You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anyị niile na-ata ahụhụ nsogbu Naịjirịa ugbua - Yusuf Datti Baba-Ahmed
Na mkparịtaụka Yusuf Datti Baba-Ahmed na BBC Igbo nwere n’ụbọchị Fraịde, o kwuru ihe mere o jiri kwete isonye Peter Obi dịka osote ya.
Cheta na n'ụtụtụ Fraịde na otu pati Labour Party họpụtara Ahmed dịka onye ga-abụ osote Peter Obi nke na-azọchịtere ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.
Na mkparịtaụka a, Ahmed kọwara na ya na Obi arụọla ọrụ Bekee nakwa ọrụ ọchịchị ruo oge tere aka nke bụ na ha abụọ amụtala ọtụtụ ihe dị mkpa banyere ọrụ mkwalite akụnaụba nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa n'ọchịchị.
O kwuru: ‘Mpaghara Naịjrịa ebe m si adịghị mkpa, ihe ka mkpa bụ amamihe m nakwa ọrụ m nwereike ịrụ’
Ọ gara n'ihu kwuo na okpukperechi nakwa agbụrụ mmadu si abụghị ihe kacha mkpa n'ọchịchị.
Ọ nyere ọha ndụmọdụ ka ndị mmadụ wepụ anya ma kwụsị okwu ịkpa oke agbụrụ na nke okpukperechi dịka enweghị uru ihe ndị a bara na ihe gbasara ọchịchị nakwa ihe onye ọchịchị nwereike ime.
Ahmed rụtụrụ aka na nsogbu ndị na-echere Naịjirịa aka mgba n’oge a nke gụnyere enweghị nchekwa, mefuo akụnụba Naịjrịa n’aka ndị ọchịchị nakwa ihe ndị ọzọ.
Ọ kọwara na ya na Obi nwere atụmatụ ọma ga-agbapụta Naịjirịa n’aka ihe ndị a.
Dịka Obi kwuru n'oge gara aga, Ahmed kwupụtara ihe mere o jiri si pati People’s Democratic Party (PDP) pụọ.
Ọ kọwara na dịka onye ịkwụwa aka ọtụ na-adị mma, na ọ pụrụ pati ahụ n’ihi ọ chọghị isonye kwụọ ndị ‘Delegates’ ego aka azụ ka ha tụnyere ya vootu.
O kwuru na agwa a bụ agwa jọọ.
Gere ihe o kwuru n’ihe onyonyo a.
End of Akụkọ ndị ọzọ banyere Peter Obi ga-amasị gị
Ihe ikwesịrị ịma maka nhọpụta Yusuf Datti-Ahmed
Mazị Peter Obi, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Party' ahọrọla Yusuf Datti Baba-Ahmed dịka osote ya.
Nke a mere taa n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ nke ndị isi 'Labour Party' haziri n'Abuja taa bụ Fraịde.
Cheta na Peter Obi tinyeburu aha Doyin Okupe, bụbụ onye enyemaka onyeisiala Olusegun Obasanjo, dịka osote ya, mana Okupe degaara ngalaba Inec akwụkwọ iji gwa ha na ya ewepula onwe ya n'ọkwa ahụ.
Iwu ntuliaka Naịjirịa kwadoro ịgbanwe aha onye ga-azọ ọchịchị ma ọ bụrụ na onye ahụ were aka ya wepụ onwe ya.
Eji m obi m niile nabata nhọpụta a - Datti-Ahmed
N'okwu ya dịka Peter Obi họpụtachara ya, Yusuf DattiAhmed kwuru na ya ji obi ya niile nabata nhọpụta ya.
"N'obi umeala niile, nakwa na ntụkwasị obi n'ebe Chineke nọ, anabatala m nnukwu ọrụ a dị mkpa ị bụ onye ga-eso zọọ ọkwa osote onyeisi ala Naịjirịa na 'Labour Party," Datti-Ahmed kwuru.
"Abụ m onye nọ na ngalaba mmụta na agụmakwụkwọ, ya bụ ama m ihe dị mma, marakwa onye nwere ọ chị ma m hụ ya."
"Mgbe Peter Obi kwuru na ụbara ala niile dị na mpaghara Ugwu Naịjirịa bụ mmanụ agbịdị ọhụrụ Naịjirịa, ka m chọpụtara na Obi bụ onye e kwesịrị ige ntị."
"Aga m agba mbọ ole ike kwere m inyere ya aka ka anyị zọpụta obodo anyị Naịjirịa."
Ihe i kwesịrị ịma maka Yusuf Datti-Ahmed
Yusuf Datti_Ahmed bụ onye Kaduna Steeti ka nọ na-agbata afọ iri anọ n’isii na iri anọ na asatọ.
Ọ bụbu onye nnọchite anya ndị Kaduna North n’ụlọomeiwu nta n’afọ 2003 ruo 2007.
Bụrụkwa onye nnọchite anya n’ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa n’afọ 2011 ebe ọ weputere ezigbo atụmatụ dicha mma bụ nke ọ ji ọkọlọtọ Congress for Progressive Change (CPC) nweta.
Datti-Ahmed nwere nzere anọ dịka BSc na MSc na Economics bụ nke ọ nwetere na Mahadum Maiduguri, nweekwa nzere MBA nke ọ nwetere na Mahadum Wales, Cardiff n’afọ 2006.
O nwetakwara nzere dịka ọkammụta na Mahadum Westminster.
Mgbe ọ fechara ala nna na Mahadum ọrụugbo n’Abeokuta, Ogun steeti, ọ rụrụ ọrụ na Base Research and Data Services Ltd, rụkwaa na Nigerian Security Printing and Minting Company, Lagos. Ọ rụkwara na First Bank of Nigeria n’agbata afọ 1997 ruo 1998, mechaa lọghachite azụ na Baze Research and Data Services Ltd ebe ọ bụ onyeisi n’agbata afọ 1999 ruo 2003.
N’afọ 2011 Baba-Ahmed hiwere Mahadum Baze n’Abuja, Nigeria iji nyeaka hazie agụmakwụkwọ mebiri emebi na Naịjirịa.
A ma Datti-Ahmed dịka onye nwere obi ebere na-enyere ndị mmadụ aka nkere o jiri rụọ ụlọakwụkwọ sekọndiri abụọ nke ihe ruru ụmụakwụkwọ 4,000 na-agụ akwụkwọ. Ha a zụpụtala ihe ruru mmadụ 6000 ruo taa.
Na 2015, a mere ya onyeisi ndị isi ( Baze Research and Data Services Ltd) ndị National Youths Service Corps (NYSC) nakwa Hope Alive Foundation na-ahụ maka ọdịmma ndị nkwarụ.