Ihe onyonyo nzuzo kpuhere 'ụmụnwaanyị' na-atụ mgbere mmetọ ahụ ụmụaka na Kenya

    • Onye dere ya, Njeri Mwangi
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye in Maai Mahiu
    • Onye dere ya, Tamasin Ford
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Nnyocha ụlọọrụ BBC Africa Eye achụpụtala etu ụmụnwaanyị a maara dịka "madam", si atụ mgbere mmetọahụ ụmụaka dị afọ 13 na Kenya.

N'obodo Maai Mahiu dị na mpaghara Rift Valley mba Kenya, nnukwu ụgbọala bụ ngwaahịa nakwa ndị mmadụ na-aga mba Yuganda, Rụwanda, Saụt Sudan nakwa mba DR Kongo na-agbafe ebe ahụ n'ụtụtụ ma n'abalị.

Ebe bụ isi nke a bụ ọdịda anyanwụ Nairobi bụ isi obodo Kenya, nke a maara dịka ọnọdụ ndị akwụna nakwa ebe mmetọahụ ụmụaka.

Ndị ntaakụkọ zoro onwe ha dịka ndị akwụna chọrọ ịmụ ọrụ iji bụrụ madam, nọrọ ọtụtụ ọnwa ebe na mmalite afọ iji nnyochaa mgbere mmetọ ahụ n'obodo ahụ.

Ije onyonyo nzuzo ha mere gosiri ụmụnwaanyị abụọ kwuru na ha maara na iwu megidere ya ma gaa n'ihu gosi ndị ntaakụkụ ahụ ụmụaka ahụ a na-emetọ.

BBC nyere ndị uweojii Kenya ihe akaebe niile ha wetara n'onwa Maachị. BBC kwenyere na ndị madam ahụ agbanwela ọnọdụ kemgbe ahụ. Ndị uweojii kwuru na ha amaghị ebe ụmụnwaanyị abụọ ahụ na ụmụaka e sere n'ihe onyonyo nọ ugbua. Ruo taa, enweghị onye ọbụla a nwụchiri.

Ịnwụchi nakwa ịma ikpe na Kenya adịghị mfe, iji nweta nke a, ndị uweojii ga-achọ ịnụ olu ụmụaka ahụ. Oge ụfọdụ, egwu anaghị ekwe ndị dị etu ikwu okwu.

Ihe onyonyo BBC sere n'okporoụzọ n'abalị gosiri otu nwaanyị kpọrọ onwe ya Nyambura ka ọ na-achị ọchị ma kwuo: "Ha ka bụ ụmụaka, ọ dịghị mfe ime ka ha kweta site na ihe ha ihe nracha na-asọ ụsọ."

"Ịgba akwụna bụ ihe na-enye nnukwu ego na Maai Mahiu; ndị nnukwu ụgbọala bụ ihe na-enyere ya aka. Ọ bụ etu anyị si enweta uru. E meela ya ihe dị mfe na Maai Mahiu," ka ọ kọwara ma kwuo na o nwere otu nwatakịrị nwaanyị gbara afọ13 na-arụrụ ya ọrụ kemgbe ọnwa isii".

Ọ naghị adị mfe ọkachasị mgbe ọ bụ ụmụaka na-eto eto. Ị gaghị akpọta ha etu ahụ n'obodo. Ọ bụ n'abalị ka m na-akpọta ha na nzuzo," ka Nyambura kwuru.

Iwu emegideghị onye okenye ịgba akwụna na Kenya mana iwu mpaghara ụfọdụ kagburu ya. Iwu emegideghị ya na Maai Mahiu nke dị na mpaghara Nakuru county.

Iwu penal kwuru na ọ bụ mpụ iji ego si n'ịgba akwụna n'ụdịrị ọbụla.

Ịtụ mgbere ụmụaka na-erughị afọ 18 bụ mpụ bu ntaramahụhụ mkpọrọ afọ iri maọbụ mkporo ndụ.

Oge a jụrụ ya ka ndị na-edina ụmụaka ahụ a na-eji okpunnabuenyi, Nyambura kwuru na ọ na-ahụ na ha na-eyi ya mana otu onye eyighị ya.

"Ụfọdụ ụmụaka chọrọ inweta nnukwu ego anaghị eji ya. Ụfọdụ bụ ndị a na-eji ike gbochie ha iji ya," ka o kwuru.

N'ọgbakọ ọzọ, o gosiri onye ntaakụkọ nzuzo otu ụlọ ebe ụmụaka nwaanyị atọ nọ n'oche nakwa onye nke nọ n'oche osisi.

Nyambura hapụrụ ebe ahụ ma nye ndị ntaakụkọ ahụ ohere ka ya na ụmụnwaanyị ahụ nwee mkparịtaụka.

Ha kwuru na a na-emetọ ahụ ha ugboro ugboro kwa ụbọchị.

"Oge ụfọdụ ọtụtụ mmadụ dị iche iche ga-edina gị. Ha na-eji aka ike mee gị ka ime ihe dị iche iche jụgburu onwe ya," ka otu nwata nwaanyị ahụ kwuru.

Enweghị ihe ngụkọ ụmụaka a tụrụ mgbere ha na Kenya. N'afọ 2012, ụlọọrụ mba Amerịka bụ State Department Country Report on Human Rights Practices in Kenya, kwuru na o ruru 30,000, ọ bụ n'ụlọọrụ gọọmenti Kenya na ụlọọrụ Eradicate Child Prostitution na Kenya.

N'afọ 2022, ụlọọrụ NGO bụ Global Fund to End Modern Slavery, chọpụtara na ihe ruru ụmụaka 2,500 bụ ndị a na-emetọ ahụ ha na mpaghara Kilifi na Kwale

Onye ntaakụkọ nzuzo ọzọ mere ka nwaanyị ọzọ kpọrọ onwe ya Cheptoo tụkwasị ya obi ma soro ya nwee ọtụtụ mkaprịtaụka.

O kwuru na ire ụmụaka nwaanyị bụ ụzọ o ji eweta ego ma na-enye onwe ya nri.

"Ụdịrị ọrụ a bụ ọrụ a na-arụ na nzuzo."

"Onye ọbụla kwuru na ọ chọrọ nwata nwaanyị, aga m agwa ya kwụọ m ụgwọ. Anyị nwekwara ndị na-abịa kwa mgbe kwa mgbe maka ha".

Cheptoo kpọọrọ ndị ntaakụkọ nzuzo gaa ebe ha zutere ụmụaka nwaanyị anọ ọzọ. Onye kachasị nta n'ime ha dị afọ 13. Ndị nke ọzọ kwuru na ha dị afọ 15.

O kwuru na ọ na-eweta uru ma kwuo na puku shilling atọ ($23; £17) ụmụaka ahụ wetara, ọ na-eweta puku shilling abụọ na ise ($19; £14).

N'ọgbakọ ọzọ n'otu ụlọ dị na Maai Mahiu, Cheptoo hapụrụ ụmụaka ahụ na ndị ntaakụkọ nzuzo ahụ.

Otu n'ime ha kwuru na ụmụnwoke ise na-edina ya kwa ụbọchị.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere maọbụrụ na ọ jụrụ inwe mmekọahụ na-enweghị okpunnabuenyi, ọ sịrị na o nweghị nhọrọ ọbụla.

Ha ga-achụpụ m ma ọ bụrụ na m jụrụ ka a ghara iji okpunnabuenyi dinaa, enweghị ebe ọzọ m ga-anọ. Enweghị m nne na nna.

Ụlọọrụ mmekọ nwoke na nwaanyị nke Kenya bụ ihe gbagwojuru anya na nke na-enweghị isi ebe ma nwoke ma nwaanyị na-etinye aka n'ịkwado ụmụaka ịgba akwụna.

O dobeghị anya ụmụaka ole a na-amanye n'ọrụ ịgba akwụna na Maai Mahiu, mana n'obere obodo a nwere ọnụọgụgụ mmadụ puku iri ise, ọ dị mfe ịchọta ha.

Otu onye bụbu onye ọrụ mmekọahụ, nke a maara dị ka "Baby Girl", na-enyezi ụmụ agbọghọ ndị gbanarịrị mmetọ mmekọahụ na Maai Mahiu ebe mgbaba.

Onye ahụ dị afọ iri isii na otu, rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ mmekọahụ afọ iri anọ - nke mbụ, ọ hụtara onwe ya n'okporoama na mmalite afọ iri abụọ ya.

Ọ dị ime ma mụọ ụmụntakịrị ya atọ mgbe o si na be di ya gbapụ n'ihi na di ya na-eti ya ihe.

N'ihu ụlọ ya, o gosiri BBC ụmụ agbọghọ anọ bụ ndị ụmụnwaanyị a na-akpọ "madam" na Maai Mahiu manyere ịrụ ọrụ mmekọahụ mgbe ha bụ ụmụaka.

Ụmụ agbọghọ ndị ahụ kọrọ akụkọ yiri ibe ya banyere etu ọnọdụ ezinụlọ adịghị mma ma ọ bụ mmegbu n'ụlọ siri mee ha abịa Maai Mahiu ka ha gbanarị ọnọdụ ọjọọ ahụ mana ha gbakwutere mmegbu ọzọ.

Michelle kọwaara etu nne na nna ya siri nwụọ n'ihi ọrịa nje HIV mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. A chụpụrụ n'ụlọ chụga ya n'okporoama ebe ọ matara otu nwoke nyere ya ụlọ obibi ma malite idina ya n'ike.

"Eji m ahụ m akwụ ya ụgwọ maka ịkụziri m ihe. Ike gwụrụ m mana enweghị m onye ọbụla," ka o kwuru.

Ka afọ abụọ gasịrị, ọ hụrụ otu nwaanyị nke o mechara chọpụta na ọ bụ "madam" na Maai Mahiu bụ onye manyere ya ịrụ ọrụ mmekọahụ.

Lilian bụ onye dị afọ iri na itoolu ugbua, ka nne na nna ya nwụnahụrụ oge ọ ka dị obere. A hapụrụ ya na nwanne nna ya bụ onye sere ya vidiyo oge ọ na-asa ahụ ma resị ndị enyi ya ihe onyonyo ahụ.

N'oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ ndina n'ike.

"Nke ahụ bụ ụbọchị kachasị m njọ. Adị m afọ iri na abụọ mgbe ahụ."

Oge ọ gbapụrụ, otu onye ọkwọ ụgbọala gwongworo kpọgara ya Maai Mahiu dinakwa ya ọzọ.

Ọ bụ n'ebe a dịka Michelle ka o zutere otu nwaanyị manyere ya ịrụ ọrụ mmekọahụ.

Ndụ ụmụ agbọghọ ndị a na-eto eto jupụtara na ihe ike, nleghara anya na mmegbu.

Ugbu a, ha na Baby Girl bi n'ụlọ, ha na-amụ ọrụ aka ọhụrụ - abụọ nọ n'ụlọọrụ na-ese foto ebe abụọ nọ n'ebe a na-achọ mma.

Ha na-enyere Baby Girl aka n'ọrụ mgbasa ozi ya n'obodo.

Mpaghara Nakuru bụ otu n'ime ebe kachasị nwee ọnụọgụgụ nje HIV na Kenya, ma Baby Girl, nke ụlọọrụ enyemaka mba Amerịka bụ USAID na-akwado, na-arụ ọrụ ịkụziri ndị mmadụ ihe egwu dị n'inwe mmekọahụ n'enweghị nchekwa.

O nwere ụlọọrụ ya na Karagita Community Health Centre, dị nso n'ọdọ mmiri Lake Naivasha, ebe ọ na-arụ ọrụ na-enye ndị mmadụ okpu nna bụ enyi kọndọm na ndụmọdụ.

Mana n'ihi mkpebi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ibelata ego ụlọọrụ USAID, ọrụ mgbasa ozi ya na-achọ ịkwụsị.

"Site na Septemba, anyị ga-abụ ndị na-enweghị ọrụ," ọ gwara BBC World Service, gbakwụnye na nchegbu ọ na-enwe bụ maka ụmụnwaanyị na ụmụ agbọghọ ndị dabere na ya.

"Ị na-ahụ adịghị ike nke ụmụaka ndị a. Kedụ ka ha ga-esi dị ndụ n'onwe ha? Ha ka si n'ọnọdụ ha apụta."

Gọọmenti mba Amerịka ekwughị ihe ọbụla na nnoycha a banyere mmetụta mbelata ego ya nwereike inwe. Ụlọọrụ USAID mechiri ọrụ n'ọnwa gara aga.

Ka ọ dị ugbu a, Lilian lekwasịrị anya n'ịmụ ise foto na ịgbake site na mmegbu.

"Ụjọ anaghị atụzi m maka na Baby Girl na-enyere m aka," ka o kwuru. "Ọ na-enyere anyị aka ichefu ihe mere ochie."