Paul Biya: Onyeisiala Kameroon kacha ochie n'ụwa na-achọ ọkwa nke asatọ

Paul Biya yi uwe ojii na uwe ọcha

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Paul Biya, esere foto ebe a n'afọ 2022, malitere ọchịchị n'afọ 1982
    • Onye dere ya, Paul Njie & Basillioh Rukanga
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Yaoundé & Nairobi
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala kacha ochie n'ụwa bụ Paul Biya na-achị mba Kameroon dị afọ 92, ekwuola na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ n'ọnwa Ọktoba iji agbatịa ọchịchị afọ iri anọ na atọ ya.

"Ana m ekwe nkwa ịga n'ihu rụọ ọrụ ndị ahụ dị mkpa na-echere anyị aka mgba," ka o kwuru n'akara X ya.

Ọ gbakwụnyere na mkpebi ya ịzọ ọkwa nke ugboro asatọ bịara ka ndị si mpaghara niile dị na Kameroon na ndị si mba ọzọ kpọrọ ya oku.

Ọchịchị Biya ahụtala nkatọ banyere nrụrụaka ego, ọchịchị ọjọọ na nsogbu nchekwa.

E nwewokwa nchegbu banyere ahụ ike ya na ike ọchịchị ya.

BBC News Igbo anwụchiela N'ọbaozi WhatsApp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo WhatsApp Chanelụ

Apụtaghị n'ihu ọhanaeze ihe karịrị izu isii n'afọ gara aga butere asịrị banyere ọdịmma ya na asịrị na-enweghị isi na ọ nwụrụ.

A tụrụ anya nhọpụta ya mana ekwenyeghị ruo mgbe mgbasa ozi ọha ya n'ụbọchị Sọnde.

Biya enwebeghị onye meriri ya na ntuliaka kemgbe ọ malitere ọchịchị na 1982 ma ọ bụrụ na ọ merie afọ asaa ọzọ, ọ nwereike ịbụ onyeisiala ruo mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100.

E nweela ọtụtụ oku na-arị elu site n'ime na n'ezi Kameroon ka ọ pụọ n'ọchịchị ma nye ohere ka onye ndu ọhụrụ pụta na mba ahụ dị na mpaghara etiti Afrịka.

Nkwupụta ịzọ ọkwa Onyeisiala ya na-esochi ịgba alụkwaghịm ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị sitere na mpaghara ugwu, bụ ndị dị oke mkpa n'ịnyere aka na ntuliaka ndị gara aga sitere na mpaghara obodo ahụ.

Abụọ n'ime nwoke ndị a - Minista a ma ama Issa Tchiroma Bakary na onye bụbu Praịm Minista Bello Bouba Maigari - ndị gbara arụkwaghị n'oge na-adịbeghị anya n'otu pati njikọ aka na-achị ma kwupụta iche iche atụmatụ ịzọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ọnwa gara aga, Tchiroma kwuru na ọchịchị Biya ọ bụ otu n'ime ya "emebiela" ntụkwasị obi ọha nke mere o ji abanye n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị megide.

Ọtụtụ ndị na-emegide ọchịchị ya gụnyere Maurice Kamto onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka 2018, yana Joshua Osih, Akere Muna, na Cabral Libii, ekwuputala ịzọ ọkwa ha.

N'agbanyeghị, ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị bụ Cameroon People's Democratic Movement na ndị nkwado ya ndị ọzọ kemgbe afọ gara aga kpọkuru Biya n'ihu ọha ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala ọzọ. Ọ bụbu onye a na-atụ anya ịzọ ọkwa onyeisiala dịka onye isi otu pati ahụ.

Cheta na Biya kagburu oge njedebe nke oneyisiala Kameroon na 2008, na-enyere ya aka ịzọ ọkwa onyeisiala ruo mgbe ebighị ebi.

O meriri ntuliaka nke 2018 site na ihe karịrị pasent 71nke vootu ahụ n'agbanyeghị na ndị otu mmegide boro usoro ntuliaka ahụ ebubo nrụrụaka.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị na BBC News Igbo maka akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile.

Soro anyị na Facebook BBC News Igbo, Instagram bbcnewsigbo, na WhatsApp Chanelụ BBC News Igbo