Lazarus Chakwera bụ Onyeisiala mba Malawi anabatala na e meriri ya na ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Malawi bụ Lazarus Chakwera ekwetela ma nabata na e meriri ya na ntuliaka ọkwa Onyeisiala.
Na mgbasaozi o mere n'ehihie ụbọchị Wenezde, o kwuru na o mere nke a na nkwanye ugwu nye ọchịchị na ebumnobi ụmụafọ mba Malawi inwe mgbanwe n'ọchịchị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị njikere ịhụ na o nyefere ọchịchị n'aka onyeisiala a họpụtara na-enweghi nsogbu ọbụla.
Chakwera mere nkwupụta a dịka ụlọọrụ haziri ntuliaka bụ Malawi Electoral Commission akpọpụtacheghi mpụtara ntuliaka ahụ n'uju.
Mana na nke ha kpọpụtaarala, onye bụbu Onyeisiala mba Malawi bụ Peter Mutharika ji vootu pasentị 66% ebe Chakwera ji naanị pasentị 24%.
Ụlọọrụ agwala ụmụafọ Malawi ka ha nwee ndidi ruo mgbe ha ga-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ n'uju na mgbede.
Dịka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị nkwado Mutharika na-enwe aṅụrị ma na-eme ngagharị na mpaghara dị iche iche n'obodo ahụ.
Peter Mutharika na-emeri ugbua na ntuliaka a kpọpụtarala

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Peter Mutharika bụbu onyeisiala mba Malawi kwụ n'ihu ugbua dịka ngụkọ vootu maka ntuliaka onyeisiala mba ahụ na-aga n'ihu.
Mpụtara ntuliaka sitere na mpaghara abụọ n'ime mpaghara atọ a gụkọrọla vootu ha gosiri na Mutharika na-enweta mmeri ugbua.
Nwoke ahụ dị afọ iri asatọ na ise enwetala vootu ruru pasenti iri isii na isii, dịka onyeisiala na-achị mba Malawi ugbua bụ Lazarus Chakwera dị afọ iri asaa, ji pasenti vootu iri abụọ na anọ na-esote ya n'azụ
Vootu ndị a gụkọrọla na-egosi na Mutharika emeriela na mpaghara ebe ndị a ma Chakwera ama, nke gụnyere isi obodo mba Malawi bụ Lilongwe nakwa Nkhotakota.
Ka o sina dị, ndị na-akwado Chakwera etinyebeghị mma ha n'ọbọ, dịka ha kwuru na ọnụọgụ vootu ya ga-agbagote ngwangwa a gụkọrọ vootu si mpaghara ndị ọzọ.
Malawi amalitela ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu

Ụmụafọ mba Malawi na-atụ vootu taa na ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu n'agbanyeghị ajọ ọnọdụ akụnaụba na mba ahụ dị na mpaghara Saụt Afrịka.
Onyeisiala Lazarus Chakwera na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ, ebe onye Peter Mutharika, bụbu onyeisiala n'oge gara aga na-ama ya aka na ntuliaka a
N'obodo dị iche iche, oke ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bụ otu okwu a kpụ n'ọnụ n'oge achụmnta voou. Oke ọnụahịa nri bụ ihe na-echere ụmụafọ aka mgba.
A ga-eme ntuliaka mmegharị ma ọ bụrụ na enweghị onye nwetara vootu ruru 50% na ntuliaka ahụ.
Gịnị mere ndị Malawi ji eme ntuliaka?
Mmadụ dị nde asaa na ụma abụọ (7.2 million) debayere aha iji nweike ịtụ vootu na ntuliaka a malitere n'elekere anọ nke ọtụtụ:
- Onyeisiala - Mmadụ iri na asaa na-azọ ya
- Ndị omeiwu - A ga-ahọpụta ndị omeiwu ga-anọchiteanya mpaghara 229
- Ime obodo - A ga-ahọpụta ndị kansịlọ 509

Kedụ onye nwereike ị bụ onyeisiala?

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ime mmadụ 17 na-azọ ọkwa onyeisiala, mmadụ abụọ bụ ndị a ma ama karịa.
Chakwera na Mutharika bụ ndị ga-ama onwe ha aka nke ugboro anọ na ntuliaka a - n'agbanyeghị na a gọghị nke ugboro atọ e mere.
Mutharika meriri Chakwera n'afọ 2014, mana oge e kwuru na o meriri Chakwera n'afọ 2019, a kagburu ntuliaka ahụ. Chakwera meriri ntuliaka e mere n'afọ 2020.
Lazarus Chakwera - Malawi Congress Party (MCP)
Chakwera, bụbu onye nkụzi ụka na onye oziọma, enweghị ihe ọ ma maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị oge a họpụtara ya dịka onyendu MCP n'afọ 2013
Oge ọ zọrọ ọkwa onyeisiala na 2014, e meriri ya mana na 2020, o meriri Mutharika mmeri ji ọkwa onyeisiala oge ahụ.
Ọchịchị mbụ Chakwera bụ nke ajọ ọnọdụ akụnaụba cheere aka mgba nakwa ebubo nrụrụaka dị iche iche. Nwaamadị ahụ gbara afọ 70, nwetara ụgbọoloko dịka ihe e ji eme njem na Malawi kemgbe afọ iri atọ gara aga. Ọrụrụ ọtụtụ okporoụzọ na mba ahụ.
Peter Mutharika - Democratic Progressive Party (DPP)
Mutharika, gbara fọ 85 bụbu ọkaiwu na onye nkụzi iwu, chịrị Malawi malite n'afọ 2014 ruo 2020.
Nwanne ya nwoke bụ Bingu wa Mutharika, bụbu onyeisiala mana ọ nwụrụ n'ọkwa n'afọ 2012.
Dịka Chakwera, Mutharika bụ onye e boro ebubo nrụrụaka nakwa ajọ ọnọdụ akụnaụba. Mana ndị nkwado ya kwuru na ajọ ọnọdụ akụnaụba dị ugbua ka njọ karịa oge ọ nọ n'ọchịchị. Ha na-ekwu na Mutharika ka Chakwera mara anya ihe gbasara akụnaụba.
Ihe a na-ekwu bụ na Mutharika akaala nka tinyere ọnọdụ ahụike ya.
Ndị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala gụnyere onye bụbu osote onyeisiala bụ Joyce Banda
nke People's Party, onye bụ osote onyeisiala ugbua bụ Michael Usi nke pati Odya Zake Alibe MlanduDalitso Kabambe nke patI UTM.
Gịnị ka ndị na-atụ vootu na-atụ anya ya?

Akụnaụba
Malawi bụ otu mba kacha daa ogbenye n'ụwa niile, mana afọ gara aga na nso nso akawnyela njọ.
Njinji Cyclone Freddy dakwasịrị ha ma gbuo ihe ruru ọtụụ narị mmadụ na 2023, nakwa oke ụkọ mmiri kpara mkpamkpa na mpaghara Saụt Afrịka niile n'afọ 2024.
Nrụrụaka
Oge Chakwera banyere n'ọchịchị, ọ ṅụrụ iyi ibu agha megide nrụrụaka na-echere Malawi aka mgba kemgbe. Gọọmenti ya kwuru na mbọ ha amịtala mkpụrụ mana ndị mmadụ na-ekwu na nke abụghị eziokwu.
Nke a pụtara ihe oge onyeisi ụlọọrụ public prosecutions kagburu ebubo niile ha boro ndị nọ n'ọchịchị na mba ahụ.
N'aka nke ọzọ, ụlọọrụ Anti-Corruption Bureau (ACB) enweghị onyeisi ọbụla kemgbe onye bụbu onyeisi ha bụ Martha Chizuma hapụrụ ọkwa kemgbe otu afọ gara aga.
Ihe ndị a bụ ihe mere ha ji ebo gọọmenti Chakwera ebubo nrụrụaka.
Ọnwụ onye bụbu osote onyeisiala
Na Juun 2024, osote onyeisiala bụ Saulos Chilima nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu. Ọ bụ onye ndị ntorobịa hụrụ n'anya ma bụrụ onye bụ onyeisi pati UTM. E kwuruna ọ bụ onye ha chere na ọ ga-azọ ọkwa onyeisisla na ntuliaka a.
Ọtụtụ na-ekwu na aka gọọmenti dị n'ọnwụ Chilima n'agbanyeghị na nnyocha ụlọọrụ nnyocha mba Jamini mere banyere ihe mberede ahụ.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Gịnị mere na ntuliaka gara aga?
Pati MCP na-achị Malawi kemgbe ha nwetara nwereonwe ha n'afọ 1964. Oge pati ọzọ sonyere na ntuliaka bụ n'afọ 1994.
Kemgbe ahụ, pati United Democratic Front (DPP), People's Party (PP) na MCP achịaala mba Malawi n'oge dị iche iche.
Pati Chakwera bụ MCP meriri 2020, bụ ihe pụrụiche na ndọrọndọrọ ọchịchị mba Malawi.
E mere ntuliaka n'afọ 2019 nke Mutharika meriri mana a kagburu mpụtara ya.
Ụlọikpe kwuru na e mere nrụụaka dị iche iche na ntuliaka ahụ nke metụtara mpụtara ya.
Ndị Ọkaikpe nyere iwu ka e megharịa ntuliaka ahụna 2020. Ọ bụ oge ahụ ka Chakwera ji vootu ruru pasenti 59 merie
N'agbanyeghị na Mutharika katọrọ mpụtara ntuliaka ahụ, ụlọikpe obodo nabatara ya ma kwado ya.









