Ihe Ụmụada Ngwo mere nwaanyị pịara nne ya bụ agadị ihe

Dịka ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midia nke gosiri ebe otu nwaanyị na-apịa agadị nwaanyị ihe.

Akụkọ na-ekwu na ya bụ ihe mere na Ngwo, Enugwu Steeti.

Ihe onyonyo ọzọ kwa na-egosi ebe ụmụ nwaanyị gara njem n'otu ụlo ebe ha sị ya bụ ihe mere, úmụnwaanyị a kpọro onwe ha "Ụmụada Ngwo".

Ihe onyonyo a gosiri ebe akpọpụtara otu nwaanyị onye ha sị bụ nwaanyị egosiri n'ihe onyonyo na-eti agadi nwaanyị a sị bụ nne ya ihe.

Ya bụ nwaanyị gburu ikpere n'ala were rịọ agadị nwaanyị a mgbaghara.

Ụmụ nwaanyị ndị a kpọro onwe ha Ụmụada n'ihe onyonyo a soro rịọkwa agadị nwaanyị ahụ mgbaghara.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwụ steeti bụ Daniel Ndukwe n'ekwe ntị ya maka ihe onyonyo ndị a na-efegharị kama ọ zaghị, e zịgakwara ya ozi n'ekwe ntị ya mana ọ zabeghị.