Ihe ndị ị maghị maka Vincent Ogbulafor bụbu onyeisioche PDP lara mmụọ

Ihe ndị ị maghị maka Vincent Ogbulafor bụbu onyeisioche PDP lara mmụọ

Onye bụbu onyeisioche otu People's Democratic Party (PDP) bụ Vincent Ogbulafor, alakwurula ndị nna ochie ka ọ gbachara afọ 73.

Gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom, bụ onye gbara ama ọnwụ ya n'ozi nkasi obi o zigara gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu, tụrụ arịrị na ọ nwụrụ "oge nka ya ịchịkọta pati gaara enye aka imezi esemokwu dị na pati anyị ugbua."

N'ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Nathaniel Ikyur binyere aka, Ọrtom sị, "Nnukwu ihe efuola otu PDP na ndị ochịchị obodo nwere agba. Ezi nghọta o nwere n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị efuola anyị."

Ndị dị Ogbulafor nso kwuru na ọ nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Ọktoba na mba Kanada.

Ogbulafor bụ Odeakwụkwọ Ukwu mbụ pati ahụ, nwụrụ na mba Kanada n'abalị Tuzde.

Ihe ndị ị maghị maka Vincent Ogbulafor

Vincent Ogbulafor bụbu Onyeisioche otu PDP site n’afọ 2008 ruo ọnwa Mee, afọ 2010 bụ mgbe ọ gbara arụkwaghịm n'ihi ebubo nrụrụaka.

Ụlọọrụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC), kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo imefu ego ruru nde N104 mana e mechara tọpụ ya si na ikpe amaghị ya.

Tupu ọ banye ọkwa onyeisioche PDP, Ogbulafor bụ odeakwụkwọ ukwu mbụ nke pati ahụ.

Ogbulafor bụ anụ kpọrọ nkụ na-eju ọnụ e ji ikwu okwu na-apụta ụka mara.

N'afọ 2008, o kwuru na "PDP dịka pati na-achị na steeti 28 ga-anọ n'ọchịchị ruo afọ 60."

O kwukwara sị, "Ọ gbasaghị m ma Naijiria bụ mba naanị otu pati na-achị. Ọ bụrụ na onye ọbụla bata n'okpuru otu ncheanwụ, ị mara na ọ pụtara na anyị na-arụ ọrụ ọma."

N’otu mkparịtaụka o nwere, o kwuru na “Oge m bụ odeakwụkwọ ukwu (PDP) anyị kwudoro steeti 21 bụ PDP n’aka Barnabas Gemade."

"Anyị kwalitere ya o rue 28 ma mụbakwa ọnụ ọgụgụ ndị nke anyị n’Ụlọomeiwu Naijria. Ugbua dịka Onyeisioche , Naijiria niile ga-dịrịrị na PDP.”

N'afọ 2010, o kwuru na ọchịchị Naijiria ga-alaghachi n'Ugwu Awụsa ma sị na' a na-enye Musa Yar'Adua nkwado dị pasentị 101."

Nwa eze n’obodo Olokoro dị Umuahia South, Abia steeti, ọ rụkwara ọrụ dịka Minista na-ahụ maka okwu metụtara nkwalite akụnaụba na ọrụ pụrụ iche n’oge ọchịchị Olusegun Obasanjo.

Ọ rụrụ ọrụ dịka Komishọna na-ahụ maka ọrụ n’Abịa steeti.

A mụrụ ya n’afọ 1949.

Ọ hapụrụ nwunye ya bụ Ifeoma Ogbulafor, ụmụ ya na ụmụ ụmụ were nwụọ.