You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe niile anyị ma maka ebubo ntigbu Chidiebere Iloka
Gọọmentị Anambra steeti esepula aka ha na nchọpụta ọbụla nke na-efegharị na soshal midia gbasara ọnwụ nwada Chidiebere Jane Iloka nke e boro ebubo na ọ bụ di ya gburu ya.
N'akwụkwọ ọkaikpe steeti ahụ bụ Syvia Chike Ifemeje na Kọmishọna ahụike steeti ahụ bụ Afam Obidike tinyere aka, gọọmentị steetị ahụ sị na emechebeghị ya bụ nchọpụta ahụ tupu ya bụ ozi amalite ifegharị na soshal midia.
Gọọmentị sị na ha nwere mmadụ abụọ n'ime ndị so eme ya bụ nchọpụta ma kwukwa na ha na-enyo ndị ezinaụlọ Mbazulike Iloka enyo maka etu ha si akwọchapụ aka ha na ya bụ okwu.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Gọọmentị si na ha agwala ndị uweojii steeti ahụ ka ha nyoba anya na ya bụ ikpe.
Okwu ndị a so na akwụkwọ arịrọ ezinaụlọ Chiebere zigaara ndị uweojii ma kwugharị ihe niile nakwa ebubo niile ha boro Iloka.
Ozi gọọmentị kọwara na ha nwere ọtụtụ ihe aka ebe gosiri na a na-amanye ezinaụlọ Chidiebere ka ha kwugharị ihe ndị ha kwuburu maka ọnwụ ya.
Ha dere "anyị chọpụtara na a na-eyi ụfọdụ ndị ezinaụlọ Chidiebere Iloka egwu".
Akwụkwọ nnyocha ndị dọkịnta mere nke ezịnaụlọ Chidiebere zịpụtara na ngwụcha kwuru na ọ bụghị intigbu ka etigburu ya ma na ọ bụ ọnwụ chi ya ka ọ nwụrụ.
Mana gọọmentị Anambra kwusiri ike na ndị dọkịnta abụọ ha zigaara n’okwu nnyocha ọnwụ Chidiebere na nke ndị ezinaụlọ Iloka kpọtara enweghị kwenye maọbụ mkpebi n’akwụkwọ ahụ malitere na-efesa nke kwuru na Chiebere nwụrụ ọnwụ chi ya.
Kedụ ka okwu a siri malite?
Akụkọ etu nwaada Chidiebere Jane Iloka siri nwụọ ka bụ ihe na-agbagwoju ọha anya n’ihi ebubo kwuru ebubo so ọnwụ ya.
N’etiti ọnwa Ọgọọstụ, akụkọ dapụtara na nwaada Chidiebere anwụọla maka ebubo so ya nke ezịnaụlọ ya nọ n’isi ya mgbe ahụ bụ na di ya bụ Mbazulike Iloke gburu ya.
Mbazulike Iloka bụ onyeisisoche 'Transitional Caretaker' nke so na ndị Gọvanọ Chukwu Soludo họpụtara mgbe ọ malitere ọchịchị.
Ebubo a mere gọọmentị steeti ahụ jiri kwụsịtụ Iloka ọrụ nwa mgbe nta dịka a malitere nnyocha n’okwu etu nwaada Chidiebere siri nwụọ.
Ha kwuru na ha mere nke a maka akụkọ so ọnwụ nwunye ya bụ Chidiebere Iloka dịka e dubanyechara Mbazulike n'iyi ọrụ ịbụ onye nnọchite anya okpuruọchịchị Nnewi North dị n'Anambra steeti.
Mkpebi a dị n'akwukwọ ozi onye ozi ministri maka okpuruọchịchị, ichi echichi nakwa ime obodo bụ Tony Collins Nwabunwanne binyere aka.
Ozi ahụ kwuru na nkwụsị ọrụ Mbazulike ga-amalite bido n'ụbọchị August 12, 2022 dịka a na-eme nyocha etu nwunye ya si nwụọ.
Ndị ezinaụlọ Nwaada Chidibere zigaara ndị uweojii akwụkwọ ebubo na ọ bụ di ya kugburu ya.
A nwụchịrị Iloka dịka a malitere nnyocha n’okwu a nọ n’isi ya.
Ihe ezịnaụlọ nwaada Chidiebere kwuru ma kwugharịa
Dịka akụkọ dapụtara n’ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọọst na nwaada Chidiebere nwụrụ, ezinaụlọ so na ndị kwuru hoo haa na ọ bụ di ya kugburu ya. Nwanne nwoke Chidiebere zịgaara ndị uweojii akwụkwọ boo ebubo na ọ ma na ọ bụ Iloka kugburu nwanne ya nwaanyị bụ Chidiebere.
Akwụkwọ ozi ya kọwara na ọ bụghị taa ka Iloka malitere itikasi ma na-emekpa Chidiebere ahụ.
O dere “Maazị Mbazulike Iloka bụ onye a ma ama n’iti nwunye ya ihe aghara aghara dịka ezinaụlọ ya dọọrọla ya aka na nti ugboro ugboro maka nke a mana ọ kweghị kwụsị ihe a na-eme”.
Ka ọtụtụ ụbọchị gachara, ezinaụlọ Chiebere pụtara kwugharịa ihe niile ha kwuru ma zịgara ndị uweojii akwụkwọ na-arịọ ka atọhapụ Iloka ma na-ekwu na aka ya dị ọcha n’ọnwụ Chidiebere.
Ha kwuziri na Chiebere nwụrụ ọnwụ chi ya.
Cheta na ihe onyonyo ebe ebu ozu nwunye Mbazulike Iloka bidoro wuwe na soshal midia n'ọnwa Ọgọọst.
N'ime onyonyo ahụ, ndị mmadụ nọ na-ese ozu nwaanyị ahụ foto dịka a hụchara ọnya ka dị ndụ .
Ụfọdụ mmadụ depụtekwara n'akara soshal midia ha ma na-ebo Mbazulike onye e ji Mba Mba mara ebubo na ọ bụ nkugbu ka ọ kụgbụrụ nwunye ya.
A na-echezi ka ndị uweojii na ndị dọkịnta nwee mkpebi n'okwu ọnwụ Chiebere.