ndụ, ha chọkwara mgbanwe mana ndị na-azọ ọkwa ebe ha ga-esi ghọrọ onyendu ebughi ibu.











