Mmeri a ụlọikpe mba Kenya nyere Nnamdi Kanu o nwereike imetụta ikpe ya na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe ukwu dị na Nairobi mba Kenya enyela Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) mmeri ma kwuo na njide e jidere ya na mba ahụ megidere iwu.
Nke a dị n'akwụkwọ ikpe ahụ, nke ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor zisara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Fraịde 27 Juun, 2025.
Nke a na-abịa n'akwụkwọ mkpesa Kingsley Kanu bụ nwanne Kanu gbara gọọmentị mba Kenya n'ụlọikpe n'aha Nnamdi Kanu.
Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị a kpọrọ aha n'akwụkwọ mkpesa ahụ gụnyere odeakwụkwọ ministri na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata, onyeisi ngalaba na-ahụ maka inyocha ohi na mpụ, onyeisi ndị uweojii na ngalaba ọdọụgbọelu Komo dị na Kenya na ọkaiwu ukwu gọọmentị mba Kenya.
N'akwụkwọ mkpesa ahụ, onyendu ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na Kenya bụ Ọkammụta PLO Lumumba gwara ụlọikpe na etu e si tọrọ Kanu na mba Kenya, kpọchie ya n'otu ụlọ ma buru ya lọghachị na Naịjirịa megidere iwu na-achị mba Kenya.
O kwuru na Nnamdi Kanu batara na Kenya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee, afọ 2021 dịka nwafọr mba Briten n'ụzọ iwu kwadoro.
Kama na o ruru n'ụbọchị 19 Junn, mgbe Kanu gara ozi n'ọdọugbọelu Jomo dị na mba ahụ, na ndị ọrụ nchekwa gọọmentị Naịjirịa jidere ya wụọ ya ịga n'aka ma kpọchie ya n'otu ụlọ dị na mba Kenya ruo ụbọchị asatọ na-enyeghi ya nri maọbụ mmiri.
E ruru n'ụbọchị 27 Juun, afọ 2021, na ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa tinyere Nnamdi Kanu n'ụgbọelu ma kpọlata ya na Naịjirịa na-egosi akwụkwọ ikike ọbụla ma kpọchie ya n'ụlọọrụ nchekwa ndị gọọmentị dị n'Abuja.

Ebe foto si, PLO Lumumba/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ebe ahụ ka ọ nọ ruo ụbọchị 29 Juun, ka ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa n'oge ahụ nyere mgbasaozi sị na ha anwuchiela ma kpọlata Kanu ma malite ikpe ya ikpe rute ugbua.
Ụlọikpe dị na mba Kenye malitere ileba anya n'ikpe dịka o nyere ohere ka ngalaba gọọmentị mba Kenya ndị a kpọro ha na mkpesa ahụ zara ọnụ ha.
Dịka nke a gachara Ọkaikpe E. Mwita chabiri ikpe a ma kwuo na nwuchi a nwuchiri Kanu na mba Kenya na-esoghi usoro iwu megidere iwu na-achịkwa mba Kenya.
Ọ gara n'ihu kwuo, mkpọchi a kpọchiri ya n'ụlọ taa ya ahụhụ na-enyeghi ya nri maọbụ mmiri ruo ụbọchị atọ megidekwara ikike dịịrị onye nke na-achị mba Kenya.
O kwuru na etu ahụ e si kpọpụ Nnamdi Kanu site na mba Kenya n'ike megidere iwu na-achị mba Kenya.
Na nchịkọta ụlọikpe a kwuru na gọọmentị mba Kenya dara iwu niile ahụ maka na ha echekwaghi ikike ruuru Kanu bụ onye si ụzọ iwu kwadoro bata na mba ahụ. O kwuru na ha nyere ohere ka ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa bata Kenya kpaa arụ ndị a na-egbochughi ha.
N'ihi nke a, Ọkaikpe a nyere iwu ka gọọmentị mba Kenya kwụọ Nnamdi Kanu ego dị nde shịlịn iri (kshs10m) pụtara otu narị nde naịra na nde iri abụọ (N120m) maka iji tie ya aka n'obi.
Ikpe a o nwereike imetụta ikpe Kanu na Naịjirịa?

Dịka ụlọikpe ukwu dị na Kenya kwuru na agwa gọọmentị Kenya na nke Naịjirịa kpasịrị Kanu site n'inwuchi ya n'ike ma kpọlata ya na Naịjirịa megidere iwu na-achị obodo ha, ajụjụ dị ọtụtụ mmadụ n'ọnụ bụ ma ikpe a o nwereike imetụta ikpe ya na gọọmentị Naịjirịa na-aga n'ihu ugbua.
Otu onye ọkaiwu bụ Chibuzor Aguocha gwara BBC Igbo na ikpe ahụ nwereike ọ gaghị emetụtacha ikpe Kanu na Naịjirịa kpọmkwem maka na Kenya na Naịjirịa bụ mba abụọ kwụụrụ onwe ha, nke iwu na-achị ha dịkwa iche.
Ọ gara n'ihu kwuo na "ọ bụru na Naịjirịa bụ mba na-erubeisi n'iwu na-achị obodo nakwa nke na-achị mbaụwa, na ikpe ahụ ụlọikpe Kenya kpere sị na gọọmentị Kenya na Naịjirịa mejọrọ site n'inwuchi nakwa ikpọlata Kanu, na ọ ga-eme ka ha gụrụ isi ma sị ka e mezie okwu a na-abụghị ikpe Kanu ikpe."
"Ọ bụrụ na ntọala ụlọ adịghị mma, ụlọ ahụ agaghị eguzosi ike, ya mere na usoro e jirila kpọlata ma malite ikpe ya ikpe adịghị mma, nke a pụtara na ikpe a na-ekpe ya ekwesighi inwe isi, dịka iwu na-achị mbaụwa si kwuo.
"Ụlọikpe Naịjirịa dị iche na nke Kenya, o nweghi nke dị n'okpuru ibe ya ukwo, mana ikpe ahụ nwere ntọala gbapụtara ihe a kpọrọ 'persuasive authority' nke ụlọikpe Naịjirịa nwereike iṅomi"
Ọkaiwu Aguocha kwuru na ikpe ahụ nke ọkammụta Lumumba, onye a ma ama n'Afrịka nakwa ụwa nille bụ ọkaiwu Kanu, na o gosiri na ọ gbapụtara ihe kama na o dị ụlọikpe Naịjirịa n'aka ịma nke ha ga-eso.
Ọ gara n'ihu kwuo na mkpebi a ụlọikpe mba Kenya nyere banyere ikpe ahụ bụ ihe ụlọikpe ukwu dị na Naịjirịa kpebikwara ma kachapụ ebubo e boro Kanu n'ọnwa Ọktoba afọ 2022.
Ọkaiwu Nnamdi Kanu na Naịjirịa bụ Aloy Ejimakor kwuru na ha nabatara ikpe ahụ ọfụma ma kelee ọkaiwu Kanu na mba Kenya nakwa ụmụnne Kanu bụ ndị nyere aka hụụ na ikpe a gara ọfụma.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ikpe e kpere na Kenya ga-emetụta ikpe ya na gọọmentị Naịjirịa na-aga n'ihu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ugbua n'ụzọ dị mma.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa apachiela ikpe ha n'ebubo iyi ndụ egwu ha boro Kanu ma na-echezi ka ndị ọkaiwu ya zaghachị site n'idegara ụlọikpe akwụkwọ.
Mgbe ọzọ ụlọikpe nyere Kanu mmeri
Nke a abụghị mbụ ikpe na-alara Nnamdi Kanu kamgbe ọ malitere ịzara ọnụ ya n'ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa nke malitere n'afọ 2015.
Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja nọọrọ n'ụbọchị Tọzde 13 Ọktoba 2022 nye iwu sị ka a tọhapụ Nnamdi Kanu dịka ọkachapụrụ ebubo iri na ise niile nke gọọmentị Naịjirịa boro ya.
Ọkaikpe Jummia Hannatu Sankeey na ndị ọkaikpe abụọ ọzọ kwuru na nwụchị Nnamdi Kanu na mba Kenya na mkpọghachịte ya na Naịjirịa megidere iwu.
N'otu aka ahụ, n'ụbọchị 26 Ọktoba afọ 2022, Ọkaikpe Evelyn Anyadike nke ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia Steeti kpere ikpe sị na gọọmenti Naịjirịa dara iwu maka ijide ma kpọlata Kanu site na mba Kenya.
Ọ gara n'ihu gwaa gọọmentị Naịjirịa ka ha kpọghachị Kanu na mba Kenya ebe ha si kpọlata ya ma kwụọ ya ego dị nde narị naịra ise (N500M) dịka ego iti aka n'obi.









