'Glaucoma' napụrụ m anya m mana ọ napụghị m olu m - Chris Vic
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
Christian Victor a maara nke ọma dịka Chris Vic bụ nwaafọ Akwa Ibom na-agụ egwu ma na-etikwa egwu, onye a malitere ịnụ aha ya ka ọ gachara otu ịmaaka a haziri na Naịjirịa.
Oge ya na BBC na-enwe mkparịtaụka na nso nso a, Chris Vic kpughere na ya kpuru isi oge ọ dị naanị afọ ise, n'ihi ọrịa anya a kpọrọ 'glaucoma' n'asụsụ Bekee.
O kwuru na ya nwere ọnatarachi ịgụ egwu kemgbe nne na nna ya mụrụ ya, mana ọ bidoro iwulite ya kemgbe afọ 2018.
Dịka nwaokoroọbịa ahụ siri kwuo, ndị mmadụ na-eleda ya anya ọtụtụ oge, mana site na ntụkwasịobi o nwere n'ime onwe ya, ọ naghị ekwe ka nke ahụ mee ka mmụọ ya daa mba.
Chris Vic kpughere na ihe ọ na-eme ugbua bụ ịchịkọta ụfọdụ egwu ndị ọ ga-ewepụta oge na-adịghị anya.
O mekwara ka a mata na ya na-enwe ụjọ ma ya na-agụ egwu n'ọha oge ụfọdụ n'ihi na ọ na-atụ ụjọ igwe mmadụ.
"Oge ụfọdụ ha na-ajụ ihe mere m ji atụ ụjọ igwe mmadụ ebe ọ bụ na anaghị m ahụ ụzọ, ha sị na ọ bụ naanị onye na-ahụ ụzọ nwereike ịtụ ụjọ igwe mmadụ. Nke ahụ abụghị eziokwu, etu i nwereike isi nwee mmetụta ndị nọ gị n'akụkụ bụkwa otu ihe dịka ịhụ ha anya," ka ọ kọwara.
Mana o kwuru na ngwangwa o nwetara onwe ya, ihe niile na-adị mma.
Chris Vic mere ka anyị mata na o nwere ihe omume ọ malitere n'ụlọakwụkwọ ọ gara n'Akwa Ibom.
Ọ sịrị na "nke ahụ bụ ụzọ m si ekele ụlọakwụkwọ ebe m malitere n'Uyo ebe a. Ana m alaghachi ebe ahụ inye ha obere ihe m nwere."




