You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ntoroọbịa bụ isi sekpụ ntị n'iweta mgbanwe na mba ọbụla - Deji Ige
Odee abụ "Let there be Light" bụ Deji Ige, akọọrọla BBC Igbo ihe mere o jiri dee abụ ahụ nke wuru ewu na soshal midịa na Naịjirịa.
Abụ a Deji dere katọrọ mpụ na ihe ọjọọ niile ndị ọchịchị na-eme nke mere ndị ntorobịa ji ewe iwe.
N'ọdị nso a, ndị otu Peoples Democratic Party (PDP) kpọrọ Deji Ige ka ọ bịa gụọ abụ ya n'ọgbakọ ebe onye ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, bụ Atiku Abubakar kpọpụtara osote ya bụ Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti.
Ọ bụ n'ọgbakọ ahụ ka Deji nọrọ gụọ abụ 'Let there be light', o wee gbasaa ebe niile ka mkpụrụ ụkpaka.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Deji kọrọ akụkọ etu o si chọọ ịbanye ọrụ ndị agha Naịjirịa mana anabataghị ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mpụ na aghụghọ dewere Naịjirịa n'ọnọdụ ọ nọ n'ime ya taa.
Ọ sị na ihere emeghị ya, ụjọ atụghị ya ịgwa ndị ndọrọndọrọ okwu etu o si nụọ ya ọkụ n'obi.
Deji si na o ji abụ ya agwa ndị nọ n'ọchịchị na ndị chọrọ ịbanye ọchịchị ka ha mara ihe ha ga-eme iji dozie Naịjirịa, ka ihe dị mma.
Ọ sị na ndị ntoroọbịa bụ mmanụ e ji achụ mpụ na njọ ọsọ na mba ọbụla, ya mere obi ji dị ya aṅụrị n'oge ngagharịiwe EndSars, mgbe ndị ntorobịa gosiri iwe ha maka mpụ ndị uweojii.
O nyekwara ndụmọdụ ndị ọzọ n'ihe onyoonyo a.