You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọpụpụ Peter Obi bụ nnukwu ihe funahụrụ PDP- Olisa Metuh
Onye bụbụ Odeakwụkwọ mgbasaozi otu Peoples Democratic Party bụ Olisa Metuh atụọla arịrị etu aka chịburu Anamabra steeti bụ Peter Obi si hapụ PDP gawa Labour Party.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere na nsonso a, Metuh kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị na ya ekpebiela na ya agaghị ahapụ PDP, naanị ma ya apụrụ na ndọrọndọrọ ọchịchị, na ya gaara eso Obi pụọ na PDP.
O kwuru na n’ezie na PDP nweburu nkwenye na oke ga na-aga na mpaghara na mpaghara, kama na ọ bụ nnukwu ihe mwute n’oge o rutere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, egwu adagharịa.
Metu katọrọ ndị PDP wụbara n’APC n’oge gara aga sị na ọ bụ ụjọ mere ọtụtụ n’ime ha ha jịrị wụbaa.
N’ọkwu nwuchi EFCC nwuchiri ya, o kwuru na ọ bụ n’ihi nkatọ ọ na-akatọ APC ka e ji jiri EFCC na-eme ya akaja.
Onye budi Olisa Metuh?
- Olisa Metuh bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa ọkaiwu
- Onye Nnewi dị n'Okpuru Ọchịchị Nnewi North, Metuh gara akwụkwọ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.
- Ọ bụ ya bụ onyeisi ụlọọrụ 'Metuh, Okafor & Associates'
- Metuh bụbụ Odeakwụkwọ Mgbasaozi otu PDP malite n'afọ 2013 rue 2015 oge ọchịchị Naijiria si n'aka otu PDP banye n'aka APC
- Tupu ọkwa ya dịka ọnụ na-ekwuru PDP, Metụ enweela ọkwa di iche iche na PDP nke gụnyere; Osote Onyeisioche PDP n'Ọwụẁa Anyanwụ
- N'abalị ise nke ọnwa Jenụị̀arị afọ 2016, EFCC nwuchiri Olisa Metuh maka ebubo imefu ego dị nde narị naira anọ( 400m) ego so n'ego gọọmentị mapụtara maka ịzụ ngwaagha. Mana Metuh kwuru na ego ya natara bụ ego e nyere ya maka ọrụ mgbasaozi.