Dịka a na-akwado maka ọgbakọ G20, obodo Johannesburg ọ tọgbọrọ n'efu?

Sinqhiwe Goodman Sithole enweghị mmiri na-agba agaba maọbụ ọkụ latrik n'otu ụlọ dị na Johannesburg
Nkọwa foto, Sinqhiwe Goodman Sithole enweghị mmiri na-agba agaba maọbụ ọkụ latrik n'otu ụlọ dị na Johannesburg
    • Onye dere ya, Ayanda Charlie & Hollie Cole
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'ihe na-erughị izuụka abụọ, ndị ndu si n'ụfọdụ akụkụ mbaụwa akụnaụba ha gbara ọkpụrụkpụ ga-ezukọ n'isi obodo akụnaụba mba Saụt Afrịka bụ Johannesburg maka ọgbakọ G20.

Mana kilomita ole na ole site n'ebe a ga-agazi ọgbakọ ahụ bụ obodo ahụ ndị ọchịchị na-agba mbọ ịkwalite ma mee ka o nwee nchekwa.

Ha na-agabiga ihe mkpọbiụkwụ dị iche iche ikpocha ma zachaa ụlọ ndị a gbahapụrụ agbahapụ karịrị 100, nke ureghure jupụtara na ha, nke ụfọdụ n'ime ha bụ nke otu ọjọọ dị iche iche weghaara.

Nleghara anya na enweghị ezi nlekọta emeela ka ezukpọọ usekwu ọha obodo, dịka ureghure jupụtara mpaghara a na-asabu akwa.

Maazị Khetani gwara BBC Africa Eye na e wegharala ọnụụlọ ndị nọ na MBV1.

BBC agaala ma chọpụta na e nwere ụlọ 102 ndị a gbahapụrụ agbahapụ n'odo ndị nọ n'ime, mpaghara ruru 18 sq km, mana ozi ndị ọzọ si n'ụlọmgbasaozi ekwupụtala ọnụọgụ dị elu.

Ureghure jupụtara n'ime ọtụtụ ụlọ
Nkọwa foto, Ureghure jupụtara n'ime ọtụtụ ụlọ

Ọnọdụ obodo ahụ nọ n'obi Onyeisiala Cyril Ramaphosa oge ọ na-ekwu maka ọgbakọ G20 n'ọnwa Maachị.

"Ahụtara m obodo ahụ dịka ebe ruru unyi," ka o kwuru.

"Ọ na-ewute ịga n'obi obodo ahụ... e nwere ọtụtụ ụlọ ndị a gbahapụrụ agbahapụ, ụlọ ndị e weghaara n'ike, na-anaghị akwụrụ gị ụtụisi."

Mayor Johannesburg bụ Dada Morero kwuru oge ahụ na obodo ahụ "adịghị njikere ịhazi ọgbakọ G20".

N'ọnwa gara aga, dịka mbọ ikwusa ozi "nzacha na mkpocha" gburugburu Johannesburg, ndị ọchịchị obodo ahụ kwuru na ebe e lekwasịrị anya bụ n'obodo ndị nọ n'ime.

Mana ihe aka mgba nọ n'ihu dịka a na-akwado maka ọgbakọ mbaụwa ahụ dị ọtụtụ.

Ọkụ gbara n'otu ụlọ ndị ahụ a gbahapụrụ agbahapụ, bụ nke gburu mmadụ 76 afọ abụọ gara aga bụ nke kwesịrị ịkpali ndị mmadụ ime ihe, mana ọ dị ka o nwebeghị ọtụtụ ihe gbanwere agbanwe.

BBC garukwara n'obodo ọzọ nọ n'ime a kpọrọ Vannin Court, ebe ureghure mechiri ọnụụlọ dị iche iche. Ushi nshị mmadụ sikwa ebe n'ụlọ apụta.

Onye bi n'ebe ahụ bụ Sinethemba Maqoma gwara BBC na mpaghara Vannin Court nke ndị ọchịchị nwe abụrụla nke e wegharala n'ike, ma bụrụkwa nke na-enweghị mmiri.

Dịka a na-enweghị ọkụ latrik maọbụ gaasị, ndị bi ebe ahụ dabeere na igwe stoovu maka isi nri
Nkọwa foto, Dịka a na-enweghị ọkụ latrik maọbụ gaasị, ndị bi ebe ahụ dabeere na igwe stoovu maka isi nri

Ndị ọchịchị Johannesburg azaghachighị ajụjụ BBC jụrụ gbasara nkesa mmiri Vannin Court.

E nweghịkwa ọkụ latrik ka Maazị Maqoma kwuru, gbakwunye na ha na-eji gaasị na ọkụ si n'anyanwụ enweta ikike.

Enweghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka pụtara na ndị obodo na-eji igbe gaasị etinye ọkụ na stoovu ha.

Ụgbọala ndị a gbahapụrụ na mbaraezi ụlọ ndị ahụ ka idemmiri ririla n'ime mposi mmadụ jupụtara n'akụkụ ebe ahụ.

Maazị Maqoma gosiri BBC ebe a na-asa ahụ gbara ọchịchịrị ma ruokwa unyi tinyere ụlọ mposi nke ọ sịrị na ọ na-eji otu boketi mmiri awụpụ.

"Ị wụpụ mposi ị gara, ọ na-adapụta n'ezi," ka o kwuru.

Ọtụtụ ụlọ dị na Vannin Court tọgbọrọ n'efu
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọ dị na Vannin Court tọgbọrọ n'efu

Nsogbu ụlọ obibi nke obodo ahụ abụghị ihe ọhụrụ.

Kemgbe a lụchara agha agbụrụ n'afọ 1994, ọtụtụ ndị isi ojii na ndị agbụrụ ha gwara ọgwa hapụrụ obodo ndị mepere emepe dị n'obodo ahụ ma kwagaa n'obi obodo ahụ, ebe ọ dịịrị ha mfe isi gaa ụlọọrụ ha.

Nnubata igwe mmadụ a mere ka e nwee ụkọ ụlọ obibi.

Joseph, nke na-abụghị ezigbo aha ya bụbu onye ohi ụlọ ma gwa BBC okwu na nzuzo. O kwuru na ndị omekome bi n'obodo ahụ goro ya ka "ọ na-azacha otu ụlọ ma mechaa tinye akwụkwọ o dere 'chọta ụlọ ebe a'". Mana ịnara ụgwọ ụlọ abụghị ihe a na-ekwu maka ya.

"Nke bụ eziokwu gbasara ụlọ ahụ bụ isi ọgwụ," ka o kwuru. "Ha na-esi nyaope nke ọma.

Nyaope bụ ọgwụike a na-ebugharị n'ogbe na mba Saụt Afrịka, nke a na-etinye igbo na ọgwụ e ji agwọ nje, na oge ụfọdụ, nsị e ji egbu oke. Ọ na-ebute afọ mgbu, nsogbu iku ume na mmụọ ịda mba.

Ụlọ a gbahapụrụ agbahapụ
Nkọwa foto, Ụlọ a gbahapụrụ agbahapụ