You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị uweojii akpụpụla nwaanyị a sị tigburu nwaodibo,tunye n'ọhịa ụlọikpe
Ndị uweojii Enugwu steeti akpụpụla otu nwaanyị ha nwụchiburu maka ebubo itigbu nwa odibo ya, tụnye ozu ya n'ọhịa n'Enugwu.
Ujunwa Ugwuoke gbara afọ 29, onye bi na Fidelity Estate, Okpara Avenue, Enugu kụrụ nwa ya na ya bi bụ Precious Dorshima buga ya ụlọọgwụ ebe ndị dọkịta gwara ya na nwata ahụ anwụọla.
O buru ozu nwata ahụ tunye n'ọhịa ma gbaga Abakaliki ebe ọ nọ zipu ozi na ndị ntọ tọọrọ ya, nwa ya nakwa nwa odibo ya si ka ha weta nde naira 20 n'isi otu onye .
Nwaanyị ahụ lọghachitere sị na ndị ntọ tọhapụrụ ya na nwa ya g ma gbagbuo nwa odibo ya.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe si kwuo n'ezie, nnyocha ha mere goziri na nwaanyị ahụ kụrụ nwata ahụ n'abalị asatọ nke ọnwa Novemba, afọ 2022, buga ya ụlọọgwụ "University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH), Ituku-Ozalla, maka nkleta ebe ndị dọkịta kwuru na nwa ahụ anwụọla.
"Mana oge ndị dọkịta nọ ọrụ gwara ya na ọ nwụọla o buru ozu ya ga tụnye n'ikebe a na-ekpofu ahịhịa n'okporoụzọ Ugbo-Nwagidi dị n' Enugwueze Uno-Ituku n'Okpuru Ọchịchị Ọgwụn'Enugwu Steeti." "Ọ gbagara Abakaliki dị n' Ebonyi State,si ebe ahụ zipụ ozi na a tọrọ ya na obere nwa ya nakwa nwa odibo ya n'abalị itoolu nke ọnwa Novemba, afọ 2023 ka ha si Independence Layout Enugwu alọta ebe ha gara ịgbata gaasị kpọrọ ha gaa ebe ọ maghị."
" Ọ sịkwara na ndị ntọ sịrị ya weta nde naira 20 n'isi ha n'otu n'otu."
" Mana ọ pụtara n'abalị 16 nke Ọnwa Novemba afọ 2023 , sị na ndị ntọ tọhapụrụ ya na obere nwa ya ma gbagbuo nwa nke nwụrụ anwụ."
Ndukwe kọwara na m=mkpesa ahụ mere ka ndị uweojii wega okwu ahụ nke dịbu n'ogige ha nke New Heaven wega ya na ngalaba ha na-ahụ maka na-ahịụ maka ntọ tupu ha wega ya na ngalaba na-ahụ maka ogbugbu mmadụ.
Cheta na n'ọnwa Disemba afọ 2022, nwanne nwata ahụ nwụrụ anwụ bụ James Achikpi Korshima tiri mkpu ka e nye ezinaụlọ ha ikpemkwụmọtọ dịka o boro ebubo na nne ukwu nwanne ya tigburu ya, tụnye ozu ya n'ọhịa.
James boro ebubo na onye ya amaghị onye ọ bụ ji ekwentị Ujunwa Ugwuoke kpọọ ya sị ya na ndị ntọ tọọrọ Ujunwa, nwaya nakwa Precious ma na agwa ya ka ya weta nde Naira 20.
Otu nwaanyị egbuola nwa odibọ ya tufuo ozu ya n'akụkụ ọhịa n'Enugwu
Akụkọ apụtala gbasara otu nwaanyị n'Enugu, a na-ebo ebubo igbu nwata nwaanyị dị afọ iri na-agbara ya odibọ, ma tufuo ozu nwata ahụ n'ime ọhịa.
Aha nwata a e gburu bụ Precious Korshima .
Nke a pụtara ihe dịka nna nwata ahụ e gburu egbu bụ Jerry B Achirkpi tiri mkpu na soshal midia na-akpọ oku ka ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyemaka.
Mazị Achirkpi kwuru na ọ bụ nwaanyị ahụ ya kpọnyere nwa ya ji ọnụ ya kweta na ọ bụ ya gburu nwata ahụ ma tụfuo ozu ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ya bụ ihe mere, mana nnyocha ka na-aga n'ihu.
Ihe merenụ...
Jerry B Achirkpi kwuru na ọ bụ n'ọnwa Maachị afọ 2022 ka otu nwaanyị aha ya bụ Ujunwa kpọọrọ nwa ya nwaanyị iji zụọ ya n'akwụkwọ, ka nwata ahụ nyekwara ya aka ilekọta nwa ọ mụrụ ọhụrụ.
"Nwa m na oriakụ Ujunwa nọ ruo ọnwa Nọvemba afọ a, mgbe mmadụ ji ekwentị Ujunwa kpọọ m ma kwuo na ha bụ ndị ntọ, na ha atọrọla Ujunwa na nwa ya nakwa nwa m nwaanyị, na anyị ga-akwụ nde naịra 20 iji tọhapụ ha" Achirkpi kọrọ n'akara Facebook ya.
"N'ụbọchị 15 nke ọnwa Nọvemba, ka nwanne Ujunwa kpọrọ m wee sị na atọhapụla ha. Oge m kpọrọ Ujunwa, ọ sị na ndị ntọ ahụ gbagburu nwa m Precious, ha sị m bịa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na New Heaven, Enugu."
Achirkpi kwuru na ọ bụ ka ụbochị olemole gachara ka Ujunwa kpọrọ ya ma saa asịsa na ọ bụ ya gburu Precious na-amaghị ama.
"Oge m jụrụ ya ebe ozu ya dị, ọ sị na ụjọ tụrụ ya o wee ga tụfuo ozu nwata ahụ n'ọhịa dị n'akụkụ okporoụzọ, n'obodo a na-akpọ Ituku Ozala."
Dịka Achirkpi si kwuo, ndị uweojii kwuru na oge ha garuru ebe ahụ, ha ahụghị ozu nwata ahụ, kama ha hụrụ ebe dịka ihe a kpọrọ ọkụ.
O kwuru na ndị obodo sị na ọ bụ eze ha nyere iwu ka a kpọọ ozu ahụ ọkụ n'ihi na ọ na-esi isi nke ukwuu.
Ihe ndị uweojii kwuru
BBC Igbo kpọrọ Daniel Ndukwe, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti, o wee kwuo na ya bụ ihe mere eme n'ezie.
Ndukwe kwuru na ha anwụchiela nwaanyị ahụ a na-ebo ebubo igbu nwatakịrị ahụ, mana nnyocha gbasara ya bụ okwu ka na-aga n'ihu.
"Ka ọ dị ugbua, anyị amatachabeghị kpọmkwem ihe niile merenụ," Ndukwe gwara BBC Igbo.
"Ọ bụ eziokwu na ya bụ ihe mere eme, anyị ejidekwala onye a na-ebo ebubo a, ọ nọ n'aka ndị uweojii ugbua.
"Mana nnyocha ka na-aga n'ihu. Ọ gaghị adị mma ịgwa ndị ntaakụkọ okwu ugbua n'ihi na anyị emechabeghị nnyocha."
Ndukwu kwuru na ọ bụ eziokwu na ha achọpụta ụfọdụ ihe gbasara akụkọ a, mana ha agaghị ekwupụta ya ruo mgbe ha mechara nnyocha.
Naịjirịa nwere iwu megidere imekpa ụmụntakịrị ahụ
E nwere iwu a na-akpọ 'Child's Right Act' nke e wepụtara n'afọ 2003, ma megharịa ya na 2015, nke machiri imekpa ụmụntakịrị ahụ n'ụzọ ọbụla maọbụ ịnapụ ha ohere ịgụ akwụkwọ.
Dịka iwu a si dị, onye bụ nwata bụ onye ọbụla na-erubeghị afọ 18.
Steeti 24 n'ime steeti 36 dị na Naịjirịa etinyekwala iwu a na steeti ha dị icheiche, ebe steeti 12 etinyebeghị ya.
N'otu aka ahụ kwa, Naịjirịa so n'otu n'ime mba ndị binyere aka na nkwekọrịta nke otu mba ụwa maka ikike dịịrị ụmụaka nke a na-akpọ ' United Nations Convention on the Rights of the Child'.
Iwu ndị a kwuru na nwata ọbụla nwere ikike dị icheiche nke gụnyere: ikike ibi ndụ zuru ọke, ikike inwe aha, ikike inwe ezinụlọ, iki igwuri egwu, ikike ahụike, ikike agụmakwụkwọ, ikike inwe nkwanye ugwu (dignity), na ndị ọzọ.
Mana n'agbanyeghị iwu ndị a, akụkọ mmekpa ahụ ụmụaka na-apụtakwa kwa mgbe kwa mgbe na Naịjirịa, ọtụtụ oge ndị a na-emekpa ụmụaka ahụ anaghị enweta ntaramahụhụ ọbụla.
N'ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba a, ndị uweojii kwuru na ha nwuchiri otu nwaanyị na Plateau Steeti onye e boro ebubo itigbu nwa odibọ ya dị afọ 11.
Ọzọkwa mere n'ọnwa Ọktoba bụ na ngalaba NAPTIP nwụchiri otu nwaanyị tigburu nwanwa ya na Nibo, Anambra steeti.
NAPTIP bụ aha ịchafụ maka 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons', ọrụ ha bụ igbochi ịtụ mgbere mmadụ na Naịjirịa.