Kibbutz massacre: 'Awa 27 ka mụ na nwanta m zoro iji zọ ndụ anyị'

Aha onyonyo, Kibbutz massacre: 'Elekere 27 ka mụ na nwanta m zoro iji zọ ndụ anyị'
Kibbutz massacre: 'Awa 27 ka mụ na nwanta m zoro iji zọ ndụ anyị'

Ihe onyoonyo a bụ maka otu nwaanyị, nwa ọhụrụ ya na di ya bi n'obodo Kibbutz nke dị nso na Gaza.

Ha kọkwara etu ha si wee gbanahụ ogbugbu ndị mwakpo ma zoo ihe dị ka awa 27 iji zọ ndụ ha.

E gburu ndị mba Izrel n'igwe, ndị e gburu gụnyere ụmụaka, na mwakpo ndị Hamas mere na mpaghara Kibbutz Kfar Aza n'ụbọchị Satọde, 7 Ọktoba.

Onye mba Izrel bụ osee ihe onyoonyo bụ Shaylee Atary na nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ gbalahụrụ mwakpo a dịka di ya bụ Yahav Winner jibidoro ndị mwakpo ahụ ma gbochie ha inweta nwunye ya na nwaada ya.

Atary jiri ọnụ ya kọọrọ onye ntaakụkọ BBC Arabic etu ha si gbalahụ ọnwụ n'aka ndị otu Hamas.

Pịa ka i kirie ya bụ ihe onyoonyo a n'uju.

Kibbutz massacre: 'Elekere 27 ka mụ na nwanta m zoro iji zọ ndụ anyị'
Nkọwa foto, Kibbutz massacre: 'Elekere 27 ka mụ na nwanta m zoro iji zọ ndụ anyị'