Meere Ekweremadu na nwunye ya ebere n'ihi ọrụ ọma ya - ECOWAS rịọrọ mba UK

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
Otu jikọtara mba ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ The Economic Community of West African States (ECOWAS) arịọla mba Briten arịrịọ ka ha mee obi ebere banyere ntaramahụhụ ha chọrọ inye Ike Ekweremadu, bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa na nwunye ya Beatrice.
Ụlọikpe mba Briten mara Ekweremadu, nwunye ya nakwa onye dọkịta ha bụ Obinna Obeta ikpe n’ụbọchị 23 Maachị 2023 maka ịkpọta otu nwoke si na Naịjirịa bịa Briten ka ha ghọrọ akụrụ ya ma nye nwa ha nwaanyị Sonia bụ onye na-arịa ọrịa akụrụ.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ n'ụbọchị 5 Mee, 2023 ka ụlọikpe Old Baily nke mba Briten ga-ekwupụta ntaramahụhụ a ga-enye Ekweremadu, nwunye na dọkịta ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị omeiwu ECOWAS bụ Sidie Mohamed Tunis n’akwụkwọ o degaara onyeisi ụlọikpe Old Bailey dị na Lọndọn gwara ụlọikpe a ka ha mee obi ebere n’isi Ekweremadu.
O depụtara ọtụtụ ọrụ Ekweremadu rụrụla n’ọgbakọ ndị omeiwu ECOWAS ma kọwaa etu ihe si emebi kamgbe ọ nọghị ya, tinyekwara na ọ ga-emebikwu ma a tụọ ya mkpụrụ ọtụtụ oge.
“N’ihi nke a anyị na-arịọ ụlọomeiwu a ka o biko mee obi ebere ma belata aka na ntaramahụhụ a ga-enye di na nwunye a.
O doro anyị anya na ikpe ziri ezi ga-ebuụzọ kama ọ bụ naanị arịrịọ ka anyị na-arịọ sị ka ụlọikpe mee ebere maka ezi akwa e ji maara nwamadị nakwa ọrụ ọma ndị ọ na-arụ n’obodo.”

Ebe foto si, ECOWAS Parliament

Ebe foto si, ECOWAS Parliament
'Ekweremadu dara iwu a n'obi ọcha iji zọọ nwa ya ndụ'
N’otu aka ahụ, ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa arịọkwala gọọmentị mba Briten ka ha meere Ike Ekweremadu ebere dịka a ga-ekwupụta ntaramahụhụ ha n’ụbọchị 5 Mee, 2023.
Otu onye omeiwu bụ Toby Okechukwu kwpupụtara nke a sị na ọ bụ maka ezi mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na mba Briten.
Ọ gakwara n’ihu kwupụta mbọ Ekweremadu gbara n’ịdịnotu mba ndị nọ n’otu Commomwealth, tinyekwara na ọ bụ n’obi ọcha ịzọ ndụ nwa ya bụ Sonia mere o jiri daa iwu a.
Onyeisi ndị omeiwu a bụ Femi Gbajabiamila rịọkwara mba Uk arịrịọ ka e meere Ekweremadu, ma sị na o nwebeghi ikpe a mara ya na mbụ.
Ọ gakwara n’ihu sị ka mba UK kwere n’ihi agwa ọma e ji maara Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice ma meere ha ebere.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya bụ arịrịọ na-ekwu na ọ bụ n'ihi na Ekweremadu bụ onye ọrụ gọọmentị?
Ndị ọzọ na-ajụ kedụkwanụ maka dọkịta Obinna Obeta bụ onye so ha daa iwu a na o nweghi onye na-arịrịọ n'isi nwamadị ahụ.
Arịrịọ Obasanjo rịọrọ mba Briten n’isi Ike Ekweremadu maka ikpe ha maara ya

Ebe foto si, Ekweremadu/Obasanjo/Facebook
Olusegun Obasanjo bụbu onyeisiala Naịjirịa arịọla mba Briten ka ha meere Ike Ekweremadu bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa na nwunye ebere maka mpụ ha mere site n'ịtụmgbere otu nwoke iji ghọrọ akịrị ya.
N’ozi Obasanjo degaara mba Briten nakwa Ụlọikpe, ọ rịọrọ ka ha kwere n’ihi ezi mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na Briten gbaghara Ekweremadu ma belata ntaramahụhụ e zubeere ya na ezinaụlọ ya.

Ebe foto si, Obasanjo
Obasanjo kwuru ka ha kwerekwa n’ihi ọkwa Ekweremadu dịka onyeomeiwu Naịjirịa nakwa ọnọdụ ahụike nwa ya nwaanyị a gbaghara Ekweremadu.
Obasanjo sị na ọ bụ eziokwu na agwa Ekweremadu na ezinaụlọ ya kpara ịtụ nwoke a mgbere jọgburu udele ma sigbuo nkapị kama ka ha hapụ ihe tara n’abalị ka ọ bụrụ anwụnta.
Ọ gara n’ihu rụtụ aka na ọrụ na mbọ Ekweremadu gbarala iji hụụ na ọchịchị onye kwuo uche ya ga-aga n’ihu na Naịjirịa kamgbe 1999 rute ugbua.

Ebe foto si, Obasanjo
Ike Ekweremadu: Uloikpe amaala ya, nwunye ya na dọkịta ikpe ịgba mgbere mmadụ

Ebe foto si, Ekweremadu /Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọikpe mba Briten mara otu ọgaranya nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba na Naijiria, nwunye ya nakwa otu dọkịta ikpe maka ịgba mgbere mmadụ iji were akụkụ ahụ ya.
A mara Ike Ekweremadu, gbara afọ 60, onye bụbu Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, nwunye ya bụ Beatrice gbara afọ 56 nakwa dokita meere ha nwabụzọ bụ Dkta Obinna Obeta,gbara afọ 50, ikpe maka ịkpa nkata iji nara otu nwoke akịrị ya.
Nke a bụ mbụ a na-eji iwu mgbere ohu agba ọhụrụ ama mmadụ ikpe na mba Briten.
A gwara ụlọikpe na akịrị ahụ a chọrọ iwere n'ahụ nwoke ahụ bụ maka nwa Ekweremadu nwaanyị gbara afọ 25 aha ya bụ Sonia.
A maghị Sonia ikpe ọbụla.
Nwoke ahụ a kpọtara london maka ịnara ya akịrị ya bụ onye na-azụ ahịa na Legọs, ha kpọta ya mba Briten n'afọ 2022 iji nara ya akịrị ya n'ụlọọgwụ 'Royal Free Hospital' dị na London.
Nwa amadi ahụ kwuru na e kwere ya nkwa ego dị puku paunds asaa( £7000) nakwa nkwa imere ya ọtụtụ ihe ndị ọzọ na mba Briten mana ọ bụ ka ọ bịara London zute ndị dọkịta 'Royal Free Hospital' bụ ndị kọwara ya ihe na-eme, ka ihe nile jiri doo ya anya.

Ebe foto si, PA Media
A sị na ndị a a na-ekpe ikpe(Ekweremadu,nwunye ya nakwa dọkịta) gbaliri ime ka ndị dọkịta ụlọọgwụ 'Royal Free Hospital' chee na nwata nwoke ahụ bụ nwanne nna Sonia bụ onye na-arịa nnukwu ọrịa, mana o nweghị ọbara jikọrọ ha.
Ụzọ e si enweta akụkụ ahụ mmadụ n'ụzọ iwu kwadoro gunyere onye ezinaụlọ mmadụ inye ibe ya akụkụ ahụ ya, mmadụ inye ikike ka e were akụkụ ahụ ya ma ọ nwụọ, maọbụ mmadụ iji aka ya wepụta onwe ya ka e were akụkụ ahụ ya tinyere onye ọzọ na anaghị ego maọbụ ihe nrite ọbụla.
Etu okwu si bido

Otu na ndịisi n'ụlọọgwụ 'Royal Free Hospital' bụ Dr Peter Dupont, bụ onye jụrụ na a gaghị eji nwata ahụ mee ihe a kpọtara ya dịka ọ chọpụtara na nwata nwoke ahụ enwetaghị ezi ndụmodu na mgbazi banyere ịwa ahụ ahụ nke nwere ikpe itinye ya n'ọnọdụ ị nata nleta ndụ ya nile, ọkachasị dịka nwata ahụ enweghị ego iji na-elekọta onwe ya.
Ụlọikpe nụkwara na Ekweremadu ha na-akwado izipụ nwata nwoke ahụ mba Turkey ma chọrọ onye ọzọ maka ihe a kpọtaburu ya.
Ọ bụ ka nwata nwoke ahụ gbara ọsọ, gbapụ London ma rahụ n'ụzọ abalị kwuru abalị tupu ọ banye ogige ndị uweojii ikpe onwe ya n'akwa na anyammiri ka nnyocha malitere.

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
Ọ gwara ndị uweojii sị : "Dọkịta sịrị na m adịka obere mana nwoke ahụ sị na ọ bụrụ na m emeghị ya na ya ga-akpọghachi m Naijiria ebe a ga-eme ya."
Ụlọikpe nụkwara na Sonia na-agụ mahadum maka nzere so nzere nke mbu na mahadum nke Bekee kpọrọ "Masters degree' na mahadum 'Newcastle University' oge ọ malitere ịrịa ahụ n'ọnwa Disemba afọ 2019.
Cheta na a nwuchiri Ekweremadu na nwunye ya n'ọnwa Juun afọ 2022.
A kpụụrụ ha ụlọikpe 'Uxbridge Magistrate Court', ebe a na-ekpe ha ikpe maka ebubo isi Naijiria laara nwoke bịa mba ahụ maka iweghara akịrị ya nke megidere iwu mba Briten n'okwu mmadu ire akụkụ ahụ mmadụ ibe ya.
Akụkọ na-abịa.












