Ademola Lookman bụ ọkacha agba bọọlụ ebe Chiamaka Nnadozie bụ ọkacha eche bọọlụ n'Afrịka n'afọ 2024

Ademola Lookman na Chiamaka Nnadozie

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nwafọ Naịjirịa na-agbara otu egwuregwu Atalanta bọọlụ bụ Ademola Lookman eturula ugo dịka onye kachasị agba bọọlụ n'Afrịka nke afọ 2024.

Nwamadị a dị afọ 27 meriri Simon Adingra bụ nwafọ Ivory Coast na-agbara otu egwuregwu Brighton & Hove Albion bọọlụ.

Ndị ọzọ Lookman meriri bụ nwafọ Gini Serhou Guirassy, nwafọ Moroko bụ Achraf Hakimi nakwa oche goolu mba Saụt Afrịka bụ Ronwen Williams.

Lookman nyeere otu Atalanta aka mabute iko Uefa Europa 2024 ebe o nyere goolu atọ n'asọmpi ikpeazụ, o nyekwara ha aka ịgbagote n'ogogo dị elu n'asọmpi Serie A.

N'otu aka ahụ Lookman mere ọfụma n'asọmpi Iko mba Afrịka 2023 ebe o nyeere Naịjirịa aka ruo n'agba ikpeazụ mana Ivory Coast mechara mabute iko ahụ.

Chiamaka Nnadozie

Nwada Chiamaka Nnadozie na-echere Super Falcons nke Naịjirịa bọọlụ mabutere nturuugo dịka nwaanyị kachasị eche bọọlụ n'Afrịka nke ugboro abụọ.

Nnadozie meriri Khadija Er-Rmichi nke Moroko na Andile Dlamini nke Saụt Afrịka iji turu ugoa ahụ.

Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa tuuru ugo dịka otu egwuregwu bọọlụ kachasị mma n'Afrịka.

Ndị ọzọ na-agbara Super Falcons bọọlụ dịka Osinachi Ohale, Asisat Oshoala na Rasheedat Ajibade so n'ime mmadụ 11 nọ n'otu kachasị agba bọọlụ n'Afrịka.

Ndị so zọọ onye kachasị agba bọọlụ n'Afrịka

Foto Simon Adingra ebe o yi uwe bọọlụ mba Ivory Coast mgbe ọ na-enwe aṅụrị maka nturu ugo n'egwuregwu Afcon 2023 ebe Ademola Lookman na-enwe anụrị mgbe otu egwu bọọlụ ya bụ Atalanta buru iko Europa nke afọ 2023.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Simon Adingra nyeere mba Ivory Coast aka na goolu abụọ ha jiri merie ma buru iko asọmpị AFCON 2023, ebe Ademola Lookman nyere goolu atọ n'asọmpị ikpeazụ ha jiri merie buru iko Europa.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Taa bụ ụbọchị monde ka a ga-enye ụmụnwoke na ụmụnwanyị ihe nrite onye kachasị agba bọọlụ n'Afrịka. Mmadụ ise ka a họpụtara na-azọ onye kachasị agba bọọlụ na ngalaba abụọ bụ nke ụmụnwoke na nke ụmụnwaanyị.

Ademola Lookman bụ onye aha ya kachasị ada ụda maka na ọ na-eme nke ọma n'otu egwu bọọlụ ya bụ Atalanta kamgbe ọnwa iri na abụọ gara aga.

N'ime afọ ahụ gara aga ka Lookman dị afọ 27 nyeere otu egwu bọọlụ Atalanta aka imabute iko Europa nke mbụ kamgbe otu egwu bọọlụ ahụ malitere.

Onye a ma ama n'egwuregwu bọọlụ na mba Ghana bụ Emmanuel Agyemang-Badu kwuru na onye Naịjirịa ga-enweta nturuugo onye kachasị agba bọọlụ n'Afrịka a ga-eme taa.

Emmanuel Agyemang-Badu kwuru sị "a ga m akwado ya maka ihe ọ mere n'Atalanta, merie asọmpị Europa ma nye goolu atọ n'asọmpị ikpeazụ".

Lookman gbaara Ugo Naịjirịa bọọlụ n'asọmpị ikpeazụ ha gbara n'AFCON 2023 nke e guzobere na mba Ivory Coast mana Ivory Coast meriri mba Naịjirịa n'asọmpị ahụ ma turu ugu.

Ndị na-azọ ọkwa nke ụmụnwoke

Ebe foto si, Caf Online

Simon Adingra bụ onye nyereaka mee ka e nye goolu abụọ mba Ivory Coast jiri merie Naịjirịa n'Afcon 2023 a gbara n'ọnwa Febuwarị n'Abidjan.

Dean Furman gbaara mba Saụt Afrịka bọọlụ n'oge garaaga kwuru na "Adingra mere nke ọma na sọmpị ikpeazụ mba Ivory Coast na Naịjirịa gbara n'AFCON 2023"

"Ọ wetara ihe nrite dịka onye kachaa gbaa bọọlụ n'asọmpị ikpeazụ Naịjirịa nakwa Ivory Coast nakwa onye kacha bụrụ obere nwa bịara asọmpị AFCON nke afọ a. A ga m atụrụ ya vootu".

Oche gooolu nke mba Saụt Afrịka bụ Ronwen Williams wetere ihe nrite ọlaedo n'Afcon 2023 maka ichete asụwaagba ụgboro anọ oge Bafaba Bafana zutere Cape Verde.

E were onye ga-emeri Banda?

Ndị na-azọ ọkwa ọkachasị agba bọọlụ n'Afrịka nke ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Caf Online

Nwa amaala mba Zambia bụ Barbra Banda bụ nwaanyị pụrụiche na ndị na-azọ onye kacha agba bọọlụ n'Afrịka.

Banda bụ onye ritere ihe nrite nwaanyị kacha agba bọọlụ nke BBC mere.

Ọ nyere otu egwu bọọlụ Orlando Pride aka were turu ugo n'egwuregwu asọmpị ụmụnwaanyị ma na-enyere otu egwu bọọlụ Copper Queens goolu agharaaghara n'egwuregwu ọlịmpịk.

Mana Temwa Chawinga bụ naanị onye kacha Banda nye goolu n'egwure bọọlụ nke ụmụnaanyị. temwa nyere goolu 21 ebe banda nyere goolu 17 .

Temwa na nwanne ya nwaanyị bụ Tabitha Chawinga, so na ndị a họpụtara so azọ onye kacha agba bọọlụ. Tabitha kacha nye goolu n'asọmpị ụmụnwaanyị na mba France.

Nwa mba Morocco bụ Sanaa Mssoudy, bụ onye ọzọ aha ya banyere na ndị na-azọ onye kacha agba bọọlụ n'Afrịka dịka nwa mba Naịjirịa bụ Chiamaka Nnadozie bụ onye a họpụtara dịka onye kacha eche goolu na mba France.

Chiamaka toro Tabitha Chawinga nke ọma mgbe ọ na-agwa B|BC okwu na mbido afọ a.

Nnadozie kwuru na "Ọ bụ ezigbo ọgbaa bọọlụ ma bụrụ ezigbo mmadụ. ọ bụ onye nwere obi ụmualal".

"Ọ bụ onye nwereike iwete ihe nrite onye kacha agba bọọlụ n'ụwa niile. Mgbe na-eteghị aka ụwa ga-amara onye ọ bụ".

"Ọ yere goolu 18 n'afọ garaaga mana obi dị m ụtọ ịbụ naanị oche goolu ọ nweghịike inye goolu"

"She scored 18 goals (last season) but I am happy being the only goalkeeper she couldn't score against in the league."

Onye ka ị chọrọ ka ọ nwete ihe nrite a?