Ihe gọọmentị kwuru maka nwa akụkọ Naịjirịa a sị e gburu na mba Philippines

Ebe foto si, @michaelojuola/X
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa bi na mba ofesi bụ 'Nigerians in Diaspora Commission' (Nidcom) ekwuola na ha ga-ebido nnyocha maka akụkọ nwa okorobịa Naịjirịa e gburu na mba Philippines ebe ọ na-agụ akwụkwọ Mahadum.
Ha kwuru nke a site n'akara soshal midia ha dịka akụkọ gbasara ọnwụ nwata nwoke ahụ malitere ifesa n'ụbọchị Sọnde, Ọktoba 23.
Onye tinyere ya bụ akụọ na Twitter bụ nwaokorobịa aha ya bụ Michael Ojuola dịka o dere sị: "Otu enyi m, onye Naịjirịa na-agụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mba Philippines, ka ụfọdụ ndị Chaịna gburu n'ụzọ ọjọọ. Ha kechiri ya aka, kechie ya ọnụ, ma tigide ya ihe tigbuo ya."
Michael, onye kọwara onwe ya n'akara X ya dịka nọọsụ, gara n'ihu kwuo na ndị ahụ tigidere Ikem ihe ruo oge o koropuru, ha wee ga debe ozu ya n'okporoụzọ dị nso n'ụlọọrụ ndị uweojii na mpaghara Mandaue, mana tupu e buru ya garuo n'ụlọọgwụ, ọ nwụọla.
O kwuru na ihe a mere n'ụlọọrụ ebe Ikem na-arụ ọrụ, ma kwukwaa na e mechiela ụlọọrụ ahụ ugbua.
"Ikem bụ onye na-agbasi mbọ ike na-arụrụ onwe ya ọrụ n'ụzọ iwu kwadoro iji bie ndụ dị mma. Onye nọrọ afọ asaa maọbụ asatọ n'ụlọakwụkwọ ọzụzụ ndị dọkịta ma kwụọ ụgwọakwụkwọ dị oke ọnụ, ekwesịghị ịnwụ n'ụzọ dị otu a. Anyị na-eme ihe niile anyị nwereike ime iji hụ na ikpe ziri ezi weere ọnọdụ," Michael Ojuola dere.
Ojuola mechara zitere BBC ozi ebe ọ kọwara na ihe niile bidoro n'ihi esemokwu na nghọtahie n'ebe Ikem na-arụ ọrụ. O kwuru na nke a mere ka onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ nwaanyị onye mba Chaịna kpọọ ụfọdụ ndị Chaịna ha wee bịa kpụrụ Ikem pụọ, kwuo na ha na-akpọga ya na nke ndị uweojii n'ihi na ọ na-akpata ọgbaaghara n'ụlọọrụ.
Mana oge enyinwaanyị Ikem, bụ onye mba Philippines garuru n'ụlọọrụ ndị uweojii, ọ hụghị Ikem ebe ahụ. Otu ụgbọala mechara bubata Ikem ebe e kere ya ụdọ n'aka, kechie ya ọnụ ma tie ya ihe nke ukwuu. Ọ nwụrụ n'ụzọ dịka a na-ebuga ya ụlọọgwụ.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịchọta ndị ma nwata nwoke a nke ọma iji matakwuo ihe banyere ya, dịka onye ebe ọ bụ, ụlọakwụkwọ mahadum ọ nọ na ya na mba Philippines, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ihe ụlọọrụ Nidcom kwuru

Ebe foto si, NIDCOM
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'akara X ha, ụlọọrụ Nidcom gwara Michael Ojuola ka o zitere ha ozi doro anya iji nye nkọwa zuru oke maka ihe a merenụ.
"Biko zitere anyị ozi a n'akara email anyị, dịka onyeisi anyị ga-akpọtụrụ ụlọ nnọchite anya mba Phillipines iji matakwuo maka nke a. Anyị ga-amalite nnyocha na-egbughị oge ma ọ bụrụ na anyị matachaa nke ọma gbasara akụkọ a," ka Nidcom dere.
BBC Igbo kpọtụụrụ onyeisi Nidcom bụ Abike Dabiri-Erewa, o wee zitere anyị ozi nke si n'aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Nidcom bụ Abdur-Rahman Balogun, gbasara okwu ahụ.
Ozi ahụ kwuru sị: "Ụlọọrụ Nidcom ahụla akụkọ na-efesa na soshal midia gbasara otu nwata akwụkwọ Naịjirịa aha ya bụ Ikem, bụ onye e kwuru ọ nwụrụ n'aka ụfọdụ ndị Chaịna na mba Phillipines.
"Mkesa gbasara nke a erubeghị n'aka ụlọọrụ nnọchiteanya Naịjirịa na mba Philippines, mana Nidcom agwala nwa okorobịa tinyere akụkọ ahụ na soshal midia ka o dee akwụkwọ mkpesa doro anya ma zite ya n'akara email anyị.
"Anyị ga-amalite nnyocha miri emi banyere ebubo a iji chọpụta ihe niile merenụ ma chọpụtakwa ndị kpara arụ ahụ."
Ihe ụlọọrụ nnochiteanya mba Philippine kwuru

Ebe foto si, Philippine Embassy in Nigeria
Oge BBC Igbo kpọtụụrụ akara ekwentị dị n'ọbaozi ụlọọrụ nnọchiteanya Philippines na Naịjirịa, otu onye zara oku ahụ kwuru na ha anụbeghị maka akụkọ.
O kwuru ka anyị zitere ha ya bụ akụkọ ka ha wee malite nnyocha nke ha banyere ya.
BBC Igbo emeela nke a ugbua ma na-eche ka ha zaghachi anyị.









