CAF Awards: Mo Salah atụrụla ugo nke ugboro abụọ

Ebe foto si, Getty Images
Onye otu egwuregwu Liverpool akpọrọ Mohamed Salah abụrụla ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nke Afịrịka n'ogo ụmụnwoke.
O meriri ọgba bọọlụ dịka Sadio Mane si Senegal ma bụrụkwa onye otu egwuregwu klọb ya ma merikwa onye otu Arsenal bụ Pierre-Emerick Aubameyang si Gabon, iji turu ugo CAF.
Ọ natara nturugo a na Senegal ebe e hibere ọgbakọ a n'abalị Jenụwarị asatọ, 2019.
N'ọnụ ya, "Arọọla m nrọ ebe m nwetere nturugo a kamgbe m dị na nwata, mana ugbua eritele m ya ugboro abụọ na-enyeghi ohere."
Thembi Kgatlana si mba South Afirika ma bụrụkwa onye otu egwuregwu akporọ Houston Dash nwetere nturuugo CAF dịka ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị.
Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa mechapụrụ obodo ha ihu site n'irite nturugo dịka mba bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị.
Mana ndị dika Asisat Oshoala enweteghị nturugo ọkaibe n'ogo ụmụnwaanyi.
Cheta na ọ tụrụ ugo ọkaibe n'ogo ụmụnwaanyị n'afọ 2014, 2016 nakwa 2017.
Fransisa Ordega so na ndị ahọpụtara, enweteghikwa ya.
Wilfred Ndidi so na ndị a họpụtara na ndị nwereike inweta nturugo "ndị kachasị dị obere bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ Afrịka", enweteghịkwa nturuugo nke agba ya.
Akụkọ ga-amasị gị:










