Ụlọomeiwu Ebonyi enweghị ikikere ịmachi ọgbakọ ‘crusade’ - Ụkọchukwu

Ebe foto si, @FrancisNwifuru/X
Otu onye Ụkọchukwu ọkwa ya gbagotere n’ụlọụka Katolik ekwuola na ụlọomeiwu Ebonyi steeti enweghị ikikere ịmachị ọgbakọ ‘crusade’.
Onye Ụkọchukwu ahụ kpuhere nke a oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ya ajụjụ n’ekwentị.
Ọ sịrị na “e nweghị ụlọomeiwu nwere ikikere ikpebiri ndị mmadụ etu ha ga-esi fee chi ha ewezuga ma ọ na-ebute ọgbaaghara maọbụ tigbuo zọgbuo n’obodo”.
“Kama ụlọomeiwu Ebonyi ga-ekpebiri ndị mmadụ etu ha ga-esi fee chi ha, gịnị mere na ha agaghị emebe iwu ga-eme ka anya mepee ndị ha na-achị? Ọ bụrụ ma amachie ọgbakọ crusade, ọ ga-eme ka ụdị omume ọjọọ ahụ kwụsị?,” ka onye Ụkọchukwu ahụ jụrụ.
Ụlọoemiwu Ebonyi amachiela 'crusade' maka ichụ ajọ mmụọ, amoosu

Ebe foto si, Ebonyi State House of Assembly
Ụlọọmeiwu Ebonyi steeti amachiela ọgbakọ ekpere a na-eme n'iro (crusade) ebe e ji amụma achụ ajọ mmụọ maọbụ amoosu na mpaghara Izzi n'Ebonyi steeti.
Ndị omeiwu steeti nyere mkpebie ahụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụlọomeiu steeti ahụ n'Abakaliki ụbọchị Wenezde nke Onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Moses Ije Odunwa.
Nke a na-abịa dịka omeiwu na-anọchiteanya Izzi bụ Godwin Abiri, kpalitere okwu ahụ n'ụlọomeiwu steeti ahụ n'ụbọchị Wenezde 10 Julaị, 2024.
Abiri, kwuru na ya bụ ihe etinyela ndụ ọtụtụ mmadụ n'ihe egwu ma bute mbibi ọtụtụ ihe akụakụ na ihe enweenwe.
Abiri boro ebubo na "ndị amụma ụgha ji aghụghọ na-edunye ọha ndị mmadụ n'imerụ ala nakwa ikponye aja na garị n'ọrụ nwulite obodo gọọmentị na-arụ."
Abiri bulitere okwu ahụ dịka ọgbaghara dachara n'Agharaoza dị n'obodo Ndi-Ebo Ezzainyimagu dị n'okpuru Ọchịchị Izzi, Ebonyi Steeti dịka ndị ntoroọbia wakporo otu nwoke a kpọrọ John Ekpono na ezinaụlọ ya suo ụlọ ha ọkụ, bibie ọtụtụ ihe n'iwe n'ihi amụma otu ụkọchukwu buru na Ekpona kechiri akaraka ọtụtụ ndị ntoroọbịa n'ogbe ha.













