Ihe Ohaneze ndigbo kwuru maka njichi akụnụba Ekweremadu

Ike Ekweremmadu na Alex Ogbonnia

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook

Otu Ohanaeze ndigbo akatọla mkpebi ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu’Abuja mere banyere ijichị ụfọdụ akụnụba sịnetọ Ike Ekweremadu gụnyere ụlọ ya ruru 40 n’akụkụ dị iche iche.

Ozi si n’aka otu a nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia wepụtara na ekwu “Otu anyị kwenyere n’atụmatụ ndị ziri ezi nye ndị mmadụ, etu EFCC si mee mkpesa ka ejichie akụnụba ya ebe ọ na-agabiga ihe mgbu ugbua na Briten so usoro na-ezighi ezi ma ncha.”

“Anyị na-ekwusịike na e kwesịrị inye Ike Ekweremadu ohere ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ụlọikpe maka akụnụba ndị a, ọ bụrụ na aka ya adịghị ọcha, ka o nweta ntaramahụhụ dịrị ya n’okwu a.”

“Anyị ma na ọtụtụ ebubo banyere nrụrụaka nọ n’isi ya mana etu EFCC siri mee ngwa ngwa n’okwu nakwa etu e si mee mkpebi a dị aṅụ ma bụrụkwa ihe a na-enyo enyo.”

Ha gara n’ihu rịọ ndị ọrụ ikpe na Naịjirịa ka ha bịa gbatara ya ọsọ enyemaka n’okwu nke ha rụrụ aka dịka ụkpụrụ “ọchịchị nchịgbu”.

Ike Ekweremadu

Etu ụlọikpe si nye iwu ka EFCC jichie ọtụtụ akụnaụba Ekweremadu

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị Fraịdee abalị anọ nke ọnwa Nọvemba ka ụlọọrụ EFFC jichie akụnaụba Ike Ekweremadu ruru iri anọ (40).

Akụnaụba ndị a gụnyere ụlọ, ala na ihe ndị ọzọ; ọtụtụ dị na Naịjirịa ebe ndị ọzọ dị na mba ofesi dị icheiche dịka, Amerịka, Dubai, na United Kingdom.

Ekweremadu bụbu osote onyeisi Sineti, ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa nọ n'ụlọ mkpọrọ na mba UK ugbua.

Okaikpe kpebiri ya bụ ikpe n'Abuja bụ taa bụ Fraịde bụ Inyang Ekwo n’akara ikpe FHC/ABJ/CS/1242/2022.

Ya bụ ụlọikpe nyere ikike ka EFCC biputa, n’ime abalị asaa, akụnaụba ndị a ga-anapụ Ekweremadu n’akwụkwọ ozi ntaakụkọ a na-agụ na Naịjirịa na-egbughị oge ọbụla.

Ọ sịkwa ka ndị ọbụla nwere mmasị n'akụnụba ndị ahụ bịakwute ụlọikpe n'ime ụbọchị 14 ihe mere na gọọmentị Naịjirịa agaghị eweghara akụnụba ndị ahụ kpamkpam.

O yigharịrị ya bụ ikpe ruo ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2022 bụ mgbe ọ nyere ohere ka onye ọbụla nwere ihe ọ ga-ekwu maka ya bụ mkpebi bịa kwuo ya.

N'ime akụnụba ahụ a napụtara Ekweremadu, iri dị na Enugu, atọ n’Amerịka, abụọ na UK, otu na Lagọs, itoolu na Dubai, ebe iri na ise dị n’Abuja.

Ekweremadu nọ na mkpọrọ na UK

Ike Ekweremadu na nwunye ya, Beatrice

Cheta na Ike Ekweremadu na nwunye ya ka nọ n'aka ndị uweojii na mba UK n'ihi ebubo ịtụ mgbere mmadụ, nakwa ịchọ iwere akụkụ ahụ mmadụ (organ harvesting).

Ndị ọrụ nchekwa mba UK boro ha ebubo izobata nwatakịrị dị afọ iri abụọ na ise iji wepụ akụkụ ahụ ya, mana ha kwuru na aka ha dị ọcha.

Iwu gbasara iji mmadụ mere ohu n'ọgbara ọhụrụ a nke mba UK a kpọrọ 'Modern Slavery Act', kwuru na a gaghị akpọpụta aha maọbụ gbaa onye a chọrọ ịghọgbu napụ akụkụ ahụ ya n'anwụ.

Nke a pụtara na agaghị akpọpụta aha ya bụ nwamadi ahụ Ekweremadu kpọọ gaa UK.

A nwụchiri Ekweremmadu gbara afọ 60 na nwunye ya bụ Beatrice Nwanneka dị afọ 55 n'ọnwa Juun, afọ 2022 n'ọdọ ụgbọelu Heathrow dị na London, oge ọ chọrọ ịbanye ụgbọelu gaa mba Turkey, dịka ndị uweojii UK si kwuo.