Ihe anyị ma maka nwoke a sị ndị agha gburu n’Enugwu Ezike, Enugwu steeti

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ si obodo Enugwu Ezike nke Enugwu steeti pụta na ngwụcha izu a gara aga sị na ndị agha Naịjirịa gbagburu otu nwoke akpọrọ Joseph Uja gbara afọ 62 n’obodo Ogurute nke Enugwu Ezike, Enugwu steeti.

Mana otu onye nche n'obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị uweojii 'Anti-kidnapping squad' gburu nwoke ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

N’okwu ya, “Ọ bụ ndị uweojii ngalaba 'Anti-Kidnapping Squad' gbagburu nwoke ahụ, Ọ bụ okwu nghọteghie maka oge mmachi ngagharị ndị mmadụ mere ka ha jiri gbaa ya egbe na-amaghị ama” . 

“Ihe a mere n’ebe elekere asatọ nke abalị dịka ndị nọ ebe ahụ siri kwuo”

Ọ kọwara na-agbanyeghị na ọ nọghị ebe ya bụ ihe emere mana dịka onye nche n'obodo ahụ, na ọ natara ozi nke o kwuru bụ eziokwu.

O boro ebubo na ndị uweojii e zigara obodo a na-ana ndị obodo a ego n'ike nakwa emekpa ha ahụ ọkachasị ndị Ọkada.

Mana ebubo ndị ọzọ danyekwara n’isi ndị agha Naịjirịa.

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nwoke ọzọ bi n’obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ndị agha a sị na gọọmentị Enugwu steeti kpọbatara maka ọrụ nchekwa na-emekpazi ndị obodo ahụ.

N’okwu ya “Mụ na ezinaụlọ m si akwamozu na-alọta n'oge abalị"

“Ndị agha jidere anyị, maa m ụra, jichie ụgbọala m ma sị m kwụọ ha N200,000 mana emechara m nye ha N50,000 fọrọ m n'akpa."

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị agha na-anwuchi ụfọdụ ndị obodo maka ịda iwu mmachị agbanyeghị na oge mmachi erubeghi.

Onye a sịkwa na nke a na-emetụta azụmahịa nakwa ndụ ha n’ụzọ dị njọ.

Ihe ndị uweojii na ndị Agha kwuru maka ebubo a

Mgbe BBC Igbo kpoturu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe maka ihe ndị obodo a na-ekwu, ọ gwara BBC Igbo na ọ ga-ezite ozi banyere akụkọ a mana o kweghịzị zaa ekwentị ya mgbe a kpọghachịrị ya ugboro ugboro.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha azaghị ekwentị ya maọbụ zaa ozi ezigara ya n'ekwe ntị maka nke a.

Ihe mere ndị nchekwa jiri nọrọ n’obodo Enugwu Ezike

Eserese gosiri ebe Enugu nọ n'ime ala Naịjirịa
Nkọwa foto, Eserese gosiri ebe Enugu nọ n'ime ala Naịjirịa

Kemgbe afọ 2021, Enugu steeti dịka akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị ọzọ danyere n’ọnọdụ enweghị nchekwa.

Enugwu Ezike bụ obodo dị n'akụkụ steeti Kogi na Benue so na steeti ebe akụkọ ọtụtụ mkwapo si na ya dapụta nke gụnyere ebubo mwakpo n'aka ndị ọchịehi nakwa ndị ojiegbe dị iche iche.

Gọọmentị Enugu tinyere iwu mmachị ngagharị ndị mmadụ ebe ahụ site n'elekere isii nke abali ruo elekere isii nke ụtụtụ ma zịgakwa ndị ọrụ nchekwa, gụnyere ndị agha na ndị uweojii pụrụiche ebe ahụ ịhụ na e chekwara obodo n’aka mwakpo malitere iri ibe ya elu ebe ahụ.