"Ihe ruru ndị otu anyị iri anwụọla kamgbe a malitere 'Asuu strike'

Ebe foto si, UNICAL
Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum bụ 'Academic Staff Union of Universities' (Asuu) nke mahadum Calabar ekwuola na ndị otu ha ruru mmadụ iri anwụọla kamgbe Febrụwarị ruo ugbua.
Onye kwuru nke a bụ onyeisi Asuu na Unical bụ Ọkammụta John Edo na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ekwentị n'ụbọchị Wenezde.
Ọkammụta Edo kwuru na n'ime ndị a nwụrụlanụ, isii bụ 'professor' ebe anọ ndị ọzọ bụcha 'Doctor'.
N'okwu ya, Ọkammụta Edo na ọ bụ eziokwu na gọọmentị etiti akwụbeghị ha kama otu naịra kamgbe abụbụọrụ ndị Asuu malitere n'ọnwa Febrụwarị, mana ha agaghị ekwunwu kpọmkwem ma ọ bụ ihe isi ike so nke a kpatara ọnwụ ndị otu ha ahụ.
"Mana anyị agaghịkwa agụpụ kpamkpam na ihe nhịahụ so ọnọdụ a nwekwara ike itinye aka n'ọnwụ ha," Edo kwuru.
"Agaghị m abịa kọwa ụdị ahụhụ, ihe mgbu, na ihe isi ike ọtụtụ ndị otu anyị, tinyere mụ onwe m, na-agabiga n'ihi obi ọjọọ gọọmentị Naịjirịa, kama ana m elekwasa anya n'ọtụtụ uru nke ga-esi n'abụbụ ọrụ anyị a pụta n'ọdịnihu."
BBC gbakwara ọnụ na-ekwuru Mahadum Unical bụ Effiong Eyo ajụjụ ọnụ o wee kwuo na nke a bụ mere eme n'eziokwu.
Eyo kwuru na ya hụrụ akụkọ na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na ndị nkuzi ha nwụrụla anwụ kamgbe abụbụọrụ ndị Asuu malitere na Febrụwarị akarịala iri abụọ.
"Akụkọ ahụ bụ ụgha, ọnụọgụgụ ndị nkuzi erughị otu ahụ nwụrụla na mahadum anyị," Eyo kọwara.
Oge a jụrụ ya ma ha eruola iri, ọ sịrị "Ee, ihe dịka ya".
Dịka etu Ọkammụta Edo si kwuo, Eyo kọwakwara na agaghị ekwu kpọmkwem na ọ bụ akwụghị ụgwọ ọnwa butere ọnwụ ndị a, "ọtụtụ ihe nwere ike ibutere mmadụ ọnwụ".
Abụbụọrụ ndị Asuu

Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum abụghị ihe ọhụrụ na Naịjirịa.
Ihe bụkwanụ isiokwu na-akpata abụbụọrụ a oge niile bụ ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị nkuzi, nke ha na-ekwu na ọ dị ntakịrị; ọnọdụ ụlọakwụkwọ mahadum na Naịjirịa, nke ndị nkuzi na-ekwu na ọ dakpọrọ adakpọ, nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ.
Na nke ugbua, ndị Asuu na-ekwu na ha achọghị usoro gọọmentị si akwụ ha ụgwọ nke a kpọrọ 'Integrated Payroll and Personnel information system' maọbụ IPPIS n'ịchafụ.
Ha na-ekwu na gọọmentị ji usoro a ebepụ nnukwu ego n'ụgwọ ọnwa ha.
Iji nọchie IPPIS, ndị Asuu jiri aka ha rụpụta usoro ha kpọrọ 'Universities Transparency Accountability Solution' (UTAS) bụ nke ha sị na ọ ka mma, mana gọọmentị achọghị ịnabata ya.
Gọọmentị na Asuu enweela ọtụtụ ọgbakọ iji chọọ ụzọ a ga-esi nwee nkwekọrịta ka ndị Asuu laghachi n'ọrụ ha, mana ruo taa, ọgbakọ ndị ahụ amịtabeghị mkpụrụ.









