Ana m eji ọkụ na mgbọrọgwụ agwọ mkpọnwụ ahụ - Ezekwueche

Aha onyonyo, Ana m eji ọkụ na mgbọrọgwụ agwọ mkpọnwụ ahụ - Ezekwueche
Ana m eji ọkụ na mgbọrọgwụ agwọ mkpọnwụ ahụ - Ezekwueche
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Monday Idara
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Dibịa mgbọrọgwụ na-agwọ ọrịa mkpọnwụ ahụ bụ Ezekwueche akọwaala na ọ bụ ọkụ ka o ji agwọ ndị mmadụ mkpọnwụ ahụ.

Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche, Ezekwueche kwuru na ihe mere o ji eme nke a bụ n'ihi na ya kwenyere na ịgba ndị nwere mkpọnwụ ahụ ọgwụ na-egbu akwara ha.

"Ana m eji ọkụ agwọ ọrịa, ee. Ọ bụ ọkụ ka e ji agwọ ọrịa mkpọnwụ ahụ. Ọ naghị amasị m ịgba mmadụ ọgwụ. Ị na-egbu akwara onye ahụ ma gị na-agba ya ọgwụ. Ị ga-eji ihe ndị na-akwalite ahụike dịka akwụkwọ nri na anụmanụ. Ọ bụ ya ka e ji agwọ ọrịa," ka o kwuru.

Ka o sinadị, Ezekwueche sịrị na ọ bụrụ onye nwere ọbara mgbali elu maọbụ ọrịa shuga, ọ na-agwa ha gaa ụlọọgwụ ka ndị ọkachamara lebara ha anya.

"Anaghị m agwọ ọrịa shuga. Gaa n'ụlọọgwụ. Ọ bụrụ na i nwere ọbara mgbali elu, aga m asịkwa gị gaa n'ụlọọgwụ," ka ọ kọwara.

Ụfọdụ ndị nwere ọrịa mkpọnwụ ahụ gbara akaebe na ha na-enweta onwe ha nke ọma site n'ọkụ na mgbọrọgwụ Ezekwueche ji na-agwọ ha ọrịa.

"Enwere m ọrịa mkpọnwụ ahụ kemgbe ihe karịrị otu afọ ugbua. Ọkụ ahụ na-agbaze ọbara ọjọọ dị n'ahụ, ka aka maọbụ ụkwụ gị dịkwa mma ọzọ. Ha anaghị ewetara mmadụ ihe mgbu."

Ka ọ dị, ha kwuru na ọ kachasị mma mmadụ ịbịa ozugbo o nwere mkpọnwụ ahụ, n'ihi na o na-enye aka ka onye ahụ gbakee ngwangwa.

Otu n'ime ha sịrị: "Ana m enweta onwe m nke ọma. Ọ bụrụ na m bịara oge ahụ o mere m, agaara m adịchaala mma ugbua, mana abịaghị m. Ọ bụ eziokwu na ndị bịara oge ha nwere mkpọnwụ ahụ agbakechaala ma laa n'ụlọ ha."

Ka o sina dị, otu onye ọkachamara bụ Dọkịta Temitope Farombi kọwara na a naghị eji ihe na-ekpo ọkụ agwọ ọrịa mkpọnwụ ahụ n'ihi na o nwereike gbaa mmadụ ọkụ ma butere onye ahụ nnukwu ihe mgbu.

"Ọ dị mkpa ịga n'ụlọọgwụ, gakwuru onye ọkachamara na-ahụ maka mkpọnwụ ahụ n'oge, ọkachasị n'ime elekere anọ mmadụ nwere mkpọnwụ ahụ. Nke a ga-enyere dọkịta aka inye onye ahụ ọgwụ ga-agbaze ọbara ndị kpụkọrọ ọnụ na-egbochi ọbara ịgaru n'ụbụrụ, maọbụ, ọ bụrụ na onye ahụ na-agba ọbara, ọ ga-enye aka gbochie ya, ma gbochiekwa mmetụta ọnọdụ ahụ ga-ebute n'ụbụrụ," ka Dọkịta Farombi kọwara.