Ihe anyị ma gbasara ụmụaka 12 ndị uweojii napụtara na Ngor Okpala dị n'Imo steeti

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwaanyị dị afọ iri anọ na abụọ aha ya bụ Ann Ngozi Enyenwa, onye Umudim Ohekelem dị n'okpuru ọchịchị Ngor Okpala, a na-enyo enyo na ọ na-ezu ohi ụmụaka.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n'ozi o mere ka o ruo anyị aka.
Okoye kwuru na ndị uweojii napụtakwara obere ụmụaka iri na abụọ a na-enyo enyo na nwaanyị ahụ zuru n'ohi.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ bụ n'okporoụzọ si Owere gawa Aba ka ndị uweojii nọọrọ nwụchie nwaanyị ahụ ma napụtakwa ha bụ ụmụaka n'ụbọchị 20 Juun 2025.
Ndị uweojii kwuru na ọnọdụ ahụ mere ka ha nyopuo otu ndị na-ere ụmụaka, bụ ndị na-atọrọ obere ụmụaka ma kpọgaa ha Aba dị n'Abịa steeti maka ịrịọ arịrịọ n'okporoụzọ.
"Oge anyị nwụchiri ya, anyị chọpụtara ụfọdụ ụmụaka ọnọdụ ha adịchaghị mma ha na nwaanyị ahụ so. Nke ahụ mere ka anyị malite inyo ya enyo," ka Okoye kwuru n'ozi ahụ.
Ọ gara n'ihu sị: "N'ihi nke a, anyị nyefere okwu ahụ n'aka ngalaba ndị uweojii IGP X-Squad maka ime nnyocha miri emi".
"Oge a na-agba ya ajụjụ, nwaanyị ahụ a na-enyo enyo kwupụtara na ya tọọrọ ụmụaka ndị ahụ na Ngor Okpala dị n'Imo steeti ma kpọrọ ha gaa Aba dị n'Abịa steeti, ebe ọ na-amanye ha ịrịọ arịrịọ n'okporoụzọ".
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Nwaanyị ahụ gara n'ihu kpughee na ya na-ezigara ụlọ ụmụ enweghị nne Shalom Motherless Babies Home dị n'Okenyi, okpuru ọchịchị Etche dị na Rivas steeti ihe ndị ha rịọtara n'arịrịọ."
Ndị uweojii napụtara obere ụmụaka dị agbata afọ ise na afọ iri na atọ oge ha nwụchiri Ngozi Enyenwa.
Ụmụaka ndị ahụ gụnyere Favour Madufor dị afọ iri na atọ, Ugochi Pius dị afọ iri na atọ, Chinedu Mmaduenyenwa dị afọ iri na otu, Chinyere Nnaralaeze dị afọ iri, Chinonso Paul dị afọ iri, Chinaza Madufor dị afọ iri, Favour Timothy dị afọ iri, Ifeanyi Pius dị afọ itoolu, Gospel Chibuike dị afọ itoolu, Nneoma Timothy dị afọ itoolu, Solomon Ihechi Chibuike dị afọ asaa na Promise Mmaduenyenwa dị afọ ise.
Ya bụ ozi mere ka anyị mata na ụmụaka ahụ niile bụcha ndị si n'okpuru ọchịchị Ngor Okpala dị n'Imo steeti.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-elekọta ụmụaka ahụ n'ụlọọrụ ha dịka ha na-agbakọrọ ụlọọrụ ndị ọzọ aka iji chọpụta ndị nwe ha ma nyefee ha n'aka ezinaụlọ ha.
Ihe ndị ndu obodo na Ngor Okpala kwuru

Ebe foto si, Imo State Police Command
Oge BBC News Igbo kpọtụụrụ otu onye ndu ndị ntoroọbịa na Ngor Okpala bụ Samuel Obinna Achor, o kwuru na ya nụrụ akụkọ ahụ mana ya amalitela ime nnyocha kemgbe ụnyahụ iji mara ma ọ bụ eziokwu.
O kwere nkwa na ya ga-akpọghachi ụlọmgbasa ozi BBC ma e mesịa iji gwa anyị ihe ọ chọpụtara.








