Adamawa Election: Inec akpọpụtala Gọvanọ Ahmadu Fintiri dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ

Ebe foto si, Gọvanọ Finitiri
Ụlọorụ Independent National Electoral Commission (Inec) akpọpụtala Gọv. Ahmadu Fintiri dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Adamawa Steeti 2023.
Gọvanọ Fintiri ji ọkwa ahụ ugbua na-azọ ịchị nke ugboro abụọ n’aha Peoples Democratic Party (PDP) nwetere vootu 430,861 iji merie.
Ebe onye na-eso ya bụ Sịnetọ Aisha Dahiru nke All Progressive Congress (APC) nwetere vootu 396,788.
Ụlọọrụ Inec sị na ntuliaka e mere na 18 Maachị ezughi ikwupụta onye meriri na a ga-eme nke mgbakwụnye na 15 Eprel, 2023.
Inec sị na ndị debanyere aha maka ịtụ vootu na mgbakwụnye ntuliaka a dị 42,929, ebe ndị tozuruoke ịtụ vootu dị 16,423.
Ntuliaka a gara ofụma dịka o kwesịrị ruo mgbe a na-akpọpụta mpụtara ya, mana dịka a lara obere ezumike n’ime nke a, onyeisi Inec n’Adamawa Steeti (REC) du ndị nchekwa bata n’ime ebe bịa kpọpụta Sịnetọ Aisha nke APC dịka onye meriri ntuliaka ahụ.
Onye REC enweghi ikike ọbụla ịkpọpụta onye meriri na ntuliaka, ọzọ kwa bụ na agụpụtachabeghi mpụtara ntuliaka.
Nke a butere ọgbaghara na ọtụtụ ngagharịiwe na steeti ahụ dịka a kpọrọ oku ka akagbuo mkpọpụta ahụ ma taa Rec ahụhụ.
Ụlọọrụ Inec gara n’ihu kagbuo mkpọpụta ahụ ma nye iwu ka a gaa n’ihu kpọpụtagharị mpụtara ahụ nke nyere Fintiri mmeri.
Nke a so n’otu n’ime ntuliaka kachasị kpoo ọkụ n’afọ 2023. Ọtụtụ tụrụ anya na Aisha Dahiru ga-emeri maka na onyeisiala Muhammadu Buhari kwadoro ya nke ọma.
Adamawa Election: Inec ekpebiela ihe ha ga-eme maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ

Ebe foto si, Inec/Binami
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n’ịchafu ekpebiela ihe ga ga-eme maka ọgbaghara so na ntuliaka ọkwa govanọ n’Adamawa steeti e mere n’ụbọchị Satọde 15 Eprel, 2023.
Nke a na-eso ọgbakọ ndịisi ụlọọrụ a mere n’ụbọchị Tuzde 18 Eprel, 2023 bụ ebe ha mere mkpebi ndị gụnyere;
Inec kpebiri idegara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ ka ha nwụchie ma nyochaa onyeisi Inec n’Adamawa Steeti bụ Hudu Yunusa Ari.
Ka odeakwụkwọ Gọọmentị etiti mee ka ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ mata maka agwa ọjọọ onyeisi Inec Adamawa kpara.
Ha kpebikwara na a ga-amalite ịkpọpụtakwa mpụtara ntuliaka n’oge nakwa n’ụbọchị onyeisi na-ahazi ngụkọ ahụ n’Adamawa Steeti ga-ekpebi.
Ndị mmadụ ka na-eme ngagharịiwe maka etu ntuliaka ahụ si gaa.

Taa emeela ya ụbọchị abụọ a na-eme ngagharị udo na Yola bụ isi obodo Adamawa Steeti maka mpụtara ntuliaka mgbakwunye e mere na steeti ahụ n'ụbọchị satọde.
Narị pụrụ narị ndị mmadụ na-akwado Ahmadu Fintiri bụ gọvanọ steeti ahụ sitere n'ụlọọrụ otu Peoples Democratic Party (PDP) mee ngharịi udo ruo isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazị ntuliaka bụ Indepednent National Electoral Commission (Inec).
Ka ha na-aga ka ha na-eti mkpu na-ekwu na ha kwadoro Fintiri ma sị ka Inec bido ngụkọ vootu ha kwụsịrị.

Cheta na Inec akpọpụtaghị mpụtara ntuliaka nke e mere n'ụbọchị 15 nke ọnwa maachị maka na etu ya bụ ntuliaka siri gaa ejughị ha afọ.
Nke a mere ka ha hiwe ntuliaka mgbakwunye nke e mere n'ụbọchị 15 nke ọnwa aprel.
Ọ bụ oge emume Inec ji akpọpụta mpụtara ntuliaka a ka nsogbu dapụtara. Nsogbu a bidoro dịka onye na-anọchite anya Inec na steeti ahụ kpọpụtara Aisha Dahiru e ji Binani mara dịka onye meriri ya bụ ntuliaka agbanyeghị na ngụkọ vootu ka na aga n'ihu.
Isi ụlọọrụ Inec depụtara akwụkwọ ozi ha jiri kagbuo mmeri Binani ma kwụsị onye nnọchite anya ha na steeti ahụ ọrụ nwa mgbe nta ma nyekwa ya iwu ka o si na steeti ahụ pụọ.
Ugbua amaghị mgbe a ga-ebido ngụkọ vootu maọbụ mgbe a ga-akpọpụta onye meriri.




Supplementary elections: INEC akwụsịla ngụkọ vootu na ntuliaka Adamawa

Ebe foto si, Aisha Dahiru
Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec akagbuola ngụkọ vootu na ntuliaka mgbakwunye emere n'Adamawa steeti
Nke a na-abịa dịka onyeisi Inec na steeti ahụ bụ Hudu Yunusa-Ari kpọpụtara aha Aisha Dahiru nke otu APC dịka onye meriri ebe ngụkọ vootu ndị atụrụ atụ ka na-aga n'ihu.
N'zo nke Inec wepụtara n'akara Twitter ha, ha sị na omume onyeisi Inec steeti ahụ pụtara "imekarị ikike enyere ya" nke mere na mkpọpụta ya enweghi isi.
"Nke a pụtara na ngụkọ vootu na ntuliaka mgbakwunye e emere ụnyaahụ bụ April 15th akwụsịla kpam kpam" ka ozi ahụ kwukwara.
Ha zikwara ozi ka onyeisi Inec steeti ahụ nakwa ndị ọrụ ya zaa oku n'isiụlọorụ INEC dị n'Abuja ozugbo ozugbo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọtụtụ ndị mmadụ apụtala ịkatọ Inec maka ihe a mere na-ekwu na o gosiri na o nweghi njikọ dị n'ime ngalaba ahụ.
Ndị ọzọ na-ekwukwa na ọ bụ nrụrụaka e mere na ntuliaka nke ọnwa Febụwarị ka na-aga n'ihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Lee ndị meriri na ntuliaka mgbakwunye e mere na mpaghara dị iche iche

Dịka ngalaba Independent National Electoral Commission mere ntuliaka mgbakwunye maka ọkwa ndị omeiwu ukwu na nke steeti n'ụfọdụ mpaghara dị iche iche na Naịjirịa n'ụbọchị 15 ọnwe Aprel afọ 2022.
Ọ bụ maka nrụrụka ana ọgbaaghara dapụtara n'ụfọdụ mpaghara ndị amere Inec jiri mee ntuliaka mgbakwunye ndị a.
Steeti ndị e mere ntuliaka ndị a n'ọwụị̀a anyanwụ gụnyere Imo Steeti na Ebonyi Steeti.
Dịka eme chara ya, lee ndị tụụrụ ugo na ya bụ ntụliaka mgbakwunye.
Nwoke Victor Chidi nke PDP enwetela mmeri ịbụ onye nnọchite anya mpaghara Ebonyi North

Ebe foto si, Nwoke Victor Chidi/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Inec akpọpụtala aha Chidi Nwoke Victor nke otu Peoples Democratic Party (PDP) dịka onye ga-anọchite mpaghara Ebonyi North n’ụlọomeiwu.
Nke a so na mpụtara ngụkọ ntuliaka mgbakwunye e mere n’akụkụ ụfọdụ n’Ebonyi steeti n’ụbọchị Satọdee, abalị 15 nke ọnwa Eprel, 2023.
Lee ka ngụkọ si ebe ahụ siri dị dịka Inec siri kpọpụta ha:
- PDP (Nwoke Victor Chidi) – Vootu 5,988
- APC (Umahi Maxwell) – Vootu 5,664
- AA - 19
- ADC – 26
- ADP – 30
- APGA - 4,221
- APM – 10
- LP - 2,465
- NNPP – 51
- NRM – 10
- ZLP – 14
Ọkammụta Smart Otu bụ onye nọ n’isi ọrụ ngụkọ Inec bụ onye mere mkpọpụta a.
Ka akpọpụtara ha Maazị Nwoke, ọ gwara BBC Igbo:
“Obi jụpụtara m n’aṅụrị, ana m eleke ndị nkwadoro ma tụnyere vootu. A na-arịọ ndị ọha mmadụ ka ha nọrọkwa m n’azụ mgbe malịtere ọrụ.”
Ọ gara n’ihu kwee nkwa na ọ ga-ahụ na o mepụtara iwu ndị ga-adịrị mpaghara Ebonyi North bụrụ ebe mepere emepee.
Ọtụtụ ndị nkwado pati ahụ nakwa ndị nkwado Nwoke pụtara na-agụ egwu ọṅụ ma na-agba egwu n’ogige ebe e mere mkpọpụta a.
Inec kwuru na e mere ntuliaka mgbakwunye a n'ihi mkpamkpa dị iche iche nke mere ka a kagbuo ntụliaka a nke emeburu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
N'Ebonyi Steeti, mpaghara a ebe ndị e mere ntuliaka a metụtara okpuruọchịchị asaa nọ n'Ebonyi steeti nke gụnyere Abakaliki, Afikpo North, Afikpo South, Ezza North, Ezza South, Ikwo na Ivo.
Ngụkọ vootu amalitela n'Ebonyi dịka a ka na-atụ vootu n'Imo Steeti

Dịka elekere abụọ na ọkara nke ehihe ruru nke bụ oge ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa 'Independent National Electoral Commission' (Inec) tinyere dịka oge a ga-eji kwụsị ịme ntuliaka mgbakwụnye a, a kwụsịrị ime ntuliaka n'akụkụ ụfọdụ n'Ebonyi steeti dịka a malitere ịgụkọ vootu.
A malitere ịgụkọ vootu n'ebe elekere atọ nke ehihe a n'akụkụ Azumnini/Azugwu nke Ebonyi steeti.
Inec mmegharị ntụliaka nke ọkwa ndị ụlọomeiwu ga-anọchite anya mpaghara dị iche iche na Naịjirịan'ụbọchị 15 nke ọnwa Aprel afọ 2023 dịka ha siri hibe ya.
Akụkọ dapụtara na e nwere ndị bịara na-azụ vootu ndị mmadụ n'akụkụ ụfọdụ Azumini/Azugwu dịka ụfọdụ siri kwuo ma kọwa na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ n'isi ọrụ ha.
Onye uweojii nọ n'isi ọrụ nchekwa ebe ahụ bụ CP Faleye Olaleye Sunday gwara BBC Igbo 'Ebubo na-adapụtakarị na ntuliaka mana anyị bụ ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ kwụ chim na nọrọ n'ọrụ anyị."
Ọ bụ maka mkpamkpa dị iche iche nke mere ka a kagbuo ntụliaka a nke emeburu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
N'Ebonyi Steeti, mpaghara a ebe ndị e mere ntuliaka a metụtara okpuruọchịchị asaa nọ n'Ebonyi steeti nke gụnyere Abakaliki, Afikpo North, Afikpo South, Ezza North, Ezza South, Ikwo na Ivo.
Dịka o siri dị, ebidola ntuliaka a na mpaghara ndị a.
Lee ka ntuliaka a siri gaa.

Lee ka o si aga n'Abakiliki North na ebe ndị ọzọ
Ntuliaka ebidola n'Azummini Azugwu Ward 4 ebe akagburu ntuliaka maka ndị napụrụ igbe eji atụ vootu n'ike.
ọdọ vootu ndị a gụnyere
EBSU Guest House 2
Mmadụ ole ga-atụ vootu: 900
Code: 005
Mpghara ọchịchị :Abakaliki North
EBSU primary school 2
Polling unit 011
Mmadụ ole ga-atụ vootu: 484
EBSU primary school"A'
Code: 010
Mmadụ ole ga-atụ vootu:152




Lee ka o si aga ugbua n'okpuruọchịchị Ikeduru/ Mbaitoli nke Imo Steeti

Ebidola ntuliaka n'ụfọdụ mpaghara ebe a ga-eme ntuliaka mgbakwunye n'Imo Steeti.
Cheta na emechaghị ntụliaka maka ọkwa ụlọomeiwu Ikeduru/ Mbaitoli .
Uche Ogbuagu nke Labour Party ji vootu 5,056 karịa onye nke na-esote ya n'azụ bụ Akarachi Amadi nke pati All Progressive Congress, kama ebe ndị a na-emeghị ntuliaka nwere mmadụ 30,000 ngalaba Inec kpọpụtara dịka ndị nwereikike ime ntuliaka.
Akụrụngwa ndị ọrụ Inec ji arụ ọrụ ahapụla ụlọọrụ okpuruọchịchị Mbaitolu gawa Amaike ebe a ga-eme ntuliaka mgbakwunye a.

Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe a kwuru na ndị mmadụ nọgbọ vootu nke mpaghara Eke Amaehi dị n'Eziama na nke mpaghara Umuduruoma dị n'Amakaohia nke dị n'okpuruọchịchị Ikeduru.
Ndị mmadụ pụtakwara n'ọgbọ vootu 003 dị n'Ogbaku na nke mpaghara Umuchimawiri dị n'Obazu Mbieri dị n'okpuruọchịchị Mbaitoli.
Onyeisi obodo Eziama bụ Maxwell Ozurigbo, gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ntuliaka gara nke ọma.
Ozurigbo kwuru na ndị mmadụ pụtara nke ọma n'ihi na ha nwere mmasị maka onye ga-anọchite ha n'ụlọomeiwu.

Kurunwanne Chukwudi onye bịara ọtụ vootu kwuru na ya bụ ihe gara nke ọma ma sị na igwe Bvas rụrụ ọrụ nke ọma karịa ntuliaka emere na mbụ.
O kwukwara na ọ bụghị eziokwu na e nwere ọgbaaghara na mpaghara ha tụrụ vootu.
N'aka nke ọzọ ka Uche Ogbuagu ji ọkọlọtọ Labour Party kwuru na ya na-anụta ozi na e nwere ọgbaaghara n'ụfọdụ ebe a na-atụ vootu.
Ogbuagu gwara ndị ntaakụkọ sị, "Obi siri m ike, enweghị onye m ga-eji maka ya pụọ maka ịzọ ọkwa a. O nweghị kwa mgbe e ji nwuchie m".
















