Ekwekwala ka onye nọ na Finland nọrọ ebe ahụ na-emetọrọ anyị ala - Hilda Dokubo

Omee ejije Nollywood bụ Hilda Dokubo etinyela ọnụ n'okwu gbasara nọrọ n'ụlọ nke ndị Igbo na-anọ n'oge a.

Na mkparịtụka Dokuba na BBC Igbo nwere, ya bụ onye na-azọ ọkwa oche n'ụlọomeiwu nta nke gọọmentị etiti n'okpuru Labour Party dọrọ ndị igbo aka na ntị ka ghara ikwe ka onye ọbụla bata n'ala Igbo mebie ala Igbo.

Ọ rịọrọ ka onye ọbụla dị njikere ma ghara ikwe ka onye ọbụla ghọrịa ha nke ga-abụ 'ụbọchị ntuliaka, ndị Igbo anọrọ n'ime ụlọ ghara ịpụta.

O kwuru na Igbo nwere ihe niile ha ga-eji edozili obodo ma ọ bụrụ na ndị Igbo ga-etinye uchu ghara ikwe ka onye ọbụla megharịa ha anya.

Nke a na-abịa dịka Simon Ekpa bụ onyeisi ndị otu a kpọrọ 'Auto Pilot' nke ndị IPOB mara iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ abalị ise.

Dokubo kwuru na ụdị ihe a adịghị ntị ọnụnụ atụmadụ na onye na-enye ụdị iwu a anọghịdị na Naịjirịa cha cha.

Kirie ihe niile o kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.