You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Emekpara m ahụ oge m bi n’ụlọakwụkwọ - Emeka Nwagbaraocha
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Emeka Nwagbaraocha na-eme ejije akọwaala etu o siri banye Nollywood nakwa ihe kpaliri mmụọ ya ịlụrụ ụmụnwaanyị ọgụ na soshal midịa.
Nwaamadị a si n'okpuru ọchịchị Ikeduru dị n'Imo Steeti kọwara nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụ iche na nso nso a.
Nwagbaraocha kwuru na ọ bụ site n'oge ọ bụ nwata ka Nollywood malitere imetụta ndụ ya, maka ọ na-ekiri ọtụtụ ejije oge ahụ.
"Ọ na-enye m ezigbo obiụtọ na mụ na ndị ahụ m na-ekiri n'onyonyoo n'oge mbụ na-arụkọzi ọrụ ugbua".
"Mmadụ dịka Chioma Chukwuka, Uche Jombo na ndị ọzọ, ana m ekiri ha oge m dị ntakịrị, ma nke a meziri ka m na-enwe ọṅụ pụrụiche oge ọbụla m na-aga ọrụ maka na ọ na-abụ ohere mụ na ndị ahụ m na-ekiri oge m bụ nwata ga-eji mekọrịta ihe," ka o kwuru.
Gbasara etu o si akwado ụmụnwaanyị na soshal midịa, Emeka Nwagbaraocha sịrị na ya abụghị onye na-agbachitere ụmụnwaanyị, kama ọ naghị amasị ya etu esi akpagbu ụmụnwaanyị n'obodo.
Ọ sịrị: "Ekwenyeghị m na mmadụ ka ibe ya mma maka na ọ bụ nwoke, ma dịkwa ka nwaafọ Igbo, echeghị m na o nwere nwoke Igbo ọbụla na-akwado mmekpaahụ."
Nwaamadị ahụ kwuru na ya gabigara mmekpaahụ oge o bi n'ụlọakwụkwọ, nke mere o jiri kpọọ ndị na-emekpa mmadụ ahụ asị n'agbanyeghị etu ha si mee ya.
Emeka Nwagbaraocha emeela ọtụtụ ejije gụnyere Finding Me, Onye Egwu, The Herd, Summer Rain, Rattlesnake - The Ahanna Story, MTV Shuga, Kasala nakwa ndị ọzọ, mana nke kachasị mee ka a mara ya bụ Far From Home.
O gosipụtala agwa dị iche iche n'ejije, mana o kwuru na ya chọrọ ihe dị omimi na agwa gabigara ọtụtụ ihe n'ime otu ejije.
Nwagbaraocha sịrị: "O nwere nke a na-akpọ 'psychological thriller', ọ bụrụ na m nweta ohere ịbụ isiagwa n'ụdị ejije ahụ, ọ ga-amasị m nke ukwuu."