Etu e si duo Olukayode Ariwoola iyi ọrụ dịka Jọstịs ukwu nke Naịjirịa ọhụrụ

Ebe foto si, NGRPresident/twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola Jọstịs Ariwoola Olukayode iyi ọrụ ka ọ malite ọrụ dịka Jọstịs ukwu nke Naịjirịa taa bụ Wenezde, ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba, 2022.
E duru ya iyi ọrụ ka ọ malite ọrụ a n'uju n’emume e mere n’ime akụkụ obi gọọmentị Abuja bụ akụkụ ‘Council Chambers’.
Ya bụ emume bụ ihe e jiri malite ọgbakọ ime ụlọ gọọmentị etiti a na-eme kwa izu bụ nke a na-akpọ ọgbakọ ‘Federal Executive Council meeting’ nke onyeisiala na-anọkarị n’isi ya.
Ụfọdụ ndị sonyere n’emume idu iyi ọrụ a bụ Osote onyeisiala Yemi Osinbajo, Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo steeti, Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti na ndị jọsịtịs nke ụlọikpe kachasị ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na ulọomeiwu Naịjirịa nabatara ma binyeaka na nkpọpụta aha Olukayode Ariwoola dịka ọkaikoe ukwu Naịjirịa nke bụ ọkwa Bekee na-akpọ ‘Chief Justice of Nigeria’ n’ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba, 2022 dịka nnyocha ya n’aka ndị ụlọomeiwu ruru otu awa.
Sịnetọ Ibrahim Gobir bụ onyeisi otu ndị ụlọomeiwu na-anọghị n'ọchịchị bụ onye kwupụtara atụmatụ ime nnyocha na nwalee ọkwa ya n’ụtụtụ Wenezde ahụ.
Onyeisi ụlọomeiwu bụ Ahmad Lawan nabatara atụmatụ ahụ dịka e debanyere ya n’akwụkwọ.

Ebe foto si, NGRPresident/Twitter
E duru ọkaikpe Olukayode Ariwoola nke ụlọịkpe kachasị iyi ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa nke chereoge n’ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Juun, 2022.
Ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye duru ya iyir ọrụ n’ime obi gọọmentị nke Abuja.
Nke a bụ dịka onye nọbụ n’ọkwa oche ahụ bụ ọkaikpe Ibrahim Tanko Muhammad gbara arụkwaghim n’ọkwa oche ahụ.
Cheta na eboro ebo na aka ọkaikpe Ibrahim Tanko Muhammad nọ n’okwu nrụrụaka ụfọdụ mana ụlọikpe kachasị mechara wụsa okwu ebubo ndị ahụ.
Nke a dapụtara dịka ndị ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị mmadụ 14 n’oge ahụ zipụtara akwụkwọ mkpesa na-ebo ebubo na ọkaikpe Muhammad aneghị enye ndị ọkaikpe ihe ruru ha dịka ndị ọkaikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onye ka Ọkaikpe Olukayode Ariwoola bụ?
- Ọkaikpe Olukayode Ariwoola bụ otu n’ime ndị ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị na Naịjirịa
- Ọ bụ ya so onye kachasị n’okwa ndị ọkaikpe ndị nke ụlọikpe kachasị
- A mụrụ ya n’ụbọchị 22 nke ọnwa Ọgọọst, 1954
- A họpụtara ya dịka ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị n’afọ 2011
- Site n’afọ 2005 ruo afọ 2011 ọ rụrụ ọrụ dịka ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị dịka e mechara gbanwee ọkwa ya dịka ọkaikpe nọ n’ụlọikpe ukwu n’Oyo steeti
- Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu nke mahadum Ife nke a ana-akpọzị ‘Obafemi Awolowo University’ ma gụchaa akwụkwọ ebe ahụ n’ọnwa Julaị nke afọ 1980
- A nabara ya n’otu ndị ọkaiwu nke ‘Bar’ Naịjirịa n’afọ 1981 bụ mgbe o tinyere akwụkwọ ibanye ụlọikpe kachasị









