Madagaska: Etu e si weghara ọchịchị n'ike na mba Afrịka dị icheiche n'ime afọ isii

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Kamgbe ọchịchị onye kwuo uche ya dara mba na mba Madagaska n'Ọktoba 2025, ndekọ na-egosi na e nweela ụdịrị ọnọdụ ahụ n'ọtụtụ mba ndị nọ n'Afrịka nsonso a, .
N'ime afọ isii gara aga, ndịagha weghaara ọchịchị n'ike na mba ndị ahụ ma wepụ Onyeisiala ha nakwa ihe niile e jiri mara ọchịchị onye kwuo uche ya.
N'akụkọ a, BBC Igbo tinyere anya n'ihe mere na Madagaska nakwa mba ndị ọzọ ndịagha weghaara ọchịchị n'Afrịka na nsonso a.
Oge ndịagha Madagaska kwuru na ha ewegharaala ọchịchị
Ngalaba ndịagha a na-akpọ CAPSAT kwuru na ha weghaara ọchịchị ma wepụ Onyeisiala mba ahụ bụ Andry Rajoelina n'ọkwa n'Ọktoba 2025.
CAPSAT kwuru na ha emechiela ụlọikpe, ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka nakwa njirimara ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ.
Ha sị na onyeisi ha bụ Ọchịagha Michael Randrianirina bụzi Onyeisiala mba ahụ.
Ugboro ole ndịagha weghaara ọchịchị na mba Madagaska

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ndịagha ewegharaala ọchịchị na mba Madagaska ugboro anọ bido n'afọ 1960 ruo 2025.
Ọ bụ ọnọdụ akụnaụba butere ngagharịiwe e mere na 1972 nke mere Onyeisiala ha bụ Philibert Tsiranana ji nyefee ọchịchị n'aka ndịagha.
N'afọ 1975, e wepụtara aha Lt-Com Didier Ratsiraka dịka Onyeisi gọọmenti mba ahụ ka ndịagha kpachichara ọchịchị. E mechara hazie ntuliaka ma họpụta ya dịka Onyeisiala. Ọ chịrị afọ asaa.
N'afọ 2009 ka e mere ngagharịiwe n'isi obodo mba Madagaska bụ Antananarivo, megide Onyeisiala ha bụ Marc Ravalomanana. Ndịagha wepụrụ ya n'ọkwa ma tinye Onyeisiala Andry Rajoelina n'ọkwa.
Etu Madagaska si banye n'ọnọdụ a na nkenke

Ebe foto si, LUIS TATO/AFP via Getty Images
- Ụmụ ntoroọbịa mba Madagaska mere ngagharịiwe izuụka abụọ maka ụkọ mmiri na enweghị ọkụ latrik na mba ahụ niile.
- Ngagarịiwe ahụ banyere n'ọgbaaghara nke mere ha ji kwuo ka Onyeisiala ha bụ Andry Rajoelina rituo n'ọkwa.
- Ngalaba ndịagha na mba ahụ a na-akpọ CAPSAT gara n'ama ebe ụmụntoroọbịa na-eme ngagharịiwe gaa nọnyere ha ma kwadoo ha.
- Naanị abalị abụọ ọzọ ka akụkọ pụtara na ma kwuo na Onyeisiala ha bụ Rajoelina ejirila ụgbọelu ndịagha mba Fransị gbapụ n'isi obodo ha.
- Rajoelina mechara kwuo na ya gbagara ebe ya ga-enwe nchekwa ma kwuo na a chọrọ igbu ya.
- N'otu ụbọchị ahụ ka ndị omeiwu tụrụ vootu iwepu ya n'ọkwa maka ịhapụ ọrụ ya gbalaga mana ọ bịara kwuo na ya emechiela ọrụ ndịomeiwu.
- Ndị omeiwu egeghị ya ntị, ha gara n'ihu wepụta mpụtara ntuliaka ahụ nke wepụrụ ya n'ọkwa.
- Oge ahụ ka CAPSAT kwupụtara na ha akpachiela ọchịchị na mba ahụ.
Mba dị iche iche n'Afrịka ndịagha weghara ọchịchịn'ime afọ ise
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Madagaska:
Na Madagaska, ndịagha weghaara ọchịchị n'afọ 2025, nke mere ya mba asaa n'Afrịka n'ime afọ ise site na 2020 ruo 2025.
Burkina Faso:
Na Jenụwarị 2022 ka ndịagha mba Burkina Faso wepụrụ Onyeisiala ha bụ Roch Kaboré n'oche mana n'ime ọnwa asaa ọzọ Capt Ibrahim Traoré weghaara ọchịchị.
Sudan:
N'Ọktoba 2021, ndịagha mba Sudan wepụrụ ọchịchị nchere oge e tinyere mgbe ndịagha wepụrụ Onyeisiala mba ha bụ Omar al-Bashir n'afọ 2019.
Abdalla Hamdok bụbu Praịm Minista mba Sudan banyere n'ọchịchị n'ọnwa Ọgọst 2019, ka ndịagha chụpụchara Omar Hassan al-Bashir bụ Onyeisiala mgbe ahụ, n'ọnwa Epreelụ afọ ahụ.
Tupu a chụpụ al-Bashir, ọ chịala mba ahụ afọ 26 n'ọkwa dị iche iche, site n'afọ 1993 ruo mgbe a chụturu ya n'afọ 2019.
Ka Hamdok batara n'ọchịchị, a nọ na-atụ anya na ọ ga-eduru mba ahụ mee ntuliaka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ n'afọ 2021, mana nsogbu ya na ndịagha mba Sudan mere ka a chụpụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọst, 2021.
Nchụpụ ha chụpụrụ ya na mmachi ha machiri ya ịpụta ezi mere ka ndị mba ofesi tiwe mkpu ma kwụsịkwa nde kwuru nde dọla ha na-enyebu mba ahụ maka enyemaka.
E tinyeghachịrị Hamdok n'oche ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2021, mana o mechara jiri aka ya gbaa arụkwaghịm n'ọnwa Jenụwarị 2022, ka ọnwa abụọ a chụpụrụ ya n'oche gachara.
Gabọn:
Ọzọ mere bụ n'Ọgọst 2023, e wepụrụ Onyeisiala mba Gabọn bụ Ali Bongo Ondimba n'ọkwa ebe Ọchịagha Brice Oligui banyere n'ọchịchị.
Guinea:
Alpha Conde bụ onyeisiala mba Guinea ruo mgbe ndịagha chụpụrụ ya n'ụbọchị 5 nke ọnwa Septemba, 2021.
Ndịagha ahụ nke Kọnel Mamady Doumbouya bụ onye ndu ha, kwuru na ọ bụ nrụrụaka na mpụ juru na gọọmentị mere ha ji weghara ọchịchị n'ike.
Ndịagha ahụ gbachiri okeala ha ma machie njem ụgbọelu na mba ahụ dịka ha kposakwara iwu obodo ahụ.
Conde banyere n'ọchịchị n'ọnwa Disemba afọ 2010, dịka e mechara ntuliaka nke mmadụ niile kwenyere na aka enwe abaghị n'ofe.
Mali:
Bah Ndaw batara dịka onyeisiala mba Mali n'ụbọchị 25 nke ọnwa Septemba afọ 2020, mgbe ndịagha chụpụchara Ibrahim Boubacar Keïta n'oche onyeisiala.
Ndaw mere Assimi Goita bụ onyeagha osote ya, dịka ha nọ n'ọchịchị kwesịrị ịnọ naanị ọnwa 18 ruo mgbe a ga-eme eme ntuliaka iji họpụta onyeisiala.
Ka ọ bachara ọchịchị, onyeisi otu Economic Community of West African States (Ecowas) kwuru na ha ga-ewezuga mmachi ha machiri mba Mali ma ọ bụrụ na ha jiri onye nkịtị mee Praịm Minista.
Nke a mere ka Ndaw họpụta Moctar Ouane dịka Praịm Minista n'afọ 2020.
N'ụbọchị 24 nke ọnwa Mee, 2021, ndịagha kpatara Ndaw na Ouane aka ma nwuchie ha n'ọgbọ ndịagha ebe Ndaw nọ kwupụta na ọ gbaala arụkwaghịm n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee afọ ahụ.
E wepụrụ mmachi ịpụta ezi e tinyeburu n'ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgọst 2021.
Dịka a na-atụ anya na ndịagha ga-enyefe ndị nkịtị ọchịchị site na ntuliaka e kwesịrị ime n'ọnwa Febụwarị 2022, minista na-ahụ maka mmekọrịta mba Mali na mba ndị ọzọ kwuputara n'ọnwa Jenụwarị 2021, na ha adọtịkwuola oge ha tinyeburu iji nyefe ndị ọchịchị onye kwuo uche ya ọchịchị.
Chad:
Idriss Déby bụbu onyeisiala mba a nwụrụ n'ihu agha ebe o du ndị agha mba ya gakwuru ndịagha nnupuisi na-enye nsogbu na mba ahụ.
Ka ọ nwụchara, nwa ya nwoke bụ Mahamat Déby, bụ otu n'ime ndịagha welitere isi na mba ahụ eweghara ọchịchị dịka onyeisiala.
Ka o weghachara ọchịchị, o kwuru na a ga-enyeghachi ndị nkịtị ọchịchị mgbe ọnwa 18 gafechara.
Niger:
Na Julaị 2023, ndịagha wepụrụ Onyeisiala mba Niger bụ Mohamed Bazoum n'ọkwa.









