Asuu Strike: Lee ndị abụbụọrụ Asuu baara uru na ndị ọ ghọrọ ahịa

Ọgbakọ Asuu na gọọmentị

Ebe foto si, Channels TV

N'ụbọchị Fraịde, abalị iri na anọ nke ọnwa Ọkụtoba ka otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ 'Academic Staff Union of Universities' kagburu abụbụọrụ ha malitere n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

Mana onyeisi Asuu bụ Emmanuel Osodeke na-ekwu na nkwụsị ha kwụsịrị abụbụọrụ ha esighi ha n'obi, kama ọ bụ iji rube isi na mkpebi ụlọikpe.

Cheta na ọ bụ ụlọikpe mkpegharị nyere Asuu iwu ka ha laghachi azụ n'ọrụ ha dịka mkparịtaụka ha na gọọmentị ka na-aga n'ihu.

Mana kedu ndị a ga-asị ritere uru n'abụbụọrụ ọnwa asatọ a? Kedukwanụ ndị ọ ghọrọ ahịa?

1) Gọọmentị Naịjirịa

Gọọmentị

Ebe foto si, Nigeria Govt

Gọọmentị Naịjirịa bụ ndị mbụ a ga-asị na ha meriri n'esemokwu a dapụtara n'etiti ha na ndị Asuu.

N'oge mbụ, Asuu na-eji abụbụọrụ ha amanye gọọmentị imere ha ọtụtụ ihe nke gụnyere ibuli ụgwọ ọnwa ha nakwa iwelite aka n'ego a na-enye maka ọdịmma mahadum.

Mana na nke a, gọọmentị ekwenyeghị chaachaa n'ihe Asuu na-ekwu.

Chetakwa na ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndịọrụ bụ Chris Ngige kpụpụrụ Asuu ụlọikpe nke mere ya bụ okwu ji dị ka o si dị ugbua.

2) Ndị otu CONUA na NAMDA

Conua na Namda

Ebe foto si, Ministry of Labour

Nkọwa foto, Gọọmentị Naịjirịa nabatara otu Conua na Namda dịka abụbụọrụ ndị Asuu na-aga n'ihu

Dịka abụbụọrụ ndị ASUU na-aga n'ihu, otu ndị nkuzi abụọ a kpọrọ 'Congress of Nigerian University Academics' (CONUA) na 'National Association of Medical and Dental Academics' (NAMDA), nwetara nnabata n'aka gọọmentị etiti.

Otu abụọ a bụ Conua na Namda abụghị otu ọhụrụ, kama gọọmentị anabatabughị ha n'ihi na Asuu na-ahụta ha dịka ndị nnupu isi.

Mana ugbua, otu abụọ a abụrụla otu tozuru etozu n'iwu Naịjirịa.

A ga-asị na Conua na Namda so na ndị ritere uru n'abụbụọrụ Asuu nke afọ a.

3) Ndị ASUU

Asuu

Ebe foto si, Nigerian Govt

Ọ bụrụ na e lee anya etu abụbụọrụ a si malite, ogologo oge o werela, na etu o si bịa n'isi njedebe, a ga-asị na ọ ghọrọ ndị Asuu ahịa.

Emmanuel Osodeke bụ onyeisi Asuu na-ekwu na gọọmentị ebinyebeghị aka na nkwekọrịta ọbụla ha na ha nwere, nke pụtara na abụbụọrụ ha amịtabeghị mkpụrụ.

Ọzọkwa, gọọmentị na-ekwusi ike na ha agaghị akwụ ndị Asuu ụgwọ maka ọnwa asatọ ha arụghị ọrụ.

Nke a bụ iji gbasoo usoro nke bekee kpọrọ 'no work, no pay'.

N'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa a, ọtụtụ ndị nkuzi mahadum anọrọla na nnukwu ihe isi ike.

Na mahadum Calabar, ndị nkuzi ruru 10 n'ọnụọgụgụ anwụọla n'ime ọnwa asatọ a ndị Asuu nọ abụbụọrụ.

O doghị anya kpọmkwem ma ọ bụ ihe isi ike si na-akwụghị ụgwọ ọnwa a butere ọnwụ ndị nkuzi a.

4) Ụmụakwụkwọ Mahadum

Ụmụnwaanyị

Ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịa bụ ndị a ga-asị na ha kacha nweta ọghọm n'ime ọnwa asatọ a ndị Asuu gbara abụbụ ọrụ.

Chikwado Onwuamaeze, onye nọ n'afọ nke atọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka kwuru na ọnwa asatọ lara ya n'iyi.

"Oge niile ka mụ na ndị ezinụlọ m na-enwe nghọtahie n'ihi na anọ m n'ụlọ kwa ụbọchị," Onwuamaeze kwuru.

"Ka ọ dị ugbua, ike ịgụ akwụkwọ agwụla m, isi m anaghị anabatakwa akwụkwọ ọbụla. Ihe kaara mụ mma ugbua bụ itinye uche n'egwu m chọrọ iti."

Ihe ọ na-ewe iju si n'otu afọ akwụkọ banye n'ọzọ na mahadum bụ ọnwa asatọ; nke a pụtara na otu afọ akwụkwọ efulahụla ụmụakwụkwọ mahadum Naịjirịa.

5) Ndị na-azụ ahịa na mahadum

Ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Ewepụ agụmakwụkwọ, ogige mahadum ọbụla bụkwa ebe a na-enwe ọtụtụ ụlọahịa ebe ụmụakwụkwọ na-azụrụ ihe.

Ihe a na-ere n'ụlọahịa ndị a gụnyere ihe oriri, akwụkwọ, na ọtụtụ ihe ndị na-emebi emebi.

Iji maa atụ, ndị nwere mmanya ọtọ bịrịbịrị, maọbụ ụdị achịcha bekee dị icheiche ha na-ere ere, ga-enwe nnukwu ọghọm n'ihi na ụfọdụ n'ime ha nwereike imebila.

Ụfọdụ ndị ji ego mbite azụ ahịa ga-enwekwa ọghọm n'ihi na onweghị ahịa ọbụla ha zụrụla n'ime ọnwa asatọ a Asuu gbara abụbụọrụ.