You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Peter Obi ma na Atiku Abubakar ga-achịta Naịjirịa ọfụma - Gov. Ifeanyi Okowa
Gọvanọ Delta steeti hụ Ifeanyi Okowa ekwupụtala na ya nwere nkwenye na n'ime ndị niile pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala na ọ bụ Atiku Abubakar bụ onye dị ndị mmadụ si mpaghara dị iche iche Naijiria kacha mma.
Okowa onye kwuru nke a na mgbarịtaụka ya na BBC nwere na nsonso a sị na ọbuladị Peter Obi ma nke a.
O kwuru na Atiku bụ onye nwere atụmatụ ga-abara onye ọbụla uru ma bụkwa onye anaghị akpa oke. "
Ọ bụ ezigbo nwoke ga-abara onye ọbụla uru."
O kwukwara sị, " Atiku ga-ahụ na oke ruru onye nọ n'Ọwụị̀a Anyanwụ, Ọdịda Anyanwụ nakwa Saụt-Saụt."
Gee ihe ndị ọzọ Okowa bụ onye so Atiku Abubakar dịka Osote ya na ntuliaka 2022.
Ihe i kwesịrị ịma maka Okowa
Ifeanyichukwu Arthur Okowa, aka na-achị Delta steeti bụ onye dọkịta na onye ndọọndọọ ọchịchị.
A mụrụ ya n'abalị asatọ nke ọnwa Julai afọ 1959.
Ọ bụ Osote na Ọsọ onye ga-abụ onyeisiala Naijiria na ntuliaka 2023.
Ọ bụbụ Senetọ malite n'afọ 2011 rue 2015 tupu ọzọ ọkwa gọvanọ.
Nwa amadị ahụ gara mahadum 'University of Ibadan' ji nwaanyị na ụmụ.