Onye bụ ugwu ndị Enugwu ga-eguzo na ya dịka Gọvanọ?

Enugwu steeti bụ steeti a ma ama maka ọnatarachi ha nakwa ugwu e ji mara ya ma nye ya aha 'Enugu'.

Dịka ọ fọrọ abali ole na ole tupu ndị steeti ahụ a ga-họpụta onye ga-edu ya ha dịka Gọvanọ ọhụrụ, lee ndị na-azọ ọkwa ahụ.

Ihe ruru mmadụ iri na asaa nakwa otu ndọrọ iri na asaa bụ ndị pụtara ịzọya bụ ọkwa.

Onye bụ ugwu ndị Enugwu ga-adabere na ya?

Uche Nnaji - APC

Uche Nnaji bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu steeti.

O jibuola ọkwa dịka kọmishọna n'Enugwu.

Uche Nnaji nwe ụlọọrụ a kpọrọ 'Ouch Concepts Limited' ma bụrụ onye Nkanu dị n'Enugwu steeti.

Frank Nweke Jr - APGA

Nweke bụ onye Ozalla Nkanu n'Enugwu Steeti.

Ọ bụbụ minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijiria n'oge Onyeisiala Olusegun Obasanjo na-achị.

Aha ụlọọrụ ya bụ 'Stellar Constellation Group'.

Chijioke Edeoga - LP

Chijioke Edoga bụ onye Nsukka dị n'Enuguwu steeti. Ọ nọọla mbụ n'ụlọ omeiwu nta n'okpuru pati PDP.

Ọ bụkwara kọmishọna na-ahụ maka gburu gburu idi mma, tupu ọ gawa Labour Party maka ịzọ ọkwa Gọvanọ.

Ọ bụ onye ọkaiwu.

Cajetan Eze - NNPP

Cajetan Eze bụ onye Ugwueme dị n'okpuruọchịchị Awgu dị n'Enugwu steeti na-azọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru otu NNPP.

Ọ bụ onye ji ego achụego ma bụrụkwa onye agụmakwụkwọ na-amasị nke uwku.

Ọ dị afọ 44.

Peter Ndubuisi Mbah - PDP

Bar. Peter Ndubisi Mba bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye Owoh dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti.

Mba nwe ụlọọrụ Pinnacle Oil and Gas nke na-ere mmanụ agbịdị.

Ya bụ nwaamadị bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu, n'ihi na o jibuola ọkwa dịka kọmishọna na-ahụ maka ego n'Enugwu ya nakwa "Chief of Staff" n'okpuru Gọvanọ Chimaroke Nnamani.

Pearl Ogochukwu Nweze - SDP

Pearl Ogochukwu Nweze bụ naanị nwaanyị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu steeti n'okpuru otu Social Democratic Party (SDP)

Nweze gụrụ 'Marketing' na Mahadum pụrụiche bụ Institute of Management and Technology dị n'Enugwu.

Ọ dị afọ 42.

Ugochukwu Edeh - YPP

Ugochukwu Bethel Edeh bụ onye obodo Ekulu Enugu dị n'okpuruọchịchị Enugu East n'Enugwu ma na-azọ ọkwa n'aha otu YPP.

O toro na Naịjirịa tupu ọ gawa mba Ofesi ebe ọ gbapere ụlọọrụ na-ere ụlọ nakwa ala ma bụrụkwa onyeisi ụlọorụ ọzọ na-enye nchekwa.

Ọ dị afọ 35 nke nwereike ịme na ọ bụ onye kachasị bụrụ nwata na-azọ ọkwa Gọvanọ a.

Elvis Ugwoke - ZLP

Elvis Ugwoke bụ onyeisiochei otu ZLP n'Enugwu steeti ma jiri kwa aha ha na-azọ ọkwa Gọvanọ.

Ugwoke gurụ akwụkwọ na Mahadum Abuja nakwa Mahadum Cape Coast dị na mba Gana.

O nwere ụlọorụ a kpọrọ Jacana Wine and Spirit Company. Ọ dị afọ 36

Ndị ọzọ gụnyere...

AA - OGBE CHUKWUNONSO DANIEL

AAC - OGBODO RAYMOND KENECHUKWU

ADC - MADUBUIKE OZOEMENA DONATUS

ADP - OMEJE NNAMDI

APM - IKENNA KENNETH ODOH

APP - ANI AFAMEFUNA SAMUEL

BP - OBIOMA NNAMANI NNAEMEKA

NRM - MAMAH CYRIL ELOCHUKWU

PRP - AGU CHRISTOPHER EJIKE