Etu ọrịa 'diphtheria' siri gbuo ụmụaka asaa na Mbaise

Ọrịa mgbapị akpịrị bụ diphtheria n'asụsụ Bekee egbuola opekatampe ụmụntakịrị asaa n'obodo Mbụtụ dị n'okpuru ọchịchị Abọ Mbaise n'Imo steeti.
Ọtụtụ ụmụaka ndị ọzọ bụ ndị butere ọrịa ahụ ka ọ dị ugbua ma bụrụkwa ndị na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ nta dị n'obodo ahụ.
Onye Councillor na-ahụ maka ahụike n'Abọ Mbaise bụ Ugochukwu Umunnakwe, kwuru na ọ bụ n'obodo Mbụtụ Nweorie ka a chọpụtara ọrịa ahụ.
O kwuru na ụmụaka bidoro ịnwụ aghara aghara n'obodo ahụ, bụ nke mere o jiri tisara gọọmenti mkpu.
"Onyeisioche mere ka ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO na Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike mata ihe na-eme n'obodo anyị. Ha bịara, were ọbara ụfọdụ ụmụaka gaa mee nnyocha ma chọpụta na ọ bụ ọrịa diphtheria," ka Umunnakwe kwuru.
Ọ kọwara na ụmụaka ruru 25 ebutela ọrịa ahụ ebe asatọ nwụrụla, ma kwuo na ndị niile ọrịa ahụ gburu gosiri otu njirimara.
Na mbụ ka Onyeisioche okpuru ọchịchị Abọ Mbaise bụ Iheukwumere Henry Alaribe kwuputara ntiwapụ "ọrịa amaghị aha ya" na Mbụtụ, bụ nke ọ sịrị gburu ihe karịrị ụmụaka isii ndị nọ n'agbata otu afọ na afọ isii n'ihe erubeghị otu izuụka.
Alaribe kwuputara nke ahụ n'ụbọchị Mọnde 26 Mee 2025 site n'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Dike Godspower binyere aka na ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ozi ahụ, Onyeisioche Abọ Mbaise kwuru na ya enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ ọtaakara, ndị nke praịmarị nakwa ndị nke sekọndịrị niile dị n'okpuru ọchịchị ahụ ruo mkpụrụ ụbọchị asaa.
O kwukwara na ụmụaka si mpaghara Mbụtụ agaghị esonye n'emume ncheta ụbọchị ụmụaka nke afọ a iji hụ na e belatara maọbụ kwụsị mfesa ọrịa ahụ.
Alaribe nyekwara ndị nne na nna na-agbabeghị ụmụ ha ọgwụ mgbochi ndụmọdụ ka ha gbapụ ọsọ gaa mee nke ahụ na-egbughị oge ma kwuo na ndị ọrụ ahụike si n'ụlọọrụ WHO na-agbakọọrọ Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike n'Imo steeti aka iji nyochaa ma kwụsị "ọrịa ahụ amaghị ebe o si".
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ WHO agbapeela ogige gbatagbata na Mbụtụ iji lekọta ụmụaka ndị butere ọrịa ahụ, dịka ha malitekwara ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi ọrịa.
Site n'ọnụọgụ ndị ọrụ WHO wepụtara, a gbaala ụmụaka dị 97 ọgwụ mgbochi diphtheria, nyochaa mmadụ 120 maka ọrịa ahụ ma chọpụta na mmadụ iri n'ime ha butere ya, ebe ụmụaka asaa bụ ndị ọrịa ahụ gburula ka ọ dị ugbua.









