Archbishop Maxwell Anikwenwa: Ihe ị kwesiri ịma n'ọnwụ ya

Onye bụbu Archbishop Niger n'ụlọụka Anglịkan bụ Archbishop Maxwell Samuel Chukwunweike Anikwenwa anwụọla.

Ozi ọnwụ ya pụtara ihe n'ụbọchị Monde 13 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

Dịka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ala Igbo nakwa n'ụlọọgwụ Iyienu, dị n'Ogidi ụka Anglịkan amalitela izisa ozi iti aka n'obi n'ọnwụ ya.

Dịka Dayọsis ụlọụka Anglịkan dị n'Awka si kwuo, Anikwenwa nwụrụ n'ụlọụka Dayọsis dị n'Iyienu dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

N'oge ọnwụ ya, Anikwenwa dị afọ 82 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 22 Novemba n'afọ 1940.

Ihe ndị ị kwesiri ịma maka Archbishop Anikwenwa

Ndụ Anikwenkwa bidoro n'obodo Oyi dị n'Anambra steeti ebe a mụrụ n'ụbọchị 22 ọnwa Novemba afọ 1940.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Dennis Memorial Grammar School Onitsha ebe o si ga St. Marks Teachers College Nibo Nise.

O mechara gaa na Trinity Theological College dị n'Umahia nke dị n'okpuru Mahadum Naịjirịa.

E chiri Anikwenwa 'Deacon' n'afọ 1966 n'ụlọụka All Saints Cathedral dị n'Ọnịcha ma chie ya ụkọchukwu n'ọnwa Disemba afọ 1968 n'otu ụlọụka ahụ.

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Blessing Anikwenwa n'afọ 1969.

N'afọ 1987, a họpụtara ya ma chie ya echichi dịka Bishopụ mbụ nke Awka.

N'afọ 2000, e chiri ya Archibishop ụlọụka Anglịkan Niger nke Province II na Naịjirịa.

Ndị ziri ozi itiaka n'obi n'ọnwa Anikwenwa

Dayọsịs Awka n'ụlọụka Anglịkan

Peter Obi

Charles Chukwuma Soludo

Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo esorola ndị Igbo nwere agba n'ikwanyere Archbishop Anikwenwa ugwu ikpeazụ n'ọnwa ya.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Christian Aburime binyere aka, Soludo kwuru na Anikwenwa bụ onye ji ndụ ya chụrụ Chineke nakwa ndị mmadụ aja.

Ọ sị "ọ bụ onye ọtụtụ mmadụ na-elegara anya na-achọ ịṅomi n'ịrụrụ Chineke ọrụ".

O jikwa ozi ahụ zigara ụlọụka Anglịkan, ndị okpukpere Kristi na Naịjirịa nakwa ezinaụlọ Anikwenwa ozi itiakanobi n'ọnwụ ya.