Websait ọhụrụ ndị na-agbasa akụkọ ụgha maka ntuliaka na Naịjirịa

Ọtụtụ websaịt e mepere n'oge ntuliaka Naịjirịa n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 na-agbasa ozi nye puku kwuru puku ndị mmadụ na-agbasa akụkọ ụgha dịka nchọpụta BBC mere si gosi.
Nnukwu ọnụọgụgụ ozi ahịa dị na websait ndị a gosiri na ha na-erite nnukwu uru na ịgbasa akụkọ ụgha.
Ha ha eji akụkọ ụgha akọkwa akụkọ ihe mere eme n'ezi na egwuregwu, ime obi ụtọ nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị -ụfọdụ n'ime ha na-ede akụkọ ruru 700 kwa ọnwa. Akụkọ ndị a na-eto maọbụ akatọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria.
Ka ọ gachara ihe ruru ọnwa asaa azọchara ntuliaka, nkewa ka gbara mgbọrọgwụ, dịka ihe mere dịka ụlọikpe nyechara mkpebi banyere dị anọghị n'ọchịchị na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ.
Akụkọ ụgha si na websait ndị a nwere ike ị na-enye aka ịbawanye ọnya nke nkewa dịbu adị.
Ọkaiwu Mojirayo Ogunlana chetara na dịka ntuliaka na-eru nso, ọ hụụ akụkọ e kere na Twitter a mazi ugbua dịka X, nke sitere na ọbaozi websait ọ nụbeghị maka ya mbụ.
Ọ sịrị na akụkọ ụgha karịrị.
Nwada Ogunlana sịrị," O nweghị ụbọchị akụkọ ụgha anaghị efegharị na soshal midia. Ọ na-eme ka ntụkwasa obi m nwere na-akụda."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye na-eme nchọpụta gbasara akụkọ ụgha bụ Mayowa Tijani ghọtara etu websait ndị a si eto.
O kwuru na ha metụtara n'ụzọ were anya ntuliaka e mere n'ihi na ihe ha na-ede ghọrọ isi ụka a na-akpa na Naijiria. O kwuru na ha gakwara n'ihu ịgbasa akụkọ ụgha.
"Ugbua, o nwe otu n'ime ha bipụtara akụkọ ụgha, websait ndị ọzọ ga-ewere ak ukọ ahụ bipụtakwa ya nke mere ka akụkọ ahụ wube na sosha,l midia.
"Ha ga-esi etu a na-ebupụta akụkọ ga-esi na ịntanet pụta ife ndị mmadụ eburu ya na-agbasa ebe nile ọ bụrụ zia isi okwu a na-akọ maka ya.
Ngalba nnyocha akọ ụgha na BBC bụ 'BBC Global Disinformation Team" nyochara atọ n'ime wepụsait akụkọ ụgha ọhụrụ dị a: Podium Reporters, nke e mepere n'afọ 2021, Reportera, nke e mepere n'ọnwa Julai afọ 2021; na Parallel Facts, nke e mepere n'ọnwa Mee, afọ 2023.
Dịka Tijani si kwuo, oge ha ji pụta nwere ihe kpatara ya.
Mbụ, websait ndị a nwere ndị ha chọrọ inyere aka ka a họpụta ha na ntuliaka.
Mana o kwenyere na ndị na-ebipụta akụkọ ndị a chọrọ 'irite ezigbo ego site n'ozi azụmahịa n''ọba ozi ha."
Anyị na ndị ọrụ ụlọntakụkọ were anya kpara iji mata ego ole websait ndị a na-enweta.
Otu onye azụmahịa na mgbere intanet (Digital Marketing consultant) bụ Yusufuddeen A Yusuf kwuru na ha na-erite agbata otu nari dọla na dọla puku iri ( $100-$10,000) kwa ọnwa.
"Akụkọ ndị akachasị tinye ọnụ na-akpọta ọtụtụ ndị mmadụ, nke a pụtara nego ga-ezi n'ozi azụmahịa gagbalite elu."
Mana Adebayo Ilupeju, onye ọkachamara na mgbasaozi na intanet na nhazi etu ọha si ahụta onye( digital media&PR Consultant) n'ụlọọrụ 'Africa Media Works', sịrị na dịka websait ndịa malitere ọhụrụ, o nwere ike ha eritewebeghị iru."
Anyị zigara Podium Reporters, Reportera, na Parallel Facts ozi jụọ ha maka akụkọ ụgha dị na websait ha nakwa ego ha na-erite n'ozi azụmahịa mana ha asaghị anyị.
Oge achụmtavootu nakwa ka ọ gachara, websait ndị a anyị nyochara bipụtara akụkọ ụgha banyere mmadụ atọ kachasị pụta ihe ndị zọrọ ọkwwa onyeisiala na ntuliaka.
A họpụtara Bola Tinubu nke APC na ntuliaka ahụ o ji pasent 37 were merie. Onye gbara onye nke abụọ bụ Atiku Abubakar nke PDp na onye nke atọ bụ Peter Obi nke Labour Party na-agbagha mmeri ya.
N'izuụka gara aga, ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka kụpụrụ mgbagha ha mana ha kwuru na ha ji ikpe ahụ aga Ụlọikpe Kachasị.
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kesara akụkọ ndị si websait ndị a, nke nyere ha aka n'iwu ewu.
Festus Keyamo bụ Minista na-ahụ maka Njm Ugbọelu ugbuakesara akụkọ si'Podium Reporters' ọtụtụ ugboro n'oge ntuliaka.
Obi sonyere na mkparịtaụka Twitter abụọ nke Parallel Facts hiwere, otu n'ime ha mere ka ugboro ole a kpụ websait ahụ n'ọnụ(mention rịa site na 10,000 rue 40,000 n'agbata ọnwa Mee na Ọnwa Julai afọ 2023.
Websaitị ahụ nke onye nwe ya bụ Kingsley Izuchukwu Okafor, bụ onye kọwara onwe ya dịka onye nwere mmasị na Teknuzu, nhazi etu ọha si ahụ onye nakwa onye kpọrọ ọchịchị ọjọọ asị, dịka o siri kọwaa onwe ya n'alkara soshal midia ya. O wepụbuola photo Peter Obi ebe o kwuru sị, "Obi bụ nwoke."
Ozi websait ha kwuru sị, "ọnya nlabata(clickbait)' adịghị ya, "'propaganda' adịghị ya", "akụkọ ụgha adịghị ya".
Mana nchọpụta anyị gosiri na ọ bụghị he ha kwuru ka ha na-eme.
N'ime otu ọnwa , n'agbata Juun 19 na Jullai 15, BBC gụtara ọtụtụ akụkọ e dere ụgha n'ime ya na websait ụlọọrụ Parallel Facts.
Otu akụkọ nke ha bipụtara n'abalị 27 nke ọnwa Juun sịrị na onyeisioche Independent National Electoral Commission (Inec) bụ Yakubu Mahmood, na-achọ inye APC pasent 25 vootu a tụrụ n'Abuja.
Mana o nweghị ihe akaebe gosiri na Inec maọbụ Mahmood rụgharịrị mpụtara ntuliaka e mere n'Abuja dịka ha siri boo n'ebubo.
N'agbanyeghị na o nwela ụlọọrụ nnyocha akụkọ ụgha ndị gosipụtara na akụkọ ndị a bụ ụgha, akụkọ ndị a ka dị ka ọ dị na-enweghị mgbanwe ọbụla.

Ebe foto si, Getty Images
Reportera bụ websait ọzọ na-akwado Labour Party.
N'ozi ha tụpenyere n'ihu akara ọbaozi ha na X(Twitter), ha kwụpụtara na ha anabataghị gọọmentị Tinubu.
N'ime otu ọnwa, websait a ebipụtala akụkọ anọ enyochara ma chọpụta na ha bụ akụkọ ụgha nke gụnyere akụkọ kwuru na Onyeisiala Biola Tinubu gbara onye nke atọ na ntuliaka.
Ha tụgharịkwara nchọpụta BBC mere banyere vootu.
N'akụkọ ha bipụtara n'abalị 28 nke ọnwa Juun, Reportera sịrị na BBC kwubiri na e nwere mgbagbu ndị na-atụ vootu n'ụzọ were anya, na Tinubu ekwesịghị ibu onye a kpọpụtara dịka onye meriri na ntuliaka.
Mana o nweghị ka BBC si nye ụdị mkpebi ahụ n'akụkọ nchọpụta anyị mere. Nke a gosiri na e nwere ebe e we pụrụ ihe na vootu a tụrụ ndị labour Party, welie nke a tụrụ otu APC.
BBC ji mpụtara vootu si na ọbaozi Inec were gosi na labour Party kachasị nweta vootu na steeti ahụ, na ọ bụghị Tinubu.
Mana anyị enweghị ihe akaebe gosiri ebe ọzọ o mere na Naijiria, ya bụ, anyị enwelighị ike ikwu na o kwesịrị ịbụ onye meriri na ntuliaka ahụ.
Akụkọ ahụ kwuru na Reportera mere "nnyochagharịrị", mana ha egosịghị etu ha si nweta mkpebi na ọ bụ Obi meriri.
Kama ha rụtụrụ aka na atụmvootu Twitter ha haziri nke ha kwuru na pasent 93 mmadụ 31,000 tụrụ na akara ha gosiri na Obi meriri na ntuliaka.
Na nsonso a, onye nwe websait ahụ bụ Nnamdi Ibezim, kwetara n'ozi o wepụtara na akụkọ ahụ "gbadoro ụkwụ na kepukepu".
Nasọshal midia, Ibezim kọwara onwe ya dịka onye hiwere ụlọọrụ maka ịchụta ego ( entrepreneur) na onye ma ọtụtụ ihe(polymath.)
Akụkọ nke websait ya bipụtara n'abalị isi nke ọnwa Ọgụstụ kwuru na onye bụbu Minista na-ahụ maka ọrụ na ụlọbibi nke Naijiria bụ Babatunde Fashola nyeere ndị ọkaikpe Ụlọikpe Pụrụ Iche maka Ntuliaka Onyeisiala aka ide mkpebi ha nyere otu APC.
Fashola mechara kwupụta na ya edegarala onyeisi uweojii Naijiria mkpesa na ụlọọrụ Reportera na -ebo ya "ebubo ụgha" ma na-esogharị ya nna sosshal midia(cyberstalking.
Ibezim kwuru na ndị uweojii nzuzo bụ 'Department of State Services' (DSS) nwụchiri nwanne ya nwoke bụ Chike Ibezim maka akụkọ ahụ ma kwuo na nnwuchi ahụ megidere iwu.
Ndị uweojii Naijiria kwukwara na ha nwuchiri Chike Ibezim.

Ebe foto si, Getty images
N'aka nke ọzọ, websait 'Podium Reporters' na-ebipụta akụkọ nakwado pati nọ n'ọchịchị bụ APC.
N'abalị anọ nke ọnwa Julai, afọ 2023, ha wepụtara akụkọ uche nke onye(opinion) banyere otu Indigenous People of Biafra (Ipob), bụ otu gọọmentị Naijiria gụnyere n'otu na-eyi ndụ egwu.
Akụkọ ahụ nwere ebubo ụgha. iji maa atụ, ha kwuru na ndị Ipob họrọ Obi dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala ha na-akwado.
Ikpokọta aha Obi na otu Ipob bụ ihe akụkọ ndị Podium Reports' na-emekarị.- Anyị gụtara akụkọ asaa n'ime otu ọnwa.
Mana Obi na pati ya agọọla na o nweghị ihe jịkọrọ ha na Ipob. Otu ahụ enweghịkwanụ mgbe ọbụla ha kwupụtara gbowam na ha na-akwado Obi.
Mana anyị enweghị ike ịchọpụta ndị nwe Podium Reporters.












