You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
A gbaala Jay-Z na Diddy akwụkwọ ọhụrụ maka idina nwata nwaanyị dị afọ 13 n'ike
- Onye dere ya, Jude Sheerin
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Washington DC
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Otiegwu a na-akpọ Jay-Z nke aha ya bụ Shawn Carter agọọla agụgọ kwuo na aka ya dị ọcha maka ebubo ọhụrụ e boro ya na Sean Combs (nke a na-akpọ Diddy) gbasara idina nwata nwaayị dị afọ iri na atọ n'ike n'afọ 2000 n'akwụkọ ọhụrụ a gbara ha n'ụlọikpe.
Onye ahụ na-ebo ha ebubo gbara ha akwụkwọ sị na ọ bụ mgbe ha na-eme emume nturuugo a kpọrọ MTV Video Music Awards (VMAs) na New Yọk bụ mgbe ha abụọ mara ya elu n'ike ma kọwaa na otu nwaanyị na-eti egwu a ma ama nọ n'ime ụlọ ahụ ebe ihe ahụ mere.
Jay-Z kọwara ebubo ahụ dịka aka ọrụ ndị na-emetọ aha mmadụ.
Onye nke ọzọ bụ Diddy bụ onye nọ n'ụlọ mkpọrọ nchere ego kemgbe ọnwa Seputemba gọkwara sị na ya amaghị ihe ọbụla gbasara ebubo ọhụrụ ahụ.
A gbabuola akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe n'ebe ọnwa ọkụtoba mana ha gbaghariri akwụkọ ahụ ma tinye aha Jay-Z dịka onye so maa nwa nwanyị ahụ elu n'ike.
Ọkaiwu bi na Texas bụ Tony Buzbee ji ikike ụlọọrụ New York's Victims of Gender-Motivated Violence Protection Act nwere nwepu okwu ahụ n'ụlọikpe.
Jay-Z kwuru na soshial mịdịa ya sị na "ọkaiwu Tony Buzbee detere ya akwụkwọ nyiri nke e ji emetọ aha mmadụ.
"Akwụkwọ ọ hụrụ ahụ ha gbara dịka ihe ga-eme ọtụtụ ndị mmadụ etinye ọnụ n'ebubo ha boro m, nke ga-eme m ịchọ ka m chọọ ụzọ a ga-esi mechie okwu ahụ.
"Mana naanị ihe mere bụ na m agaghị enye gị ego ọbụla. A ga m agbapụ gị afọ ka ụwa mara onye ị bụ.
Akwụkwọ ozi sị n'aka ndị ọkaiwu Diddy kwuru na akwụkwọ ọhụrụ ahụ a gbara ha na ebubo ọhụrụ ahụ bụ ụzọ ọtụtụ ji achọ ego n'aka ndị na-eti egwu a maara nke ọma bụ ndị na-atụ egwu maka na udiri akụkọ ahụ nwereike ibutere ha ajọ aha.
E jiri "Jane Doe" were mara nwata nwanyị ahụ na-ebo Jay-Z na Diddy ebubo ọhụrụ.
Jane Doe kwuru na ya dị afọ iri na atọ n'afọ 2000 mgbe enyi ya dutere ya na VMAs nke a na-eme na n'ụlọọrụ Redio City Musi Hall dị na Manhattan.
Dịka akwụkwọ ahụ a gbara si kwuo, Jane gakwuru otu onye na-akwọ ụgbọala limousine mgbe ọ na-achọ ịbanye n'ime ogige ebe a na-eme emume ahụ.
Jane kwuru na otu onye ọkwọ ụgbọala gwara ya sị "na ọ bụ Combs nyere ya ọrụ ma kwuo na ya "banyere n'ihe Diddy na-achọ".
E mechara buga ya n'ụlọ oriri na nkwari ma kwuo na oge ya ruru ebe ahụ na e nyere ya akwụkwọ ọ binyere aka nke ọ siri na ọ were ike ị bụ akwụkwọ machiri ya ịkwụ ihe ọbụla ọ hụrụ n'ebe ahụ.
Dịka akwụkwọ ahụ sị kwuo "Jane hụrụ ọtụtụ ndị na-eti ekwu amaara ama ma hụkwa ka e si ekesa ọkwụ ike n'ebe ahụ"
Ọ sịrị na e nyere ya mmaya mere ya ike ọgwụgwụ, ya abanye n'otu ime ụlọ ga dịnara ala.
Ha sị na ọ bụ oge ahụ ka Jay-Z na Diddy nakwa otu nwa nwanyị a maara ama batara n'ime ụlọ ahụ. Jane chetere ihu mmadụ atọ ahụ dịka akwụkwọ ikpe ha si kwuo.
Ha kwuru na Jay-Z na Diddy mara Jane elu, onye mechaa nwanne ya emee ebe nwata nwanyị ahụ sọ ha bata n'ime ụlọ ahụ nọrọ na-ekiri ihe ha na-eme.
Ha kwuru na Jane bidoro na-enye nsogbu mana mgbe ha kwụsiri ka Jane gbara ọsọ gbalaga.
Jay-Z bụ di Beyounce ma nwee ụmụaka atọ kwuru na ọ bụ etu ebubo ahụ ga-esi metuta ezinaụlọ ya na-agbanwa ya obi.
"Nwunye m na m ga-akpọkọta ụmụaka anyị ọnụ kọwaara ha ihe ha kwesiri imara gbasara ebubo a maka na enwere m otu n'ime ha nwereike ihu ihe a na-ede maka anyị n'akwụkwọ mgbasaozi'.