Anyị agaghị ebiri ego maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa n'Abia Steeti - Mascot Uzor Kalu

Mascot Uzor Kalu onye ji ọkọlọtọ Action Peoples Party azọ ọkwa gọvanọ nke Abia Steeti.

Mascot kwuru na Abia edịghịzị etu ọ dị na mbụ.

Ọ rụtụrụ aka na ụzọ ọjụọ so n'ihe mere na Abia Steeti anaghị enweta ego etu ọ kwesịrị.

O kwuru sị, " Enweghị ọrụ eruola passenti 60 n'Abia Steeti, anyị ga-ebute atụmatụ nke ga-awụlite ụlọorụ ndị na-arịụpụta ihe nke ga-eme ka ihe dịka mmadụ 40,000 n'ime afọ anọ anyị ga-anọ n'ọchịchị nweta ọrụ".

Mascot kwuru na ha ga-etinye mmiri na ihe ndị ọzọ, ma hụkwa na ụmụ akwụkwọ nwere ike ịgụ akụkọ nke ọma.

O kwuru sị, " ọchịchị a bụ nke ruru ndị Abia Nọt, e nwere m ezi nghọta maka ọchịchị...e nwere m nghọta etu esi achụta ego, ihe bụ ihe ndị ọzọ mụ na ha sọ azọ ọkwa gọvanọ enweghị".

Kirie ya n'uju ebe a.