Sean P. Diddy na Sam Bankman, eze ego 'crytocurrency' nọ n'otu mkpọrọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'izu ụka gara aga, ọkaikpe nyere iwu ka a tụnye otiegwu Amerịka a ma ama bụ Sean Diddy Combs na mkpọrọ dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo ịgba mgbere mmadụ maka iji ha agbaa akwụnaọ , bụ ebe a tụnyekwara eze ego 'crypto a ma ma bụ Sam Bankman-Fried nọ dịka a tụrụ ya mkpọrọ n'ọnwa Maach maka ebubo metụtara ikwu ndịmmadụ chadum rie akatamkpo ego ndị mmadụ nyere tinyere ha n'ahịa crypto.

Mkpọrọ 'Metropolitan Detention Center' dị na Brooklyn bụ ebe a na-atụnye ndị nwere agba a na-ekpe ikpe dịka Combs iji nye ha nchekwa pụrụ iche.

Ụlọmkpọrọ ahụ a tụnyere Combs, bụ ebe ndị dịka R Kelly nakwa Jeffrey Epstein nakwa enyi ya bụ Ghislaine Maxwell oge a na-ekpe ha ikpe.

E mepere mkpọrọ 'Metropolitan Detention Center' dị na Brooklyn n'agbata 1990s mana nsogbu si na ya pụtara emeela ọtụtụ afọ.

N'afọ 2019, ọkụ ọkụ latrik kpalitere mere ka a ghara iwe ọkụ na mkpọrọ ha nke mere na ọ malitere ịjụfe oyi oke.

N'ọnwa Juun afọ 2020, otu onye mkpọrọ a kpọrọ, Jamel Floyd, kwụụ dịka ndị ọrụ ụlọmkpọrọ gbara ya ose.

Onye ọzo apụtala ịgba P. Diddy akwụkwọ maka mwakpo

Sean Diddy Combs otiegwu mba Amerika amaama dịka Sean ‘P-Diddy’ abanyela n’aka ndị ọrụ nkwekwa.

Otu onye ọzọ na ndị boro ya ebubo ahụ bụ Thalia Graves apụtala kwuo na P-Diddy metọrọ ya, ma were ndị ọkpụobi ya nye ya ọgwụike ma maa ya elu n’ike.

O kwuru na ihe ahụ mere n’afọ 2001 ma kwukwaa na P-Diddy ji onyonyo setekwa oge ọ na-ama ya elu n’ike.

Ndị ọrụ nchekwa dobere ya ebe ha na-eche ka a malite ikpe ya ikpe gbasara ebubo e boro ya nke gunyere iji ịkwa iko na-atụ mgbere.

A wuchiri P-Diddy na New York n’izu ụka garaaga ka ndị mmadụ bidoro gbaa ya akwụkwọ n’ụlọikpe ma bọ ya ebubo dị icheiche.

Ebubo ha boro P-Diddy gunyere ihe ha sịrị na ọ mere n’afọ 1990.

Ngalaba gọọmenti na-ekpe P-Diddy Ikpe kwuru na ọ guzobere “ụlọọrụ ndị ekperime juputara n’ime ya” nke o jị na-emetọ, enyị ụmụnnayị na ndị ọzọ nọ ya nso egwu ma mee ka ha na-eme ihe na-atọ anụ ahụ ya ụtọ.

Ha kwuru na ọ na-akpọtakwa ndị ụmụnwanyị bụ ndị nke na-arụrụ ya ọrụ na ngaraba ịkwaiko bụ nke ọ kpọrọ “Freak offs”.

Ha kwuru na a chọpụtara ngwaagha nakwa mmanụ dị na karama ọnụ ọgụgụ ya ruru 1000 dị n’ụlọ ya dị na Los Angeles n’ọnwa Maachị.

Ihe ị kwesiri ịma maka Sean 'Diddy' Combs na ebubo ndị e boro ya

Otiewgu a ma ama bụ Sean Combs nọ n'aka ndị uweojii bụ ndị nwụchiri kemgbe izụuka gara aga maka ebubo ịmanye mmadụ n'akwụna nakwa ịwepụta ụgbọala njem eji aga ịgba akwụna.

A nwụchiri ya n'obodo New York dịka agbakara ụzọ ụlọ ya abụọ n'ọnwa Maachi mbido afọ a.

Ọkaikpe na-elekọ ikpe ya ajụla ịnye ohere ka agbapụta ya obere ego rue mgbe a ga-amalite ikpe ya n'ezie.

Otu nkọwa ha nyere bụ na ha nwere echiche na Diddy' nwereike ịmaja ndị akaebe ga-apụta nye akụkọ akaebe n'ikpe ahụ.

Ka nke a na-aga n'ihu, lee ihe ndị ị kwesiri ịma maka ya.

  • Sean John Combs e ji ọtụtụ aha gụnyere Puffy, Puff Daddy, P Diddy, Love nakwa Brother Love bụ otu onye kachasị ewu ewu n'itiegwu.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 4 nke ọnwa Nọvemba afọ 1969.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Howard dị na New York ihe ruru afọ abụọ tupu ọ hapụ ebe ahụ gawa ịrụ ọrụ n'ụlọorụ ndị otiegwu a kpọrọ Uptown Records.
  • Ọ bụ oma mbem, onye nrụpụta egwu, ojiegoachụego hibere ụlọorụ Bad Boy Records n'afọ 1993.
  • A sị na ọ bụ ya chọpụta otiegwu ndị ọzọ gụnyere Usher, Mary J Blige nakwa Faith Evans.
  • Ọ bụ ya bụ onye otu Notorious B.I.G. bụ nke agbugburu n'afọ 1997.
  • Ọ na-emekwa ọfụma n'ewezuga ihe egwu n'ime ihe ndị ọzọ gụnyere ịchọ mma nakwa mmanya bụ Ciroc vodka.

Otiegwu ji ego achụ ego Sean "Diddy" Combs nọ n'etiti nsogbu ugbua dịka a nwụchiri ya na New York dị na mba Amerịka.

Nke a bịara dịka agbakara ụzọ n'ụlọ abụọ ya dị na Los Angeles nakwa Miami n'ọnwa Maachị dịka ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ebubo na ọ na-agba mgbere akwụna.

Ọkaiwu na-anọchi anya ya bụ Macr Agnifilio kwuru na nwụchi a wụrụ ya n'ala n'ihi na onye na-anọchi anya ya bụ nwoke aka ya kwụ ọtọ.

Combs agọrọla isi onwe ya n'ebubo niile ndị e boro ya gụnyere ịmetọ n'ụzọ mmekọ, ịmegbu nke gụnyere ọyị ya nwaanyị ochie bụ Casanda 'Cassie' Ventura.

N'akwụkwọ ọhụrụ ruru peeji iri na anọ nke gudoro ebubo niile e boro Combs, ebubo atọ bụ ndị gbara ọkpụrụkpụ.

Ha gụnyere:

  • Iji ụzọ ezighi ezi akpata ego na nzuzo bụ 'Racketeering' na Bekee
  • Ị gba mgbere akwụna site n'imanye, igwu wayo nakwa ịkwabanye mmadụ
  • Ị wepụta ụsoro njem e ji agba akwụna.