You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nke bụ eziokwu maka ihe mere n'Ihiala n'ụbọchị Fraịde
Ihe onyonyo malitere ifegharị na mgbede ụbọchị Fraịde gosiri ebe ndị amaghị ndị ha bụ nọ n'ụgbọala buru egbe.
Ihe ọzọ a dịkwa n'onyonyo ahụ bụ na n'ime ụgbọala ise ahụ o nwere otu n'ime ha bụ ozu ndị mmadụ.
Ndị ahụ bukwa egbe na-agbapụ mgbọ n'ime ihe onyonyo ahụ dịka ndị mmadụ na-aṅụri, na-eti mkpu.
Akụkọ kwukwara na ọ bụ n'Ihiala ka esetere onyonyo ahụ ebe ndị ahụ na-agafe.
BBC kpọtụrụ otu nwoke bi n'Ihiala iji jụpụta ya nke mere.
O kwuru na n'ezie ihe dị etu a mere ma kwuo na ọ bụghị nso n'ụlọụka pụtara n'onyoyo ahụ ka ihe mere
Ọ sị "Ụlọụka ahụ dị n'ụzọ si Onicha gawa Owerre, ya mere o ji pụta n'ihe ahụ esere ese"
"Ihe anyị nụrụ bụ na ọ bụkwa ndị unknown gunmen na Ebubeagu kwara mgbọ e ji gbagbuo ọtụtụ ndị mmadụ" ka o kwuru
O kọwara na ọ maghị mmadụ ole nwụrụ n'ebe ahụ nakwa otu ha so na ya.
Nwoke ahụ sịkwa na ọzọ mekwara n'Ihiala n'ụtụtụ ụbọchị Satọde ebe yi uweojii bụ ụgbọala ojii pụtara n'ebe akpọrọ 'Total' na-agbapụ egbe na nkịtị.
"A hụrụ m ebe nke a mere, ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ" ka o kọwara.
Ndị uweojii na steeti si n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga zipu ozi na-ekwu na ndị uweojii kwụ chịm n'Ihiala.
Ọ sị "ọ bụ otu ndị ekperima abụọ kwatara ya ma gbuo onye akpọrọ Innocent Obieke a ma dịka 'Double Lion' nakwa mmadụ atọ ndị ọzọ".
"Double Lion" bụ onye ndị uweojii na chọ kemgbe maka ebubo ịwakpo ndị ọrụ nchekwa nakwa ngalaba gọọmentị dị icheiche ka ndi uweojii kwuru.